Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 10/08 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite n’October 13
  • Izu Na-amalite n’October 20
  • Izu Na-amalite n’October 27
  • Izu Na-amalite na November 3
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 10/08 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka NzuKỌ Ije Ozi

Izu Na-amalite n’October 13

Abụ nke 174

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa October. Tụleghachitụ aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 maka otú a ga-esi enyefe Ụlọ Nche nke October 1 na Teta! nke October-December. Ebe ọ bụ na ọtụtụ ndị nkwusa enyefewela magazin ndị a kemgbe izu ole na ole ugbu a, jụọ ndị na-ege ntị ahụmahụ ndị ha nwetarala.

Nkeji 35: “Otú A Ga-esizi Na-enwe Ọmụmụ Ihe Ọgbakọ.”a Dabere n’oge e nwere, gụọ amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche na ha ma jụọ ndị na-ege ntị ihe ha nwere ikwu banyere ha.

Abụ nke 216

Izu Na-amalite n’October 20

Abụ nke 113

Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

Nkeji 20: Nọgide Na-enwe Ọṅụ n’Ozi Gị. Okwu na-agba ume nke dabeere n’Ụlọ Nche nke July 1, 2005, peeji nke 24-25, paragraf nke 11-17. Gbaa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị nọterela aka n’ozi Jehova ma na-ekwesị ntụkwasị obi. Gịnị nyeerela ha aka ịnọgide na-enwe ọṅụ mgbe ndị mmadụ na-egeghị ntị?

Nkeji 20: Jikere Inyefe Ụlọ Nche nke November 1 na Teta! nke October-December. Mgbe ị kọwatụchara isi ihe ndị dị na magazin ndị a, jụọ ndị na-ege ntị isiokwu ndị nwere ike ịmasị nnọọ ọtụtụ ndị bi n’ókèala unu. Ha kwuokwa ihe mere ha ji kwuo otú ahụ. Jụọ ndị na-ege ntị ajụjụ dabara adaba ha mere atụmatụ iji malite mkparịta ụka na amaokwu Baịbụl dị n’isiokwu ahụ e nwere ike ịgụ tupu ha a na-enyefe magazin ndị ahụ. Ọkà okwu emechie site n’ikwu ka e mee ihe ngosi sitere n’aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 banyere otú e nwere ike isi nyefee magazin nke ọ bụla ma ọ bụkwanụ e mee ihe ngosi nke aro ndị ọzọ ga-amasị ndị bi n’ókèala unu.

Abụ nke 148

Izu Na-amalite n’October 27

Abụ nke 30

Nkeji 5: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo.

Nkeji 10: Mkpa ọgbakọ.

Nkeji 30: “Ọmụmụ Baịbụl Onwe Onye na nke Ezinụlọ Dị Oké Mkpa!”b Dabere n’oge e nwere, gụọ amaokwu Baịbụl ndị a kpọtụrụ uche na ha ma jụọ ndị na-ege ntị ihe ha ghọtara na ha.

Abụ nke 142

Izu Na-amalite na November 3

Abụ nke 100

Nkeji 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October.

Nkeji 20: Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka Afọ 2009. Onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na ndị na-ege ntị ga-ekwurịta banyere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ọhụrụ nke dị n’okpuru ebe e dere “Ntụziaka” n’ihe ntinye bú Usoro Ihe Omume Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Lekwasị anya n’ihe ndị a gbanwere agbanwe. Gbaa mmadụ niile ume ka ha gbaa mbọ na-eme ihe omume ndị e nyere ha, na-akwado ịza ajụjụ mgbe a na-atụle isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Baịbụl, ma na-agba mbọ itinye ihe ndị onye nlekọta ụlọ akwụkwọ na-ekwu kwa izu, bụ́ ndị dabeere n’akwụkwọ bụ́ Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, n’ọrụ.

Nkeji 15: Mee Ka “Nkà Izi Ihe” Gị Ka Mma. Onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ okenye ọzọ ruru eru ga-eme ihe omume a ma chọpụta isi ihe ise ga-eme ka mmadụ bụrụ onye na-akụzi ihe nke ọma bụ́ ndị dị na paragraf nke 5-18 na peeji nke 9-12 n’Ụlọ Nche nke January 15, 2008. Gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị chere na ihe dị n’Ụlọ Nche ahụ enyerela ha aka izi ihe nke ọma karị.

Abụ nke 91

[Ihe odide ala ala peeji]

a Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

b Ekwela ka okwu mmeghe gị ruo otu nkeji, malitezie iduzi ya n’ụdị ajụjụ na azịza.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya