Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na December 21
IZU NA-AMALITE NA DECEMBER 21
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isi nke 14 ¶10-14, igbe dị na peeji nke 164-165, isiokwu dị na peeji nke 222-223
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 9-11
Nke 1: Jọshụa 9:1-15
Nke 2: Ụzọ Anyị Pụrụ Isi Mata na Amagedọn Dị Nso (lr isi nke 47)
Nke 3: Ụwa Ọhụrụ Chineke nke Udo Ga-adị na Ya—Ị Pụrụ Ibi na Ya (lr isi nke 48)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Jikere Inyefe Ụlọ Nche na Teta! Gwa otu onye nlekọta ìgwè ka o mee ihe ngosi ebe ọ na-egosi onye nkwusa na-eto eto isiokwu ọ chọrọ iji nyefee magazin. Ọ ga-agwa onye nkwusa ahụ ihe mere o ji họrọ isiokwu ahụ, gwakwa ya ajụjụ ọ ga-ajụ onye nwe ụlọ na amaokwu Baịbụl ọ ga-agụrụ ya. Onye nkwusa ahụ ga-agwa ya na o nwekwara otú yanwa bu n’obi isi nyefee magazin ya ji, ma na ya ga-achọ ka o nyere ya aka. Onye nlekọta ìgwè ahụ ga-enyeziri onye nkwusa ahụ aka ịma ajụjụ ọ ga-ajụ na amaokwu Baịbụl ọ ga-agụrụ onye nwe ụlọ mgbe ọ na-egosi ya isiokwu dị na magazin ahụ o bu n’obi inyefe.
Nkeji 15: “Ụbọchị Mgbakọ Pụrụ Iche nke Afọ 2010.” Ajụjụ na azịza.