Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite June 10
Abụ nke 58
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Gbaa mmadụ nile ume ikiri vidio bụ́ Our Whole Association of Brothers iji kwadebe maka mgbe a ga-atụle ya ná Nzukọ Ije Ozi n’izu nke June 24. Site n’iji aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 eme ihe, mee ihe ngosi dị iche iche banyere ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke June 15 na Teta! nke July 8 n’ihu mmadụ. Mgbe ị na-enyefe Teta! nke July 8 jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ a tụrụ aro ya mee ihe. N’ihe ngosi nke ọ bụla, gosi ụzọ dị iche nke isi zaghachi n’okwu pụrụ igbochi nkwurịta okwu nke bụ́ “Enweghị m mmasị n’okpukpe.”—Lee akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible, peeji nke 9.
10 min: Igbe Ajụjụ. Gụpụta igbe ajụjụ ahụ dum na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e zoro aka na ha. Gbakwụnyezie okwu ndị ọzọ, na-akọwakwu isi ihe ndị ọzọ dị n’Igbe Ajụjụ dị n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1998.
20 min: “Ịgha Mkpụrụ n’Ụba Na-eweta Ngọzi Bara Ụba.”a Gbakwụnye okwu ndị ọzọ na-adabere n’Ụlọ Nche nke December 1, 1992, peeji nke 15-16, paragraf nke 14-17.
Abụ nke 220 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 17
Abụ nke 136
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Nwee Afọ Ojuju n’Ihe I Nwere.”b Mesie akụkụ Akwụkwọ Nsọ ebe ndụmọdụ ahụ dabeere ike, gụọ ma tụlee ọtụtụ n’ime akụkụ Akwụkwọ Nsọ e zoro aka na ha dị ka oge e nwere si dị.
Abụ nke 197 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite June 24
Abụ nke 52
8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Di na nwunye na-ejekọ ozi ọnụ emee ihe ngosi nke ụzọ isi jiri aro ndị a tụrụ na peeji nke 4 nyefee magazin nke July 1 na July 8. Nwunye enyefee Ụlọ Nche, di enyefeekwa Teta! na-eji ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ a tụrụ aro ya eme ihe.
12 min: Kọọ ma ọ bụ gosi otú ahụmahụ nke ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ unu nwere si mee, bụ́ ndị (1) na-agbara agbụrụ dị iche iche ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ndị ọzọ àmà ma ọ bụ (2) na-agba àmà n’ọnọdụ ndị ọzọ na-abụghị ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ na ịrụ ọrụ n’okporo ámá. Iji kwadebe maka Nzukọ Ije Ozi n’izu na-abịanụ, gbaa mmadụ nile ume ịkwadebe otu ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ha ga-eji mee ihe n’inyefe otu n’ime broshuọ ndị a ga-enyefe na July na August.—Lee igbe bụ́ “Akwụkwọ Ndị Ọzọ,” n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke January 2002.
25 min: “Ihe Mere Anyị Ji Hụ Òtù Ụmụnna Anyị Dum n’Anya.” Gaa ozugbo ná ntụle nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ nke vidio bụ́ Whole Association, na-eji ajụjụ ndị e depụtara eme ihe. N’ọnọdụ ya, tụlee “Ezi Ofufe Na-eme Ka Ndị Mmadụ Dị n’Otu.” Okwu onye okenye ga-ekwu nke dabeere n’Ụlọ Nche nke September 15, 2001, peeji nke 5-7.
Abụ nke 95 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite July 1
Abụ nke 83
15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka June. Gwa ndị nkwusa ka ha kwuo broshuọ ha na-eme atụmatụ inyefe na July nakwa ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke ha ga-eji mee ihe.
15 min: Ị Pụrụ Ịbụ Enyi Chineke! Okwu na mkparịta ụka nke ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Kọwapụta ihe dị iche iche dị na broshuọ a nke mere ka ọ bụrụ ngwá ọrụ dị irè iji nyere ụmụaka nakwa ndị ọzọ na-agụghị oké akwụkwọ ma ọ bụ ndị na-amachaghị agụ ihe aka ịmụta banyere Jehova. Tụlee ihe atụ dị iche iche nke nkọwa ndị dị mfe na ndị ezi uche dị na ha ọ na-enye. (Lee ihe ọmụmụ nke 2, 8, na 12.) Gosi otú a pụrụ isi jiri ihe osise ndị dị na ya ruo n’obi onye a na-amụrụ ihe. Tụọ aro ụzọ dị iche iche a pụrụ isi jiri broshuọ a mee ihe nke ọma. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị iso ụmụ ha ndị dị obere mụọ ya. Gbaa mmadụ nile ume inyefe ya n’ozi mgbe ọ bụla o kwesịrị ekwesị.
15 min: “Ị̀ ‘Chọrọ’ Inyere Ndị Ọzọ Aka?”c Gbaa mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ume inwe mmụọ nke inye aka.
Abụ nke 156 na ekpere mmechi.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.
c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.