Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/06 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2006
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite na January 9
  • Izu Na-amalite na January 16
  • Izu Na-amalite na January 23
  • Izu Na-amalite na January 30
  • Izu Na-amalite na February 6
Ozi Alaeze Anyi—2006
km 1/06 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite na January 9

Abụ nke 10

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke January 15 na Teta! nke January-March. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-eje ozi n’ógbè a na-azụ ahịa.

Minit 15: Ime Ka Obi Jehova Ṅụrịa. (Ilu 27:11) Gbaa mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ ajụjụ ọnụ, bụ́ ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi jeere Jehova ozi ruo ọtụtụ afọ. Gwa nke ọ bụla n’ime ha ka ha kọọ otu ihe ma ọ bụ abụọ nyeere ha aka ịnọgide na-erubere Jehova isi. Ụfọdụ n’ime ihe ndị ha ga-ekwu pụrụ ịbụ inwechi ọmụmụ Bible onwe onye anya, ịgachi nzukọ anya, iso ndị ọzọ na-eguzosi ike n’ihe na-akpakọrịta, iji obi ha nile na-ekerechi òkè anya n’ozi ubi, ikpe ekpere sitere n’ala ala obi, na izere ntụrụndụ ndị na-adịghị mma. Olee ule nrubeisi ndị bịaara ha, oleekwa otú ha si merie ule ndị ahụ? Olee ngọzi ndị ha nwetarala n’ihi nrubeisi ha?

Minit 20: “Ụwa nke Ịda Ogbenye Na-adịghị na Ya Dị Nso.” Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke May 15, 2005, peeji nke 4-7. N’ime oge e wepụtara maka ya, tụlee isiokwu ahụ dị ka o si metụta ọgbakọ unu.

Abụ nke 15 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na January 16

Abụ nke 178

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa January. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Transfusion-Alternative Health Care—Meeting Patient Needs and Rights iji jikere maka mkparịta ụka a ga-enwe na ya ná Nzukọ Ije Ozi nke izu abụọ na-abịanụ.

Minit 15: Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere na peeji nke 4-7 nke akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova. Mgbe i jisịrị ihe dị na peeji nke 4 kwuo okwu mmeghe na-agaghị eru minit atọ, jiri ihe e dere na peeji nke 5 ruo n’isiokwu nta dị na peeji nke 7 duzie mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. A ga-atụle akụkụ ndị ọzọ nke akwụkwọ Nhazi ná Nzukọ Ije Ozi ndị a ga-enwe n’ọdịnihu.

Minit 20: “Ndị Na-eto Eto Bụ́ Ndị Na-enwu Dị Ka Ihe Ndị Na-enye Ìhè.”a Gwa ndị ntorobịa ka ha kwuo otú ha siworo nwee ike ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ. A pụrụ ịgwa otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ n’ime ha agwa tupu oge eruo ka ha wee nwee ike ịkwadebe ihe ha ga-ekwu.

Abụ nke 107 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na January 23

Abụ nke 60

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4, ma ọ bụ aro ndị ọzọ dabara adaba n’ókèala unu, mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 1. Mee ka onye na-eto eto mee ihe ngosi ahụ.

Minit 15: Mkpa ọgbakọ.

Minit 20: “Na-egosi Mmasị n’Ebe Ndị Ọzọ Nọ—Site n’Ịjụ Ajụjụ na Ige Ntị.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 2, gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ajụjụ ndị ha chọpụtaworo na ọ na-abụ ha jụọ, ndị mmadụ enwee mmasị iso ha kwurịta okwu. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi jiri akọ jụpụta mmadụ echiche ya ma gee ya ntị nke ọma.

Abụ nke 205 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na January 30

Abụ nke 197

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa January. Kwuo akwụkwọ a ga-eji jee ozi n’ọnwa February, meekwa otu ihe ngosi iji gosi otú a pụrụ isi nyefee ya.

Minit 15: Ndokwa Ndị E Ji Ịhụnanya Mee Maka Ọdịmma Anyị. Ọ bụ okenye ọgbakọ ga-eme ya. Gụọ ma kọwaa akwụkwọ ozi January 3, 2006, bụ́ nke alaka ụlọ ọrụ degaara ọgbakọ nile banyere ụzọ a ga-esi erite uru n’ọrụ Kọmitii Na-ahụ Maka Mmekọrịta Anyị na Ndị Ụlọ Ọgwụ (HLC) na nke Ndị Na-aga Eleta Ndị Ọrịa (PVG), na-arụ.

Minit 20: “Vidio nke Na-eme Ka Otu Ụzọ Dị Mkpa E Si Agwọ Ọrịa Pụta Ìhè.” Gụọ Ọrụ 15:28, 29, ma jiri ụzọ dị nkenke mee ka o doo anya na isi ihe mere Ndị Kraịst na-ejighị ekwe ka a mịnye ha ọbara bụ n’ihi na ha na-erube isi n’iwu Chineke nyere banyere ịdị nsọ nke ọbara. I kwusịa ya, jirizie ajụjụ ndị e depụtara n’isiokwu ahụ tụlee vidio bụ́ Patient Needs and Rights. Mechie site n’ịgụ paragraf nke ikpeazụ ya. Ma ọ bụkwanụ, tụlee “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke dị n’Ụlọ Nche nke June 15, 2004, na nke October 15, 2000.

Abụ nke 45 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite na February 6

Abụ nke 74

Minit 10: Ịma ọkwa ọgbakọ.

Minit 20: “A Chọrọ Enyemaka Gị.”c Gbaa otu okenye ajụjụ ọnụ n’ụzọ dị nkenke. Gwa ya ka ọ kọọ ihe gbara ya ume ịgbalị iru eru iji jeere ọgbakọ ozi na ihe nyeere ya aka iru ihe ndị a chọrọ iji toruo ịbụ okenye.

Minit 15: Ọrụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka Na-eweta Ngọzi. (Ilu 10:22) Gwa ndị rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’afọ gara aga ka ha kọọ otú ha si mee ndokwa ịrụ ya na ọṅụ nakwa ngọzi ndị ha nwetara na ya. Gbaa mmadụ nile ume iji ekpere tụlee ma hà pụrụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa March, April, na May.

Abụ nke 16 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya