Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite n’April 13
IZU NA-AMALITE N’APRIL 13
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Ọpụpụ 11-14
Nke 1: Ọpụpụ 12:21-36
Nke 2: Ihe Mere Anyị Kwesịrị Iji Na-agbaghara (lr isi nke 14)
Nke 3: Ihe Mere Jehova Na-enweghị Ike Iji Soro n’Atọ n’Ime Otu (td 5A)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma Ọkwa. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa April.
Nkeji 10: Tụlee otú ihe si na-aga kemgbe e wepụtara ụbọchị pụrụ iche e ji amalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Kọọ otu ma ọ bụ ahụmahụ abụọ e nwetara n’ókèala unu.
Nkeji 10: Dịrị Akọ Mgbe Ị Na-agba Àmà. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle nke si n’isiokwu nta dị na peeji nke 197 n’akwụkwọ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi. Mee ihe ngosi otú onye nkwusa nwere ike isi zaghachi onye nwe ụlọ mgbe o kwuru otu n’ime ihe ndị bi n’ókèala unu na-ekwukarị iji gbochie anyị izi ha ozi ọma.
Nkeji 10: “Ikwusa Ozi Ọma Na-eme Ka Okwukwe Anyị Sikwuo Ike.” Ajụjụ na Azịza.