Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na December 14
IZU NA-AMALITE NA DECEMBER 14
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jọshụa 6-8
Nke 1: Jọshụa 8:1-17
Nke 2: Mmiri Ebibie Otu Ụwa—Ọ̀ Ga-eme Ọzọ? (lr isi nke 46)
Nke 3: Gịnị Mere Ihe E Dere n’Ekliziastis 7:21, 22 Ji Bụrụ Ndụmọdụ Bara Uru?
□ Nzukọ Ije Ozi:
Abụ nke 161
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 15: Gịnị Mere Ụjọ Anaghị Ekwe M Kọọrọ Ndị Ọzọ Ihe M Kweere? Okwu ga-esi na Teta! July-September 2009, peeji nke 22-25. Gwa otu nne na nna ka ha mee ihe ngosi ebe ha ji oge Ofufe Ezinụlọ na-egosi nwa ha otú ọ ga-esi aza ajụjụ ndị a na-ajụkarị ya n’ụlọ akwụkwọ. Ha na nwa ahụ ga-eme nchọnchọ ma tụlee otu n’ime ajụjụ ndị a jụrụ na peeji nke 23. Ha mechaa, nne na nna ahụ ga-emezi ka hà bụ ụmụ klas nwa ha ma jụọ ya ajụjụ ahụ ha tụlere.
Nkeji 15: “Jiri Ịnụ Ọkụ n’Obi Na-ekwusa Ozi Ọma!” Ajụjụ na azịza. A tụlewa paragraf nke 4, gbaa otu onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi ajụjụ ọnụ. Jụọ ya ajụjụ ndị a: Olee ihe ndị i merela iji hụ na ihe ndị na-abaghị uru juru n’ụwa a anaghị emegharị gị anya? Olee uru iji ịnụ ọkụ n’obi ekwusa ozi ọma baarala gị?