Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na December 28
IZU NA-AMALITE NA DECEMBER 28
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 14 ¶15-19, igbe dị na peeji nke 167
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 12-15
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Otú Ị Ga-esi Azaghachi. Ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle ihe ndị nọ n’ókèala ha na-ekwukarị mgbe ha na-achọghị ige ozi ọma. Gwa otu onye nkwusa ka o jiri otu n’ime ihe ahụ ha na-ekwu mee ihe ngosi.—Ebe a ga-esi enweta ya bụ n’akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 8-12.
Nkeji 10: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl. Kwuo ụbọchị pụrụ iche ọgbakọ unu wepụtara maka ịmalite ọmụmụ Baịbụl n’ọnwa January. Olee ihe a rụpụtarala kemgbe unu bidoro nwewe ụbọchị e ji amalitere ndị bi n’ókèala unu ọmụmụ Baịbụl? Gwa onye ọsụ ụzọ ma ọ bụ onye nkwusa ka ọ kọọ ahụmahụ ma ọ bụ mee ihe ngosi nke ụzọ dị mma e si malitere ndị nọ n’ókèala unu ọmụmụ Baịbụl.
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enyefe na January. Jiri nkeji ole na ole kwuo ihe ụfọdụ dị n’akwụkwọ ahụ. Gị na onye nkwusa kwurịta ụzọ dị iche iche e nwere ike isi jiri akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa ahụ malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’oge a na-anọghị n’ozi. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbalịa malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl n’ọnwa January.
Abụ nke 193