Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite February 14
Abụ nke 174
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara mbụ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ha dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ isi nyefee Ụlọ Nche nke February 15 na Teta! nke March 8. Tụleghachi n’ụzọ dị mkpirikpi otú a pụrụ isi jiri ụzọ ndị a tụrụ aro ha isi nyefee magazin ndị a nyefee ha otú ga-ekwekọ n’ọnọdụ e nwere n’ókèala ọgbakọ unu.—Lee Ozi Alaeze Anyị nke January 2005, peeji nke 8.
35 min: “Oge Ememe Ncheta—Oge Ịrụsikwu Ọrụ Ike.”a Ọ bụ onye nlekọta ije ozi ga-eme ya. Mgbe a na-atụle paragraf nke 6, gụnye ihe ndị e kwuru na Teta! nke September 8, 2004, peeji nke 30-31. Maa ọkwa banyere ndị tinyeworo akwụkwọ maka ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Kwuo nzukọ ije ozi ubi ndị e mekwuru ndokwa ha. Gbaa mmadụ nile ume ịrụsikwu ọrụ ime mmụọ ike n’ụzọ ụfọdụ n’oge Ememe Ncheta a.
Abụ nke 14 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 21
Abụ nke 31
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụleghachi isi ihe ndị sitere n’isiokwu bụ́ “Ihe Ndị A Ga-echeta Banyere Ememe Ncheta.”
20 min: “Kelee Jehova Ekele Maka Ebere Ya.”b Kwuo ebe a ga-anọ eme Ememe Ncheta ahụ na oge ọ ga-amalite, tinyere aha onye ga-ekwu okwu ememe ahụ na ihe ọ bụla ọzọ dị mkpa ka a mara. Mgbe a na-atụle paragraf nke 4, mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe onye nkwusa na-akpọ onye ọ na-ewegara magazin kwa ọnwa òkù ịbịa Ememe Ncheta. E kwesịrị inye ụmụnna akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ememe Ncheta ozugbo e mechiri nzukọ a, ma ọ bụrụ na e nyebeghị ha ya.
15 min: “Iduzi Ọmụmụ Bible Na-aga n’Ihu—Akụkụ nke 6.”c Mee ihe ngosi ga-ewe minit anọ ebe onye a na-amụrụ Bible jụrụ ihe mere o ji bụrụ nanị mmadụ ole na ole na-ata achịcha ma na-aṅụ mmanya Ememe Ncheta. Onye na-eduziri ya ọmụmụ ihe ajaa ya mma maka ajụjụ ọ jụrụ, detuo ya edetu, ma gwa ya na ya ga-aza ya mgbe ha mụsịrị ihe. Mgbe ha mụsịrị ihe, ya egosi onye ahụ ọ na-amụrụ ihe isiokwu nta bụ́ “Olee Ndị Ga-ekere Òkè?,” bụ́ nke dị n’Ụlọ Nche nke March 15, 2004, peeji nke 5-6. Ha agụkọọ ya ọnụ, onye ahụ a na-amụrụ ihe ekeleekwa ya maka ụzọ doro anya o si zaa ya ajụjụ ahụ.
Abụ nke 21 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite February 28
Abụ nke 42
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka ọkara nke abụọ nke ọnwa February. Jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 8 (ma ọ bụrụ na ọ dabara n’ókèala unu) mee ihe ngosi nke ụzọ a ga-esi nyefee Ụlọ Nche nke March 1. A pụrụ iji ụzọ ndị ọzọ dị irè e si enyefe magazin mee ihe. Ná ngwụsị nke ihe ngosi ahụ, gosi ebe onye nkwusa ahụ ji ihe dị na peeji ikpeazụ na Teta! nke March 8 na-akpọ onye nwe ụlọ òkù ịbịa Ememe Ncheta.
10 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Na-enyefe Magazin Mgbe Ị Na-eje Ozi.”d Mgbe a na-atụle paragraf nke 3 na nke 4, kwuo ụzọ a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ n’ókèala unu. N’ụzọ dị nkenke, gbaa otu onye nkwusa ma ọ bụ abụọ ajụjụ ọnụ bụ́ ndị na-eme nke ọma n’inyefe magazin n’ógbè azụmahịa, n’okporo ámá, n’ebe ndị mmadụ na-anọkarị, ma ọ bụ n’oge ha na-anọghị n’ozi. Gwa ha ka ha kọọ otú ha si enyefe magazin n’ebe ndị a. Mee ka e mee ihe ngosi dị mkpirikpi nke ebe a na-enyefe magazin ma ọ bụ ihe ngosi nke ahụmahụ e nwerela n’inyefe magazin.
Abụ nke 192 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite March 7
Abụ nke 12
5 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.
40 min: “Mgbakọ Distrikti Na-akpali Anyị Iso Chineke Na-eje Ije.” Ọ bụ okenye ga-eme ya. Mgbe e kwusịrị okwu mmeghe ga-ewe otu minit ma ọ bụ ihe na-erughị ya, duzie mkparịta ụka ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ na ya bụ́ nke ga-adabere n’usoro ihe omume mgbakọ distrikti. A ga-eji ajụjụ ndị dị n’isiokwu ahụ mee ihe. Kee oge eke iji nwee oge zuru ezu maka ajụjụ nke ọ bụla, ikekwe na-anabata nanị otu azịza maka ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị ahụ. Ọ bụghị akụkụ Akwụkwọ Nsọ nile e zoro aka na ha ka a ga-enwe ike ịgụ n’oge e wepụtara; e depụtara ha iji mee ka ọ dị mfe ịchọta azịza nke ajụjụ ndị ahụ. Azịza ndị a ga-enye kwesịrị ilekwasị anya n’uru itinye ihe ndị a mụtara n’ọrụ bara.
Abụ nke 165 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
d Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.