Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 10
IZU NA-AMALITE NA JUN 10
Abụ nke 114 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 10 ¶14-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọrụ Ndịozi 1-4 (Nkeji 10)
Nke 1: Ọrụ Ndịozi 1:15–2:4 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Ezigbo Ndị Kraịst Aghaghị Ịgbara Eziokwu Àmà—td 18A (Nkeji 5)
Nke 3: Gịnị Mere E Nwere Ike Iji Kwuo na Otú Ọtụtụ Ndị Si Eche Echiche Yiri Ikuku Ọjọọ?—Efe. 2:1, 2 (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Gịnị Mere I Kwesịrị Iji Na-ele Ndị Ị Na-agwa Okwu Anya. Okwu. O si n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi, peeji nke 124, paragraf nke 1, ruo na peeji nke 125, paragraf nke 4. Mee ihe ngosi abụọ. Ọ bụ otu onye ga-eme ha. N’ihe ngosi nke mbụ, ọ ga na-agwa onye ọ gara na nke ya okwu ma ọ naghị ele ya anya. N’ihe ngosi nke abụọ, ọ ga na-ele onye ọ gara na nke ya anya mgbe ọ na-ezi ya ozi ọma.
Nkeji 10: Olee Otú Anyị Si Mee? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-ekwu ya. Kwuo ihe ọgbakọ unu rụpụtara n’oge Ncheta Ọnwụ Jizọs. Jaakwa ụmụnna mma maka otú ha si gaa ozi ọma n’oge ahụ. I mechaa, gị agwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ndị mere ha obi ụtọ oge a na-enye ndị mmadụ akwụkwọ e ji gwa ha ka ha bịa soro anyị cheta ọnwụ Jizọs. Ma ọ bụkwanụ gị ajụọ ndị sụrụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach ihe ndị mere ha obi ụtọ n’ozi ọma.
Nkeji 10: “Ị̀ Na-eji Ihe Ndị Mmadụ Na-ekwu Gbasara Ya Ezi Ha Ozi Ọma?” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 74 na Ekpere