Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-ele Akwụkwọ Anyị Anya na Otú Anyị Kwesịrị Isi Na-eji Ha Eme Ihe
1 Kemgbe ọtụtụ afọ ugbu a, nzukọ a na-ebipụta akwụkwọ ndị a na-enye ọhaneze nakwa ndị anyị ji eme ihe n’onwe anyị n’ekwughị ego ole onye weere ha ga-akwụ. Ndokwa a arụpụtala nnọọ ezigbo ihe. O meekwala ka otú e si eme ihe na Betel nakwa n’ọgbakọ dị iche iche dị mfe. Ma anyị ga-ekweta na n’agbanyeghị na a na-enyefe akwụkwọ ndị a “n’ekwughị ego ole a ga-akwụ,” ọ pụtaghị na ha bụ “n’efu.” A na-emefu ego buru ibu n’ịzụ na ịtụbata ngwa ọrụ na ihe ndị e ji ebi akwụkwọ, nakwa n’ikesa nri ime mmụọ n’ọgbakọ dị iche iche. N’ihi nke a, o kwesịrị ekwesị ikwu ihe ole na ole banyere otú kwesịrị ekwesị isi na-ele akwụkwọ anyị ndị a anya.
2 Olee otú anyị kwesịrị isi na-ele inye onyinye maka ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ anya? (Gụọ Ilu 3:9.) Ọ bụụrụ anyị ihe ùgwù magburu onwe ya iji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa anyị nwere na-asọpụrụ Jehova. Ọ bụ ya nyere anyị ihe nile anyị nwere. Inye onyinye bụ otu ụzọ anyị si egosi na anyị nwere obi ekele maka ihe nile Jehova meere anyị. Ọ̀ bụ na anyị abụghị ndị Jehova gọziri agọzi? N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ anya na ọ bụ nanị ndị anyị na-enyefe akwụkwọ ga na-enye onyinye.
3 Olee otú anyị kwesịrị isi na-eji akwụkwọ ndị a eme ihe? (Gụọ Matiu 25:21.) Isi sekpụ ntị n’okwu a bụ ikwesị ntụkwasị obi. Ụdị ikwesị ntụkwasị obi a na-eweta ọtụtụ ngọzi. Mgbe ụfọdụ, anyị nwere ike iche na otú anyị si eji akwụkwọ anyị eme ihe enweghị ihe o mere. Ma ọ bụrụ na anyị ekwesị ntụkwasị obi n’ihe dị nta, a ga-enyekwu anyị ihe ndị ọzọ ilekọta. Akwụkwọ anyị nwere nri ime mmụọ ndị dị oké ọnụ ahịa. Otú anyị si eji ha eme ihe kwesịrị igosi na anyị weere na ha dị oké ọnụ ahịa. O kwesịghị ekwesị inye ha ụmụntakịrị ndị na-amaghị uru akwụkwọ ndị a bara, bụ́ ndị nanị ihe ha na-eme agwụla imebi ha. Mgbe ụmụntakịrị mụtara ka e si agụ ihe nke ọma ma nwee akwụkwọ ndị nke ha, e kwesịrị ịkụziri ha otú ha ga-esi jiri akwụkwọ ndị ahụ na-eme ihe ka ha ghara imebi. A hụla n’ọgbakọ ụfọdụ otú e si mebisịa akwụkwọ anyị ma tụsasịa ha n’ala. Nke a adịghị egosi na anyị nwere obi ekele maka akwụkwọ anyị ndị a bụ́ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa.
4 Olee otú m ga-esi nara akwụkwọ mgbe m na-enweghị ego hiri nne m ga-enye n’onyinye? (Gụọ 2 Ndị Kọrint 8:13-15.) Òtù Na-achị Isi chọrọ ka onye ọ bụla rite uru n’ọmụmụ ihe nile a na-enwe n’ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova n’ụwa dum, bụ́ ebe a na-enye anyị ntụziaka ime mmụọ. N’ihi nke a, e kwuru na e kwesịrị inye onye ọ bụla akwụkwọ anyị ndị anyị ji amụ ihe n’ọgbakọ, dị ka Ụlọ Nche na akwụkwọ ndị anyị ji amụ ihe n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Otú ọ dị, e kwesịghị ileda ndokwa a anya ma ọ bụ ghara iji ya kpọrọ ihe. Kama onye ọ bụla inwe nke ya, ụmụnna nwere ike na-ekerịta ọtụtụ ihe ndị ọzọ anyị na-emepụta, dị ka kaseti, CD, DVD, nakwa ihe ndị ọzọ a na-atụrụ ọda pụrụ iche. Ọ dịghị mkpa na onye ọ bụla n’ezinụlọ ga-enwe nke ya. Ọ dịghịkwa mkpa na onye ọ bụla n’ezinụlọ ga-enwe kaseti vidio na DVD nile.
5 Ma ànyị weere akwụkwọ ndị a ma ọ bụ na anyị ewereghị ha, anyị kwesịrị ịmara na inye onyinye iji kwadoo ọrụ zuru ụwa ọnụ bụụrụ anyị ihe ùgwù, bụrụkwa ọrụ dịịrị anyị ịrụ. Anyị kwesịkwara iji ihe ùgwù a kpọrọ ihe ọ bụrụgodị na anyị enweghị ego hiri nne anyị ga-enye n’onyinye.
6 Anyị nwere olileanya na ihe ndị a e kwuru ebe a ga-akpali anyị igosikwu na anyị nwere obi ekele maka akwụkwọ ndị a a na-enye anyị. Ka otú anyị nile si ele akwụkwọ anyị ndị a dị oké ọnụ ahịa anya na otú anyị si eji ha eme ihe gosi na anyị na-ekwesị ntụkwasị obi ọbụna n’ihe ndị dị nta. Nke a ga-eme ka e nwee ike inye anyị ihe ndị ka ukwuu anyị ga-elekọta n’ọdịnihu.