Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’April 20
IZU NA-AMALITE N’APRIL 20
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 15-18
Nke 1: Ọpụpụ 15:1-19
Nke 2: Gịnị Ka Izere Ofufe Ụgha Gụnyere?
Nke 3: Ihe Mmụta Banyere Inwe Obiọma (lr isi nke 15)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma Ọkwa.
Nkeji 10: Okwu Chineke Si n’Ike Mmụọ Nsọ. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle nke si n’Isiokwu Dị Iche Iche nke Baịbụl Maka Nkwurịta Okwu, 7A.
Nkeji 10: Jikere Inyefe Ụlọ Nche May 1 na Teta! April–June. Jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị ga-akacha amasị ndị bi n’ókèala unu na ihe mere ha ji kwuo otú ahụ. Mee ihe ngosi nke otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla n’ókèala unu. N’otu n’ime ihe ngosi abụọ ahụ, gosi otú e nwere ike isi malite ọmụmụ Baịbụl ma a bịa nletaghachi.—Lee km 8/07 p. 3.
Nkeji 10: “Kụziere Ndị Na-amaghị Agụ Ihe nke Ọma Ihe.” Mgbe unu na-atụle paragraf nke 3, jiri nkeji ole na ole mee ihe ngosi nke ebe onye ọsụ ụzọ ji ihe osise dị n’akwụkwọ o ji amụrụ mmadụ ihe kụziere onye ahụ ihe.
Abụ nke 170