Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’October 12
IZU NA-AMALITE N’OCTOBER 12
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Diuterọnọmi 4-6
Nke 1: Diuterọnọmi 4:15-28
Nke 2: Icheta Jehova na Ọkpara Ya (lr isi nke 37)
Nke 3: Olee Mgbe E Nwere Ike Ikwu na Inwe Ntakịrị Ihe Ka Mma? (Ilu 15:16)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa.
Nkeji 10: Iduzi Ọmụmụ Baịbụl Ebe Obibi. Okwu si n’akwụkwọ Ndị A Haziri, peeji nke 98, paragraf nke 1 ruo peeji nke 99, paragraf nke 1. Gwa ndị nkwusa ka ha jiri nkeji ole na ole kọọ ụdị obi ụtọ ha nwere n’ihi ịkụziri mmadụ eziokwu Baịbụl.
Nkeji 10: Akwụkwọ A Ga-enyefe n’October. Gwa ndị nkwusa abụọ ka ha mee ihe ngosi abụọ. N’otu n’ime ihe ngosi ahụ, onye nwe ụlọ ga-ajụ onye nkwusa ajụjụ ọ ga-aza ma ọ bịa nletaghachi. Ihe ngosi nke ọzọ ga-egosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl ná nleta mbụ. E mechaa ihe ngosi nke ọ bụla, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ná nkenke ihe ha mụtara.
Nkeji 10: “Ị̀ Dị Njikere Ịgba Àmà n’Oge Ị Na-anọghị n’Ozi?” Ajụjụ na azịza.