Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 15
IZU NA-AMALITE N’EPREL 15
Abụ nke 6 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 8 ¶1-7 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Luk 13-17 (Nkeji 10)
Nke 1: Luk 16:16-31 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Na Anyị Ezughị Okè Ọ̀ Pụtara na Anyị Abaghị Uru n’Anya Chineke?—Ọma 103:8, 9, 14; Gal. 6:9 (Nkeji 5)
Nke 3: Ọkpara Ahaghị Ka Nna Ya—td 5B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ.
Nkeji 10: Ụzọ Ndị Ị Pụrụ Isi Mụbaa Ozi Gị—Nkebi nke Abụọ. Okwu. O si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 112, paragraf nke 3, ruo peeji nke 114, paragraf nke 1. Gbaa otu ọsụ ụzọ ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ abụọ ajụjụ ọnụ. Jụọ ha otú ha si hazie ihe ndị ha na-eme, nke nyeere ha aka ịghọ ndị ọsụ ụzọ.
Nkeji 10: Ị̀ Na-ezi Ozi Ọma n’Ebe Ị Na-arụ Ọrụ? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ ndị a: (1) Gịnị mere o ji dị mma ka i mee ka ndị gị na ha na-arụ ọrụ mata na ị bụ Onyeàmà Jehova? (2) Olee otú i nwere ike isi mee ka ha mata na ị bụ Onyeàmà Jehova? (3) Olee ihe ndị nwere ike ime n’ebe ị na-arụ ọrụ gị ejiri ohere ahụ zie ozi ọma? (4) Gịnị mere o ji dị mma ka i dowe Baịbụl na ụfọdụ akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl n’ebe ị na-arụ ọrụ? (5) Gịnị mere i kwesịrị iji gbuo okwu gị nkenke ma ị na-ezi ndị ọrụ ibe gị ozi ọma oge unu na-arụ ọrụ? (6) Kọọ otú i si zie ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ị na-arụ ọrụ?
Abụ nke 45 na Ekpere