Usoro Ihe Omume Maka Nzukọ Ije Ozi
Izu Na-amalite August 14
Abụ nke 114
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu banyere akụkọ ozi ubi nke April maka mba a na ọgbakọ unu. Nanị ngwụsị izu abụọ fọdụrụ n’August, n’ihi ya gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi tupu ọnwa agwụ. Tụleghachi ndokwa e mere maka nzukọ ije ozi ubi ná ngwụsị izu.
15 min: “Na-agbasi Mgba Ọma nke Okwukwe Ike.” Mee ka okwu mmeghe ghara iru otu minit, jirikwa ntụle ajụjụ na azịza sochie ya. Wetakwuo okwu site n’akwụkwọ Ozi Anyị peeji nke 44-45, banyere otú ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ si ahazi ọrụ ije ozi ubi maka ìgwè ha ma na-elebara ndị ọ bụla chọrọ enyemaka iji kere òkè na iji na-enye akụkọ ozi ha mgbe nile anya.
18 min: Otú Ị Pụrụ Isi Rite Uru Site n’Ịga Akwụkwọ. Otu nna agwa ụmụ ya okwu iji nyere ha aka ịghọta ihe mere agụmakwụkwọ ụwa ji baa uru. (Lee akwụkwọ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, peeji nke 133-139.) Ọtụtụ ndị ntorobịa na-eche na ịga akwụkwọ n’etiti ọha mmadụ nke taa na-akpa aghara bụ ezigbo ihe ịma aka. Ọ na-agwụkwa ha ike, ha na-ekwubi na ihe ha na-amụta agaghị abachara ha ezigbo uru. Nna ahụ atụleghachi ụkpụrụ ndị dị n’Akwụkwọ Nsọ na ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ mere o ji bụrụ ihe amamihe dị na ya inweta ókè kwesịrị ekwesị nke agụmakwụkwọ ụwa. Ọ gbaa ụmụ ya ume ịmụ ihe nke ọma na ịṅa ntị na klas.
nAbụ nke 127 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 21
Abụ nke 143
12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego. Mee otu ihe ngosi ije ozi ubi a mụgharịrị nke ọma nke na-egosi ụzọ isi zaa ajụjụ bụ́: “N’ihi gịnị ka Chineke nke ịhụnanya ga-eji kwere ka ahụhụ dịtee aka otú a?” (Akwụkwọ Reasoning, peeji nke 395-396) Gbaa mmadụ nile ume ikere òkè n’ozi ná ngwụsị izu a.
8 min: Oge Anyị Pụrụ Iche. Okwu okenye ga-ekwu, nke dabeere n’Ụlọ Nche nke November 15, 1996, peeji nke 22-23.
25 min: “Ị̀ Na-erite Uru?” Ajụjụ na azịza.
Abụ nke 152 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite August 28
Abụ nke 165
10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka August. Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ kwesịrị ịjụta onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha ka e wee nwee ike ịchịkọta akụkọ ozi nile mgbe ọ na-erule September 6.
15 min: Mkpa ọgbakọ.
20 min: “Nzukọ Na-abara Ndị Na-eto Eto Uru.” Ntụle ajụjụ na azịza nke okenye ga-eduzi. Mgbe a na-atụle paragraf nke 8, tụlee ihe ụfọdụ ndị dị irè na-eme ka e tinye uche n’ihe ma gekwuo ntị nke ọma ná nzukọ. (Lee Teta!, October 8, 1998 peeji nke 25-26.) Gbaa ndị nne na nna ume ịkwụsi ike n’ime ka ụmụ ha na-agachi nzukọ nile anya.—Lee ahụmahụ dị n’Ụlọ Nche nke September 1, 1997, peeji nke 25.
Abụ nke 176 na ekpere mmechi.
Izu Na-amalite September 4
Abụ nke 196
5 min:Ịma ọkwa ọgbakọ.
15 min: “Na-agha Mkpụrụ n’Ụba Kama Jiri Nghọta.” Ntụle ajụjụ na azịza. Mee ka okwu ndị ga-ekwesị ekwesị karịsịa n’ókèala unu pụta ìhè. E kwesịrị ịtụleghachi aro ndị a ná nzukọ maka ozi ubi ná ngwụsị izu a.
25 min: “Ị̀ Na-atachi Obi?” Okwu na ntụle ndị na-ege ntị ga-etinye ọnụ. Gbaa mmadụ nile ume ịtụgharị uche n’ihe ịga nke ọma ha nweworo n’onwe ha n’igosipụta ntachi obi n’ozi ndị Kraịst. Ọ bụrụ na adịghị ike apụta ìhè, ọ dị mkpa iwusi onwe anyị ike n’ụzọ ime mmụọ. Gụnye okwu sitere n’Ụlọ Nche nke October 1, 1999, peeji nke 20-21, paragraf nke 17-21. Kpọọ ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ, bụ́ ndị jiworo ikwesị ntụkwasị obi tachie obi ruo ọtụtụ afọ òkù ka ha kọọ ihe ha na-eme iji nọgidesie ike.
Abụ nke 206 na ekpere mmechi.