Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/02 p. 2
  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
  • Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite January 14
  • Izu Na-amalite January 21
  • Izu Na-amalite January 28
  • Izu Na-amalite February 4
Ozi Alaeze Anyi—2002
km 1/02 p. 2

Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi

Izu Na-amalite January 14

Abụ nke 3

13 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị.

22 min: Irite Uru Site ná Ndokwa Obiọma. Okwu okenye ruru eru ga-ekwu, na-atụle ndokwa ndị e meworo iji nyere anyị aka mgbe anyị na-eme mkpebi ndị metụtara ahụ́ ike, dị ka kaadị Advance Medical Directive/Release, Identity Card maka obere ụmụaka a na-emebeghị baptizim nke Ndịàmà e mere baptizim, na Ụlọ Nche, “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ,” June 15, 2000, na October 15, 2000. Ọgbakọ kwesịrị inwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke kaadị Advance Medical Directive/Release na Identity Card. A ga-eme ka ndị nkwusa e mere baptizim nweta kaadị a ma a gbasasịa nzukọ n’uhuruchi a, ma E KWESỊGHỊ idejupụta ha n’uhuruchi a. Ịbịanye aka, ịgba akaebe, na ide akara ụbọchị n’ime kaadị nile ga-abụ ma e nwechaa Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na-esonụ, site n’enyemaka nke onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ, n’ebe ọ dị mkpa. Ndị na-abịanye aka dị ka ndị akaebe kwesịrị ịhụ n’ezie mgbe onye nwe kaadị ahụ na-abịanye aka na ya. Ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim pụrụ idejupụta ntụziaka nke ha na ụmụ ha site n’ime ka okwu sitere na kaadị ndị a kwekọọ n’ọnọdụ ha na n’ihe ha kwenyere. Mee ka ọ pụta ìhè bụ́ amamihe dị n’ibu ụzọ mee mkpebi ndị metụtara ahụ́ ike na-adabere n’akọ na uche ha e ji Bible zụọ.—Ilu 14:15; 27:12.

Ọ dị oké mkpa ibu ụzọ soro onye ọrụ ahụ́ ike kwurịta okwu, na-akọwa n’ụzọ doro anya usoro ọgwụgwọ na ọgwụ ndị ị na-anabata. Ọ chọrọ ọmụmụ ihe onwe onye e ji nlezianya nwee ka e wee nwee ike ime mkpebi ndị kwesịrị ekwesị. Gụọ paragraf ndị kwesịrị ekwesị n’isiokwu Ụlọ Nche ndị a kpọtụrụ aha n’elu. Ndị okenye dị njikere inye aka ma ha apụghị imere ndị ọzọ mkpebi. Kọwaa ụzọ ndị mmadụ pụrụ isi nye mkpebi ya ndị e edeturu edetu.

10 min: “Ihe A Ga-ekwu Banyere Magazin Ndị Ahụ.” Ihe ngosi nke ụzọ isi chee Ụlọ Nche nke January 15 n’ihu mmadụ ma jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke mbụ sitere na Teta! nke February 8 mee ọzọ. Gbaa ndị nkwusa nile ume ịkwado Ụbọchị Magazin.

Abụ nke 55 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 21

Abụ nke 104

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Tụlee igbe bụ́ “Wepụta Ihe Iche.”

13 min: Ị̀ Na-enyocha Akwụkwọ Nsọ Kwa Ụbọchị? Nkwurịta okwu ezinụlọ. Iji mụbakwuo uru ha na-erite site n’ịtụle ihe mmụta dịịrị ụbọchị, ha atụlee Ụlọ Nche nke December 15, 1996, peeji nke 18, paragraf nke 13-14. Tụleghachi ná mkpirikpi, ihe mmụta dịịrị ụbọchị abụọ ma ọ bụ atọ bụ́ ndị a tụlere n’oge na-adịbeghị anya, ma kọwaa otú ihe ọmụma ndị dị na ha si baa uru karịsịa. Mee ka ọ pụta ìhè na ndokwa a kwesịrị ịbụ otu akụkụ nke usoro ọmụmụ Bible ezinụlọ bụ́ nke a na-emechi anya, nke e mere iji mee ka ha na-arụsi ọrụ ike n’ụzọ ime mmụọ.

22 min: “Na-ebute Alaeze ahụ Ụzọ.”a Gbakwụnye ajụjụ ole na ole n’isi ihe ndị sitere n’Ụlọ Nche nke September 1, 1998, peeji nke 19-21.

Abụ nke 168 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite January 28

Abụ nke 196

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara ndị nkwusa ka ha nye akụkọ ozi ubi ha maka January. N’iji aro ndị dị na peeji nke 8 mee ihe, mee ihe ngosi abụọ dị mkpirikpi nke ụzọ iche magazin n’ihu mmadụ, a ga-eji Ụlọ Nche nke February 1 mee otu ma jiri ụzọ iche ihe n’ihu nke abụọ sitere na Teta! nke February 8 mee nke ọzọ. Kwuo akwụkwọ a ga-enyefe na February, kwuokwa akwụkwọ ndị ọgbakọ nwere.

20 min: “Ndị Mụrụ Ụmụ—Na-azụnụ Ụmụ Unu Malite na Nwa Ọhụrụ.”b Gbakwụnye okwu ndị dị n’Ụlọ Nche nke April 15, 1998, peeji nke 32. Kpọọ ndị mụrụ ụmụ ka ha kọọ ihe ọma ha rụzuworo site n’ịmalite ịzụ ụmụ ha n’ụzọ ime mmụọ na nwa ọhụrụ.

15 min: Mkpa ọgbakọ. Kpọọ ndị nkwusa ịkọ ahụmahụ ndị ha nweworo n’iji akwụkwọ nta bụ́ Ụzọ Isi Malite ma Na-aga n’Ihu ná Nkwurịta Okwu Bible eme ihe, n’inyefe broshuọ ụfọdụ kpọmkwem iji zaa ajụjụ ndị mmadụ, ma ọ bụ n’inye nkasi obi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ site na broshuọ bụ́ Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ. Ikekwe mee otu ihe ngosi ma ọ bụ abụọ nke ahụmahụ ndị ahụ.

Abụ nke 202 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite February 4

Abụ nke 212

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ.

17 min: “Olee Otú Ha Ga-esi Anụ?”c Mee ka ndị na-ege ntị kwuo otú akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ si daba adaba. Gbakwụnye ajụjụ ndị e nwere maka paragraf nke 17-18 bụ́ ndị dị na peeji nke 20 n’Ụlọ Nche nke August 15, 1998.

20 min: “Ụzọ Iche Ihe n’Ihu Mmadụ n’Ozi Ubi Bụ́ Ndị A Tụrụ Aro Ha.” Okwu a ga-eso ndị na-ege ntị tụlee nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Ihe ntinye a nwere ụzọ iche ihe n’ihu ndị a tụworo aro ha ná mbipụta ndị gara aga nke Ozi Alaeze Anyị, nweekwa ụfọdụ ndị ọhụrụ. N’ebe ndị a na-edeghị ihe, a pụrụ idepụta aro ndị ọzọ ga-apụta n’ọdịnihu bụ́kwa ndị dị irè n’ókèala unu. Kpọọ ndị na-ege ntị ka ha kọọ ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị kasị amasị ha nakwa ihe mere ha ji amasị ha. Jiri otu ma ọ bụ abụọ ndị a pụrụ iji mee ihe n’inyefe akwụkwọ a ga-enyefe na February mee ihe ngosi. Gbaa ndị nkwusa nile ume ichekwa ihe ntinye a ma na-atụle ya mgbe mgbe n’oge ha na-akwadebe ozi.

Abụ nke 224 na ekpere mmechi.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

b Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

c Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya