Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jun 28
IZU NA-AMALITE NA JUN 28
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 6 ¶19-25, igbe dị na peeji nke 65
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:1 Ndị Eze 3-6
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche na Teta! n’Ọnwa Julaị. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jiri otu nkeji ma ọ bụ nkeji abụọ kwuo isiokwu ndị dị na magazin ndị ahụ. Họrọzie isiokwu abụọ ma ọ bụ atọ ma gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ndị e nwere ike ịjụ onye nwe ụlọ mgbe a na-enyefe ya magazin ahụ. Gwakwa ha ka ha kwuo amaokwu Baịbụl ha ga-agụrụ onye ahụ. Gwa ndị nkwusa abụọ ka onye nke ọ bụla mee ihe ngosi otú a ga-esi enyefe magazin nke ọ bụla. Gwakwa onye nkwusa ọzọ ka o mee ihe ngosi otú a ga-esi amalitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ma a gaa nletaghachi.—Lee ihe e dere na km 8/07 p. 3.
Nkeji 15: Onye E Si na Nwata Kụzieere Ihe. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. A ma Timoti ama na o ji ịnụ ọkụ n’obi na nkà kwusaa ozi ọma. (Fil. 2:20-22) Ihe so nyere Timoti aka bụ na nne ya na nne ya ochie malitere n’oge ọ dị obere kụziwere ya Baịbụl. (2 Tim. 1:5; 3:15) Aro ndị na-esonụ, bụ́ ndị e si n’Akwụkwọ Nsọ nweta, ga-enyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha ka ha mụta izi ozi ọma nke ọma. (1) Bido mgbe nwa gị ka dị obere kpọrọ ya na-aga ozi ọma; kụziere ya ụzọ ga-adịrị ya mfe isi zie mmadụ ozi ọma. (Ilu 22:6) (2) Na-agachi ozi ọma anya, ka o si n’aka gị mụta ịgachi ozi ọma anya. (Fil. 1:9, 10) (3) Jiri oge Ofufe Ezinụlọ unu na oge ndị ọzọ gị na ụmụ gị nọ mee ka ha ghọta mkpa ịga ozi ọma dị. (Diut. 6:6, 7) (4) Ka okwu ọnụ gị na omume gị gosi na i ji ozi ọma kpọrọ ihe. (Fil. 3:8; 4:8; 1 Tim. 1:12) (5) Gị na ndị ezinụlọ gị nwee ụbọchị unu niile ga na-apụta ozi ọma. (Ọrụ 5:41, 42) (6) Unu na ndị na-anụ ọkụ n’obi n’ozi ọma na-akpa. (Ilu 13:20) Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ndị mụrụ ha mere iji nyere ha aka inwe mmasị n’ozi ọma ma na-eme nke ọma na ya.