Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 6/97 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka June

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka June
  • Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite June 2
  • Izu Na-amalite June 9
  • Izu Na-amalite June 16
  • Izu Na-amalite June 23
  • Izu Na-amalite June 30
Ozi Alaeze Anyi—1997
km 6/97 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka June

Izu Na-amalite June 2

Abụ 181

8 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kwuo okwu banyere akụkọ ozi ubi March maka mba a na maka ọgbakọ unu.

15 min: “Mee Ihe Nile I Nwere Ike Ime.” Ajụjụ na azịza.—Leekwa Ụlọ Nche, April 15, 1993, peji nke 28-30.

22 min: “Ihe Ọmụma Sitere n’Aka Chineke Na-aza Ọtụtụ Ajụjụ.” Onye isi oche esoro ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ, gụnyere onye ntorobịa, kwurịta isiokwu ahụ. Kwuo okwu na paragraf nke 1, na-emesi ike ihe mere akwụkwọ Ihe Ọmụma ji dị irè otú a n’inyere anyị aka ịza ajụjụ. Mee ihe ngosi nke nnọkọ mmụgharị ihe, tụọkwa aro ihe ndị a pụrụ imeziwanye mgbe e mesịrị ihe ngosi nke ọ bụla.

Abụ 200 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 9

Abụ 215

7 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụọ aro isi ihe maka nkwurịta okwu ndị dị na magazin ndị ọhụrụ.

20 min: “Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile.” Ajụjụ na azịza. Tụlee nanị paragraf nke 1-15. Gụpụta paragraf nke 3 na nke 5. Gụnye ahụmahụ si n’ógbè unu nke ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịgba àmà okporo ámá ma ọ bụ n’ụgbọ njem ọha na eze.

18 min: Izi Ndị Ọzọ Ihe—Mkpa Dị Ngwa. Okwu onye okenye ga-ekwu. Tụleghachi akụkọ ozi ụwa nile nke 1996 na peji nke 33 nke 1997 Yearbook. Mgbalị e mesiwanyere ike ịgbara ndị mmadụ àmà n’ebe ọ bụla a pụrụ ịhụ ha na-amịta mkpụrụ. Mkpa dị ngwa e nwere ugbu a bụ isochi akwụkwọ ndị e tinyere na izi ndị mmadụ eziokwu ahụ. Mgbe anyị zutere ha n’ebe ọha na eze na-anọ, jiri akọ jụta aha na adres ha ka e wee nwee ike ime nletaghachi. Ọ dị mkpa anyị ime ihe karịrị ịkụ mkpụrụ Alaeze; anyị aghaghịkwa ịkwọsa ya mmiri. (1 Kọr. 3:6-8) Mgbe a kụrụ mkpụrụ n’ala dị mma, izi ihe dị mma pụrụ inyere onye ahụ aka ịghọta ya. (Mat. 13:23) Anyị kwesịrị ikere òkè n’ụzọ zuru ezu na n’ụzọ dị nkà ruo n’ókè o kwere mee n’ọrụ izi ihe ahụ. (Hib. 5:12a) Webata isi ihe ndị sitere n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke June 1996, paragraf nke 25-26. Kwusie okwu ike n’ịgbalịsi ike ịmalite ọmụmụ ihe na broshuọ Na-achọ ma ọ bụ n’akwụkwọ Ihe Ọmụma.

Abụ 204 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 16

Abụ 171

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego.

20 min: “Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile.” Ajụjụ na azịza. Tụlee paragraf nke 16-33. Gosi otú a pụrụ isi jiri aro ndị ahụ mee ihe n’ógbè unu. Mee ihe ngosi nke paragraf nke 22-24. Gụpụta paragraf nke 33.

15 min: Ịmata Okpukpe Gị Dị Ka nke Eziokwu Ma Ọ Bụ nke Ụgha. Otu okenye ebute ụzọ ná nkwurịta okwu nke ndị nkwusa abụọ ma ọ bụ atọ ruru eru, nke dabeere na Teta!, December 22, 1989 (Bekee), peji nke 18. A na-akpọtụrụ ọtụtụ ndị yiri ka ha nwere mmasị ugboro ugboro. Otú ọ dị, ha anakweretụbeghị ọmụmụ Bible. Tụlee otú a pụrụ isi jiri isi ihe ndị dị na Teta! a mee ka ha mata banyere mkpa ọ dị ime ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ezi ihe ọmụma. Zoo aka n’isi ihe ndị dị mkpa dị n’akwụkwọ Ihe Ọmụma, isi nke 5: “Ofufe Ole Ndị Ka Chineke Na-anakwere?” Gụpụta paragraf nke 20. A pụrụ ime nletaghachi na nke ndị dị otú ahụ iji gbaa ha ume n’ụzọ obiọma na n’ụzọ akọ ịnakwere ọmụmụ ihe na ịga nzukọ.

Abụ 201 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 23

Abụ 193

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Kọwapụta ndokwa ozi ubi maka ngwụsị izu.

15 min: Gịnị Ka Ha Na-ekwu Banyere Anyị? Okwu nke dabeere n’ihe ọmụma dị na Watch Tower Publications Index 1986-1995, peji nke 341-343. Họrọ “Statements by Others” (Okwu Ndị Ọzọ Na-ekwu) ndị pụtara ìhè banyere Ndịàmà Jehova—àgwà anyị na ọrụ anyị. Gosi otú ndị ọzọ siworo nwee mmetụta dị mma banyere ihe ha na-ahụ n’ebe anyị nọ. Kọwaa ihe mere nke a kwesịrị iji kwalie anyị ịdị na-eduzi onwe anyị mgbe nile n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ịnọgidesi ike n’ọrụ anyị. Kọwapụta ụzọ isi jiri okwu ọma ndị ahụ mee ihe mgbe a na-agwa ndị anyị maara na ndị nwere mmasị bụ́ ndị chọrọ ịmatakwu banyere anyị okwu.

20 min: “Ndị Mụrụ Ụmụ—Zụọnụ Ụmụ Unu Ime Nkwusa.” Ajụjụ na azịza. Gụnye nduzi dị n’akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 100, n’okpuru isiokwu nta bụ́ “Inyere Ndị Na-eto Eto Aka.”

Abụ 211 na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite June 30

Abụ 197

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Chetara mmadụ nile inye akụkọ ozi ubi ha maka June.

20 min: “Ndị Ntorobịa—Gịnị Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ Ime Mmụọ Unu?” Ndị nna abụọ akparịta isiokwu ahụ. Ha atụlee ụzọ isi nyere ụmụ ha aka ịghọta ihe mere o ji dị mkpa isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke, bụ́ ndị ga-eweta ngọzi ime mmụọ, kama ịchụso ọdịmma ihe onwunwe.—Leekwa akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 116-118.

15 min: Ịkwadebe Maka Akwụkwọ A Ga-enyefe na July. Họrọ otu broshuọ ma ọ bụ abụọ bụ́ ndị e nweworo mmasị na ha n’ógbè unu, tụleghachikwa ụfọdụ n’ime isi ihe ndị pụtara ìhè banyere nke ọ bụla. Tụọ aro ụzọ ndị a pụrụ isi webata ndị a n’ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ. Chetara mmadụ nile inwe ihe ndekọ nke akwụkwọ ndị e tinyere, na ịlaghachi ma zụlite mmasị ahụ.

Abụ 109 na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya