Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/05 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2005
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite August 8
  • Izu Na-amalite August 15
  • Izu Na-amalite August 22
  • Izu Na-amalite August 29
  • Izu Na-amalite September 5
Ozi Alaeze Anyi—2005
km 8/05 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite August 8

Abụ nke 125

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri otu ma ọ bụ abụọ n’ime ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro isi mee nletaghachi na nke ndị e nyefere broshuọ, bụ́ ndị dị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 2005, mee ihe ngosi.

15 min: Otú E Si Ahụ na E Gbughị Oge n’Iwega Kaadị Ihe Ndekọ Maka Onye Nkwusa n’Ọgbakọ Ọhụrụ. Okwu nke ga-adabere n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova (Bekee), peeji nke 87-88. Gbaa ndị nkwusa ume ime ka a mara ọgbakọ ha nọbu na ya ozugbo ha gafere n’ọgbakọ ọhụrụ. Ndị okenye kwesịrị ịhụ na ha wegara kaadị Congregation’s Publisher Record nke onye nkwusa ozugbo ọ gafere n’ọgbakọ ọhụrụ ma ọ bụ ozugbo ọgbakọ ọhụrụ ahụ jụrụ ha maka ya. Ọ bụrụ na ọ dị mkpa isi na post ọfịs ziga kaadị ahụ n’ihi otú ọgbakọ ahụ si dị anya, anyị na-atụ aro ka e zite ya n’alaka ụlọ ọrụ site n’idebe ya n’ebe ụgbọala anyị na-ebusa akwụkwọ ka ụgbọala anyị wee bute ya. Anyị ga-ejizi aka anyị ziga ya n’ọgbakọ ọhụrụ ahụ.—Leekwa Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1991, peeji nke 3.

20 min: Na-egosi Mmetụta n’Ebe Ndị Na-adịghị Ike Nọ. (Ọrụ 20:35) Mgbe i kwusịrị okwu mmeghe na-agaghị eru otu minit, jiri Ụlọ Nche nke July 1, 2004, peeji nke 17-18, paragraf 12-16 duzie mkparịta ụka ajụjụ na azịza otú ahụ e si eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Gwa nwanna nwoke ma agụ ihe nke ọma ka ọ gụpụta paragraf ndị ahụ.

Abụ nke 116 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 15

Abụ nke 11

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa August. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke August 15 na Teta! nke September 8.

15 min: Ị̀ Na-echeta? Mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke April 15, 2005, peeji nke 30. Gwa ndị na-ege ntị ka ha zaa nke ọ bụla n’ime ajụjụ ndị ahụ. Mee ka uru ihe ọmụma ndị ahụ bara pụta ìhè. Gbaa mmadụ nile ume ịdị na-agụ mbipụta nile nke Ụlọ Nche na Teta! nke ọma.

20 min: “Ịmalite Ọmụmụ Bible n’Ọnụ Ụzọ Nakwa Iji Telifon Amalite Ya.”a Gụnye otu ihe ngosi dị mkpirikpi nke ga-egosi otú a pụrụ isi malite ọmụmụ Bible n’oge mbụ e zutere mmadụ, na-eji otu paragraf ma ọ bụ abụọ na broshuọ Na-achọ mee ihe.

Abụ nke 30 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 22

Abụ nke 161

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo.

15 min: Mkpa ọgbakọ.

20 min: “Ọrụ Nkwusa Alaeze—Ihe Ùgwù Dị Oké Ọnụ Ahịa.”b Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, tụleghachi ndokwa ahụ pụrụ iche e mere ka ndị na-apụghị ije ozi n’ihi nká ma ọ bụ ọrịa na-enye akụkọ ozi ubi ha ndị ruru minit 15.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke October 2002, p. 7, para. 6.

Abụ nke 204 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite August 29

Abụ nke 45

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa August. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke September 1. N’ihe ngosi ahụ, gosi ebe a gara nletaghachi na nke onye a na-ewegara magazin mgbe nile.

15 min: Otú E Si Enyere Ndị Na-asụ Asụsụ Ọzọ Aka. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’okwu mmalite nke akwụkwọ nta bụ́ Good News for People of All Nations. Kwuo ihe ụfọdụ ndị dị n’akwụkwọ nta ọhụrụ ahụ. Tụlee ihe atọ anyị pụrụ ime iji nyere ndị na-asụ asụsụ anyị na-adịghị aghọta aka. Gụnye ihe ndị e kwuru n’Ozi Alaeze Anyị nke July 2003, peeji nke 8. Kwuo na e kwesịrị ịdị na-edejupụta fọm Please Follow Up (S-43) ọbụna ma a sị na onye ahụ egosighị mmasị n’ozi Alaeze ahụ.

20 min: Hụ na Ị Gụụrụ Onye Nwe Ụlọ Bible n’Oge Mbụ I Zutere Ya. Okwu na mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya. Tụleghachi aro ndị a tụrụ n’Ozi Alaeze Anyị nke September 2004, peeji nke 8, paragraf nke 2, banyere ụzọ a pụrụ isi dọrọ uche gaa n’Okwu Chineke n’oge mbụ e kwusaara mmadụ ozi ọma. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi jiri otu ma ọ bụ abụọ n’ime ụzọ ndị ahụ a tụrụ aro isi mee ya mee ihe mgbe a na-enyefe akwụkwọ e ji eje ozi n’ọnwa September. A pụkwara ịtụle aro ndị a tụrụ n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005 banyere ụzọ a pụrụ isi nyefee akwụkwọ ahụ ma jiri ya mee ihe ngosi dị ka oge kwere mee.

Abụ nke 71 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite September 5

Abụ nke 98

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

15 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 12.”c Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ kwuo ihe nyeere ha aka inwe ọganihu n’ịmalite nakwa n’iduzi ọmụmụ Bible.

20 min: Ime Nhazi Inyere Ndị Agadi Aka. Okwu okenye ga-ekwu nke ga-adabere n’Ụlọ Nche nke August 15, 1993, peeji nke 28-29, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Ime Nhazi Bara Oké Uru.” Kwuo ndokwa ndị e meworo n’ọgbakọ iji nyere ndị agadi na ndị ahụ́ na-adịghị aka.

Abụ nke 164 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya