Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’October 26
IZU NA-AMALITE N’OCTOBER 26
Abụ nke 200
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
lv isiokwu malitere na peeji nke 219 ruo peeji nke 221
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 11-13
Ntụleghachi nke Ihe Ndị A Mụrụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Ụlọ Nche na Teta! Jiri nkeji ole na ole kwuo ihe ndị dị na magazin ndị ahụ, kwuokwa isiokwu ndị nwere ike ịmasị ndị bi n’ókèala unu. Gwa otu onye nkwusa ka o mee ihe ngosi ebe nne ma ọ bụ nna na-enyere nwa ya aka ịkwadebe ihe ọ ga-ekwu n’ozi ọma. Nne ahụ ma ọ bụ nna ahụ na nwa ya ga-ahọrọ otu isiokwu na magazin ndị ahụ, chepụta ajụjụ ha ga-ajụ onye nwe ụlọ ma họrọ amaokwu Akwụkwọ Nsọ ha ga-agụrụ ya. Nne ma ọ bụ nna nwa ahụ ga-anọrọ nwa ahụ ka onye nwe ụlọ, nwa ahụ enyefezie ya magazin ahụ, kọwaakwa otú e si akwado ọrụ Ndịàmà Jehova.
Nkeji 10: Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo isiokwu ndị kacha amasị ndị dị bi n’ókèala unu n’akwụkwọ ahụ. Olee ajụjụ ha na-ajụ ndị nwe ụlọ ma ha chọọ inye ha akwụkwọ ahụ, oleekwa ihe osise ma ọ bụ amaokwu Baịbụl ndị ha na-agụrụ ha? Gwa otu onye nkwusa ka o mee otu ihe ngosi.
Nkeji 10: Igbe Ajụjụ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Gụọ ma kọwaa amaokwu Baịbụl ndị dị na ya.