Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Julaị 8
IZU NA-AMALITE NA JULAỊ 8
Abụ nke 43 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 11 ¶15-21 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ Ndịozi 15-17 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọrụ Ndịozi 16:16-34 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Gịnị Mere Onye Kraịst Kwesịrị Iji Na-enwe Obi Ụtọ Mgbe A Na-akpagbu Ya?—Mat. 5:11, 12 (Nkeji 5)
Nke 3: Chineke Achọghị Ka Anyị Na-efe Ndị Nna Ochie Ofufe—td 15A (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ụzọ Ndị E Si Ekwusa Ozi Ọma Ahụ—Iche Ndị Nwere Mmasị Ihu ná Nzukọ Jehova. Okwu. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 99, paragraf nke 2 ruo na paragraf nke 4. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha na-esi eji broshọ bụ́ Ole Ndị Na-eme Uche Jehova Taa? eme ka ndị ha na-amụrụ ihe mata nzukọ Jehova.
Nkeji 10: Nwalee Jehova, Ọ Ga-agọzi Gị Ruo Mgbe Ọ Na-adịghị Ihe Ga-akọ Gị (Mal. 3:10) Gbaa ụmụnna abụọ ma ọ bụ ụmụnna atọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Olee ihe kacha eme ha obi ụtọ n’ozi ha? Olee otú ịsụ ụzọ oge niile si eme ka ha bịarukwuo Jehova nso? Gwa ha ka ha kọọ ihe mere n’ozi ọma nke na-eme ha obi ụtọ. Ná mmechi okwu gị, gwaa ụmụnna ka ha gaa tụlee otú ihe si dịrị ha ka ha mara ma hà ga-amalite ịsụ ụzọ oge niile n’ọnwa Septemba.
Nkeji 10: “Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Joel Onye Amụma.” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 54 na Ekpere