Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’Eprel 26
IZU NA-AMALITE N’EPREL 26
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cf isi nke 3 ¶20-24, igbe dị na peeji nke 34
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl:1 Samuel 26-31
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Ụlọ Nche na Teta! Buru ụzọ gwa onye ọsụ ụzọ oge niile ka o mee ihe ngosi otú yanwa ga-esi enyefe Ụlọ Nche na Teta! e ji na-aga ozi n’ọnwa a. Jụzie ndị na-ege ntị isiokwu ha ga-achọ igosi onye ha ga-enyefe magazin ndị ahụ. Jụọkwa ha ajụjụ ha ga-achọ ịjụ onye ahụ na amaokwu Baịbụl ha ga-achọ ịgụrụ ya.
Nkeji 20: “Mgbakọ Distrikti nke Ndịàmà Jehova nke Afọ 2010.” Ajụjụ na azịza. Ọ bụ odeakwụkwọ ọgbakọ ga-eme ya. Tupu a tụlewe isiokwu a, gụọrọ ọgbakọ akwụkwọ ozi Mach 1, 2010, bụ́ nke e ji gwa ọgbakọ unu mgbakọ distrikti ha ga-aga.