Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na January 12
IZU NA-AMALITE NA JANUARY 12
Abụ nke 162
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Jenesis 6-10
Nke 1: Jenesis 9:1-17
Nke 2: Gịnị Bụ Mmehie Megide Mmụọ Nsọ? (td 26D)
Nke 3: Akwụkwọ Ozi nke Si n’Aka Chineke Na-ahụ n’Anya (lr isi nke 2)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke mbụ nke ọnwa January.
Nkeji 10: Uru Ọ Bara Ịdị Na-ele Ndị Anyị Na-ezi Ozi Ọma Anya Otú Kwesịrị Ekwesị. Okwu ọkà okwu na ndị na-ege ntị ga-atụle. Jizọs lere ndị o kwusaara ozi ọma anya dị ka atụrụ chọrọ enyemaka, o sikwa otú a kụziere anyị otú anyị ga-esi na-ele ndị anyị na-ekwusara ozi ọma anya. (Mat. 9:36-38) Ọ bụ ezie na Ananayas achọbughị ịga hụ Sọl, olee ihe nyeere ya aka ịgbanwe echiche ya? (Ọrụ 9:13-15) Olee otú okwu ndị Ananayas gwara Sọl si gosi na o lere Sọl anya otú kwesịrị ekwesị? (Ọrụ 9:17) Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-ele ndị bi n’ókèala anyị anya otú kwesịrị ekwesị mgbe anyị na-ezi ha ozi ọma? Olee otú ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ga-esi mee ka anyị rụpụtakwuo ihe n’ozi anyị? Jiri obere oge gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị rụpụtara ihe dị mma n’ozi ha n’ihi ile ndị ha na-ezi ozi ọma anya otú kwesịrị ekwesị.
Nkeji 10: Otú E Si Eji Akwụkwọ Nta Bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible Aza Ajụjụ. Okwu onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ga-ekwu nke ga-adabere na peeji nke 2 na nke 7 nke akwụkwọ nta ahụ.
Nkeji 10: “Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?”a
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji ma malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.