Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ a ga-enyefe na July ruo September: A pụrụ iji nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ nwere peeji dị 32 mee ihe: Aha Nsọ Ahụ Nke Ga-adịru Ebighị Ebi, Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ? Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. A pụrụ inyefe broshuọ bụ́ Akwụkwọ Dịịrị Mmadụ Nile, Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke!, na Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? n’ebe o kwesịrị. October: Magazin Ụlọ Nche na Teta! Ebe e gosiri mmasị, nyefee broshuọ Na-achọ, na-etinye mgbalị pụrụ iche ịmalite ọmụmụ Bible.
◼ Malite n’izu nke September 16, 2002, anyị ga-amụ Amụma Aịsaịa—Ìhè nke Dịịrị Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ II n’Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ.
◼ Malite na September, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị ga na-ekwu okwu ihu ọha isiokwu ya bụ “Chebe Ihe E Ji Mara Gị Dị Ka Onye Kraịst!”