Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije ozi
Izu Na-amalite n’October 9
Abụ nke 25
Minit 15: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa October. Ịma ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche October 15 na Teta! October–December. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke mbụ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe.
Minit 15: “Nyere Ndị Mmadụ Aka Ịghọ Ndị Enyi Chineke.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ihe nlereanya nke ndị ọzọ na ekpere sitere n’ala ala obi sirila nyere ha aka inwe ọganihu ruo n’ókè nke ime baptizim.
Minit 15: Ahụmahụ ndị e nwetara n’ókèala unu. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị ha nwetara n’ozi ubi mgbe ha na-enyefe Teta! ahụ pụrụ iche, ya bụ, Teta! (Bekee) nke September, ma ọ bụ mgbe ha ji akwụkwọ Bible Na-akụzi malite iduziri onye nwe ụlọ ọmụmụ Bible n’oge mbụ ha gara na nke ya. E nwere ike ime ihe ngosi nke otu ahụmahụ bụ́ ịgba ma ọ bụ abụọ.
Abụ nke 221 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’October 16
Abụ nke 84
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.
Minit 20: Irite Uru n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, malite n’isiokwu nta dị na peeji nke 69 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 72.
Minit 15: “Olee Ihe Ị Na-ebute Ụzọ?”b Mee ndokwa ka ndị nkwusa ole na ole kwuo otú ha sirila hazie ihe omume ha iji bute ihe ndị metụtara Alaeze ahụ ụzọ, ha kọọkwa ngọzi ndị ha nwetarala n’ihi ime otú ahụ.
Abụ nke 172 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’October 23
Abụ nke 58
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro a tụrụ na peeji nke 8, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche November 1 na Teta! October–December. Mgbe a na-enyefe Teta! ahụ, jiri ụzọ nke abụọ a tụrụ aro isi nyefee ya mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi otú a ga-esi azaghachi mgbe onye nwe ụlọ jụrụ, sị, “Gịnị Mere Unu Ji Abịa Ọtụtụ Ugbo?”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, p. 12.
Minit 15: Mkpa ọgbakọ.
Minit 20: “Na-erite Uru Zuru Ezu ná Nzukọ Maka Ozi Ubi.”c Mgbe a na-atụle paragraf nke 3, gụnye ihe ndị e kwuru n’Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2001, paragraf nke 4, banyere ihe a ga-eme mgbe a na-enweghị nwanna ruru eru iduzi nzukọ maka ozi ubi.
Abụ nke 143 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite n’October 30
Abụ nke 207
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa October.
Minit 15: Olee Otú M Pụrụ Isi Kwusaara Ụmụ Akwụkwọ Ibe M Ozi Ọma? Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, nke ga-adabere na Teta! April 8, 2002, peeji nke 28-30. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ahụmahụ ndị dị ụtọ ha nwetarala mgbe ha kwusaara ụmụ akwụkwọ ibe ha ozi ọma.
Minit 20: Nọgide Na-anọpụ Iche na Ndọrọ Ndọrọ Ọchịchị Ụwa Dị Ka Onye Kraịst. Okwu nke ga-adabere n’akwụkwọ bụ́ Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe, isi nke 18, paragraf nke 6-15. Ọ bụ okenye ruru eru ga-ekwu ya.
Abụ nke 136 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite na November 6
Abụ nke 146
Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 3-4 nke Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee akwụkwọ bụ́ Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ. Ruo ókè oge kwere mee, gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ ihe ọma ndị si n’iji akwụkwọ a mee ihe n’ozi ubi ma ọ bụ n’ezinụlọ nke ha, pụta.
Minit 15: Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù. Okwu okenye ga-ekwu, nke ga-adabere n’Ụlọ Nche October 15, 2006, peeji nke 28-31.
Minit 20: Ikwusa Okwu ahụ Na-enye Ume Ọhụrụ. Okwu ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya, nke ga-adabere n’Ụlọ Nche January 15, 2002, peeji nke 8-9. Gwa ndị na-ege ntị ka ha kọọ otú ozi ọma si enye ha ume ọhụrụ. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ agwa tupu oge eruo ka ha wee nwee ike ịkwadebe ihe ha ga-ekwu.
Abụ nke 8 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.