Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 9/07 p. 7
  • Ịma Ọkwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịma Ọkwa
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 9/07 p. 7

Ịma Ọkwa

◼ September: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’ụbọchị mbụ anyị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, mee ka ha hụ otú ha nwere ike isi rite uru na ya site n’igosi ha, ná nkenke, otú e si eji ya amụ Bible. October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Gị na ha kwurịta ihe dị na ya ka i wee malite iduziri ha ọmụmụ Bible. November: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ma ọ bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.

◼ Ebe ọ bụ na a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa September, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.

◼ A ga-atụle vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News ná Nzukọ Ije Ozi na December. Onye chọrọ ya kwesịrị isi n’aka ọgbakọ ya tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere omume.

◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2008 n’izu na-amalite na March 31, 2008. Ka oge na-aga, a ga-ama isiokwu ya n’ọkwa. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esote ya. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu izu na-amalite na March 31.

◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ maka ọnwa June, July, na August. Mgbe e nyochasịrị ihe ndekọ ego ndị a, e kwesịrị ịmara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe ọzọ a ga-agụ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).

◼ A ga-ezitere ọgbakọ nile baajị mgbakọ distrikti nke afọ 2007 ma e zitewere ha fọm ndị e ji eme ihe n’ọgbakọ, bụ́ ndị a na-ezite kwa afọ. Ọ dịghị mkpa ịtụwa ọda ha. Ọ bụrụ na baajị e ziteere ọgbakọ ezughị, e kwesịrị iji fọm Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ya. Ọgbakọ ọ bụla ga-atụ ọda maka ọbọ e ji etinye baajị tupu a na-ezitere ha ya ma ọ bụrụ na e nwee onye chọrọ ya.

◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:

New World Translation of the Holy Scriptures (nke mkpo ya na-esighị ike, na-abakwa n’akpa uwe, ma nke na-eji ojii ma nke na-achatụ uhie uhie)—Bekee

Watch Tower Publications Index—2006—Bekee

◼ Compact Disc Ọhụrụ E Nwere:

Kingdom Melodies—Ọ dị na Compact Disc, Mpịakọta nke Anọ (Nke Ọhụrụ)

Kingdom Melodies—Ọ dị na MP3

Watchtower Library on CD-ROM, 2006 Edition—Bekee

◼ DVD Ọhụrụ E Nwere:

Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News and Our Whole Association of Brothers—Ọ dị na DVD—Bekee

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya