Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite May 9
Abụ nke 217
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke May 15 na Teta! nke June 8. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. N’otu n’ime ihe ngosi ndị ahụ, gosi ebe onye nkwusa na-enyefe magazin n’ụgbọ njem ọhaneze n’oge ọ na-anọghị n’ozi.
15 min: Jiri Okwu Chineke Na-eru n’Obi Ndị Mmadụ. Okwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke February 1, 2005, peeji nke 28-31. Tụlee otú Jizọs si jiri Akwụkwọ Nsọ nyere Pita aka. Kwuo otú anyị pụrụ isi ṅomie ihe nlereanya Jizọs mgbe ọ dị mkpa ka anyị gbazie echiche na mmetụta nke ụmụ anyị, nke ndị anyị na-eduziri ọmụmụ Bible, na ọbụna nke anyị onwe anyị.
20 min: “Nwee Usoro Ihe Omume Dị Irè nke Ezinụlọ Gị Ga Na-agbaso.” N’okwu mmeghe nke na-agaghị eru minit abụọ, mee ka uru ọ bara inwe usoro ihe omume e dere ede pụta ìhè, kwuokwa otú a ga-esi edejupụta usoro ihe omume nke ahụ a na-edejupụtabeghị bụ́ nke dị na peeji nke 6. Mgbe i kwusịrị okwu mmeghe a, malitezie ntụle ajụjụ na azịza nke isiokwu bụ́ “Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Nzukọ Ọgbakọ.” Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo ihe ha na-eme iji hụ na ihe omume ndị ọzọ adịghị egbochi ha ịga nzukọ ọgbakọ. A ga-atụle akụkụ ndị ọzọ nke usoro ihe omume ezinụlọ n’izu ndị na-esonụ.
Abụ nke 176 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 16
Abụ nke 201
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa May. Tụlee, n’ụzọ dị nkenke, isiokwu bụ́ “Ịmụ Broshuọ Nọrọ na Nche!” bụ́ nke dị na peeji nke 6. Kwuo na isiokwu a bu usoro ihe omume a ga-agbaso wee mụọ broshuọ ahụ. Gbaa mmadụ nile ume ịdị na-akwadebe nke ọma ma na-ekere òkè n’ọmụmụ ihe ahụ kwa izu, malite n’izu nke May 23.
15 min: “Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ozi Ubi Ezinụlọ.”a Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo uru ndị dị n’ezinụlọ ịrụkọ ọrụ nkwusa ọnụ mgbe nile.
20 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 9.”b Mgbe ị na-atụle paragraf nke 2, mee ka otu ma ọ bụ isi ihe abụọ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke December 2004, peeji nke 8, pụta ìhè. A ga-eme ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe a na-eduzi ọmụmụ Bible. Mgbe ha mụsịrị ihe ọmụmụ nke 2 na broshuọ Na-achọ, onye na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ ajụọ onye ọ na-amụrụ ihe, sị: “Olee otú ị ga-esi kọwaara enyi gị ihe bụ́ aha Chineke?” Onye ahụ a na-amụrụ ihe ekwuo otú ọ ga-esi jiri Abụ Ọma 83:18 mee ya. Mgbe o kwusịrị, onye na-amụrụ ya ihe ajaa ya mma.
Abụ nke 134 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 23
Abụ nke 194
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Gụọ akụkọ ndekọ ego na akwụkwọ ozi ekele maka onyinye afọ ofufo. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke June 1. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe.
18 min: “Ụbọchị Jehova Dị Nso.”c Mgbe ị na-akwadebe ihe omume a, tụlee akwụkwọ Amụma Daniel, peeji nke 59, paragraf nke 28.
15 min: “Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ọmụmụ Ihe Ezinụlọ.”d Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kwuo otú ha si dokwaa ọmụmụ ihe ezinụlọ ha nakwa mgbalị ha na-eme iji na-enwechi ya anya.
Abụ nke 152 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite May 30
Abụ nke 190
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa May. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe n’ọnwa June. Mee ihe ngosi nke ụzọ a pụrụ isi nyefee akwụkwọ ahụ, na-eji otu n’ime ụzọ ndị a tụrụ aro ha isi nyefee ya n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2005 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe akwụkwọ ahụ mee ihe.
20 min: “Usoro Ihe Omume Ezinụlọ—Ihe Mmụta Dịịrị Ụbọchị.”e Gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ezinụlọ ha siworo na-erite uru site n’imekọ ihe mmụta dịịrị ụbọchị ọnụ nakwa oge ha chọpụtara na ọ dịịrị ha mma iji na-eme ya.
15 min: Kọọ ma ọ bụ mee ihe ngosi nke ahụmahụ ndị e nwere n’ozi ubi n’ime ọnwa March, April, na May. Mee ndokwa tupu oge eruo ka otu onye ma ọ bụ mmadụ abụọ kwuo mgbalị ha mere iji jekwuo ozi n’oge a e mere ihe omume maka Icheta Ọnwụ Jizọs nakwa n’oge e kesara broshuọ bụ́ Nọrọ na Nche! nakwa ngọzi ndị ha nwetara n’ihi ya.
Abụ nke 115 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 6
Abụ nke 155
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Na-akpali Mmasị Ndị Mmadụ Mgbe Ị Na-ewegara Ha Magazin.”f Mgbe ị na-atụle paragraf nke 3, dọrọ uche gaa n’akwụkwọ Reasoning, peeji nke 227-232. A pụrụ iji ihe e dere ebe ahụ kwadebe otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ a ga-agụ ma kọwaa bụ́ nke na-ekwu ihe Alaeze Chineke ga-eme. Mee ihe ngosi nke otú onye nkwusa pụrụ isi gwa onye ọ na-ewegara magazin okwu nke ga-adabere n’otu akụkụ Akwụkwọ Nsọ. Onye nkwusa kwesịrị ịgụ ma kọwaa akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ n’ụzọ dị nkenke, gosikwa otú a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ iji nyere onye nwe ụlọ aka ịghọta ya nke ọma na ịhụ otú ọ ga-esi baara ya uru ná ndụ.
Abụ nke 107 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
e Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
f Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.