Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 8/96 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Nwee Ihe Ịga nke Ọma n’Ikwu Okwu n’Ihu Ọha?
    Teta!—2004
  • Nye Chineke Otuto—Ọ Bụghị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • “Ndị Nkwusa Alaeze Na-anụ Ọkụ n’Obi” Ejiri Ọṅụ Gbakọta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 8/96 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Gịnị ka e kwesịrị ime mgbe ọkà okwu e kenyere inye okwu ihu ọha na-eruteghị n’oge maka nzukọ ahụ?

Mgbe mgbe, ọnọdụ ndị a na-apụghị izere ezere ga-eme ka nwanna ghara irute n’oge ikwu okwu ya nke e mere ndokwa ya. Ọ bụrụ na e nwere ihe mere a ga-eji kweta na ọ ga-erute n’oge na-adịghị anya, ndị okenye pụrụ ikpebi iji Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche gaa n’ihu; Nzukọ Ihu Ọha pụrụ isochizi. Gịnị ma o yie ka ọkà okwu ahụ agaghị abịa? Ikekwe otu n’ime ndị ọkà okwu e nwere n’ọgbakọ pụrụ inye okwu nke ọ kwadowororịị.

Atụmatụ e ji nlezianya mee n’oge na-egbochikarị nsogbu a. Onye nchịkọta okwu ihu ọha kwesịrị ịkpọtụrụ ọkà okwu nke ọ bụla ma ọ dịghị ihe ọzọ otu izu tupu oge ya iji chetara ya maka ihe omume ya. Ihe ncheta ahụ kwesịrị ịgụnye oge nzukọ, adres Ụlọ Nzukọ Alaeze, na ntụziaka doro anya nke ụzọ isi chọta ụlọ nzukọ ahụ. Ọkà okwu ahụ aghaghị iji nlezianya detuo ihe ndị a. O kwesịrị iji ihe omume ahụ kpọrọ mkpa, na-eme nhazigharị ọ bụla dị mkpa n’ihe omume onwe ya ka o wee nwee ike imezu ibu ọrụ a. Ọ bụrụ na ihe a na-apụghị izere ezere ebilite nke ga-egbochi ya ime otú ahụ, o kwesịrị ịkpọtụrụ onye nchịkọta okwu ihu ọha ozugbo ka e wee nwee ike ime ndokwa maka onye ọzọ. E kwesịrị ime mgbalị nile iji gbochie ịkagbu ihe mgbe oge rusịworo. Ọ bụrụ na ọ dị ihe na-egbu ọkà okwu ahụ oge, nke ga-emekwa ka ọ bịa minit ole na ole n’azụ oge, ọ pụrụ ịgbalị izigara ndị okenye n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ozi dị ngwa ka ụmụnna wee nwee ike ịmara ihe ha ga-eme.

Obi ekele maka ihe omume okwu ihu ọha, atụmatụ dị mma e bu ụzọ mee na ihe ncheta, na nlekọta e ji nlezianya na-eme pụrụ ime ka e jide n’aka na ọgbakọ ga-enwe ike ịnụ ụtọ okwu ihu ọha bara uru kwa izu.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya