Ịma Ọkwa
◼ September: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi. E kwesịrị ime mgbalị pụrụ iche ịmalite iduziri ndị mmadụ ọmụmụ Bible n’ụbọchị mbụ anyị gara na nke ha. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ nwere akwụkwọ a, mee ka ha hụ otú ha nwere ike isi rite uru na ya site n’igosi ha, ná nkenke, otú e si eji ya amụ Bible. October: Nyefee magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe e gosiri mmasị, nyefee ha traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible? Gị na ha kwurịta ihe dị na ya ka i wee malite iduziri ha ọmụmụ Bible. November: A ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ọ bụrụ na ndị nwe ụlọ asị na ha enweghị ụmụaka, nyefee ha broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! December: Nyefee akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ. Ọ bụrụ na e nweghị ya, nyefee akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso ma ọ bụ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ.
◼ Ebe ọ bụ na a ga-enwe ngwụsị izu ise zuru ezu n’ọnwa September, ọ ga-abụ ọnwa magburu onwe ya ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka.
◼ A ga-atụle vidio bụ́ Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News ná Nzukọ Ije Ozi na December. Onye chọrọ ya kwesịrị isi n’aka ọgbakọ ya tụọ ọda ya ngwa ngwa o kwere omume.
◼ A ga-ekwu okwu ihu ọha pụrụ iche maka oge Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2008 n’izu na-amalite na March 31, 2008. Ka oge na-aga, a ga-ama isiokwu ya n’ọkwa. Ọgbakọ ndị ga-enwe onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbakọ ná ngwụsị izu ahụ ga-ekwu okwu ihu ọha ahụ pụrụ iche n’izu na-esote ya. Ọ dịghị ọgbakọ kwesịrị ikwu ya tupu izu na-amalite na March 31.
◼ Onyeisi oche ndị nlekọta ma ọ bụ onye ọ họpụtara kwesịrị inyocha ihe ndekọ ego ọgbakọ maka ọnwa June, July, na August. Mgbe e nyochasịrị ihe ndekọ ego ndị a, e kwesịrị ịmara ya ọgbakọ n’ọkwa mgbe ọzọ a ga-agụ akụkọ ndekọ ego.—Lee Instructions for Congregation Accounting (S-27).
◼ A ga-ezitere ọgbakọ nile baajị mgbakọ distrikti nke afọ 2007 ma e zitewere ha fọm ndị e ji eme ihe n’ọgbakọ, bụ́ ndị a na-ezite kwa afọ. Ọ dịghị mkpa ịtụwa ọda ha. Ọ bụrụ na baajị e ziteere ọgbakọ ezughị, e kwesịrị iji fọm Literature Request Form (S-14) tụọ ọda ya. Ọgbakọ ọ bụla ga-atụ ọda maka ọbọ e ji etinye baajị tupu a na-ezitere ha ya ma ọ bụrụ na e nwee onye chọrọ ya.
◼ Akwụkwọ Ọhụrụ Ndị E Nwere:
New World Translation of the Holy Scriptures (nke mkpo ya na-esighị ike, na-abakwa n’akpa uwe, ma nke na-eji ojii ma nke na-achatụ uhie uhie)—Bekee
Watch Tower Publications Index—2006—Bekee
◼ Compact Disc Ọhụrụ E Nwere:
Kingdom Melodies—Ọ dị na Compact Disc, Mpịakọta nke Anọ (Nke Ọhụrụ)
Kingdom Melodies—Ọ dị na MP3
Watchtower Library on CD-ROM, 2006 Edition—Bekee
◼ DVD Ọhụrụ E Nwere:
Jehovah’s Witnesses—Organized to Share the Good News and Our Whole Association of Brothers—Ọ dị na DVD—Bekee