Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Mee 20
IZU NA-AMALITE NA MEE 20
Abụ nke 70 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 9 ¶14-19 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọn 8-11 (Nkeji 10)
Nke 1: Jọn 8:12-30 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Anyị Ga-eme Ka Ndị Ozizi Ụgha Ghara Iduhie Anyị?—Rom 16:17; 2 Jọn 9-11 (Nkeji 5)
Nke 3: Ihe Mere Chineke Ji Kwe Ka Ajọ Omume Dịrị—td 1B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị—Nkebi nke Atọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 116, paragraf nke 1 ruo 4. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị sorola rụọ Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ Ụlọ Mgbakọ. Jụọ ha otú obi dị ha maka iso rụọ ụdị ọrụ a?
Nkeji 10: Jehova Na-enyere Anyị Aka Ikwusa Ozi Ọma. (Ọpụ. 4:10-12; Fil. 4:13) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. O si n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, peeji nke 101, paragraf nke 1; na peeji nke 111, paragraf nke 2, ruo peeji nke 112, paragraf nke 2. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Olee Onye Magazin A Ga-akacha Abara Uru?” Ajụjụ na azịza. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ụlọ ọrụ na ndị ọrụ gọọmenti e nwere n’ókèala unu, ndị ga-achọ ịgụ otu isiokwu gbara n’Ụlọ Nche ma ọ bụ na Teta!
Abụ nke 92 na Ekpere