Ịma Ọkwa
◼ Akwụkwọ ndị a ga-enyefe n’August: A pụrụ inyefe nke ọ bụla n’ime broshuọ ndị na-esonụ dị 32 peji n’ụtụ ₦25: Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?, Gịnị Bụ Nzube nke Ndụ?—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chọta Ya?, Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi!, Ì Kwesịrị Ikwere n’Atọ n’Ime Otu?, “Lee! Ana M Eme Ihe Nile Ka Ha Dị Ọhụrụ,” Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ, Mmụọ nke Ndị Nwụrụ Anwụ—Hà Pụrụ Inyere Gị Aka ka ọ̀ bụ Imerụ Gị Ahụ? Hà Dị Adị n’Ezie? na Ọchịchị Ahụ Nke Ga-eweta Paradaịs. September: Bekee—Nlanarị Baa n’Ime Ụwa Ọhụrụ, The Bible—God’s Word or Man’s? Efịk na Hausa—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, True Peace and Security—From What Source? Igbo—Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Irọrọ Uzọ Ndu nke Kachasi Nma, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Isoko—Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala. Yoruba—Happiness—How to Find It, Ibu Nwa-okoro Na Ab̧ọghọ-Gi—Inweta Ihe Kachasi Nma Nime Ya, Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, Ndụ Nka Ọ̀ Bụ Nani Ndu Dinu? October: Ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ magazin abụọ ahụ. November: Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi. A ga-eme mgbalị pụrụ iche iji sochie akwụkwọ nile e tinyere ná nzube nke ịmalite ọmụmụ Bible ebe obibi. RỊBA AMA: Ọgbakọ ndị ga-achọ ihe ndị a ga-akpọsa e depụtara n’elu kwesịrị itinye ọda ha na Literature Order Form (S-14) ha nke ọnwa ọzọ.
◼ A na-ezitere ọgbakọ ọ bụla fọm S-1, S-14, na S-20 maka iji mee ihe n’afọ ije ozi 1997. E kwesịghị imefusị fọm ndị a. E kwesịrị iji ha mee ihe nanị maka nzube e ji mepụta ha.
◼ Ọgbakọ ọ bụla ga-anata fọm Literature Inventory (S-18) atọ. Odeakwụkwọ ọgbakọ na onye na-ahụ maka akwụkwọ kwesịrị izukọ ná mmalite August ma setịpụ ụbọchị maka ime ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere n’ọgbakọ ná ngwụsị ọnwa. A ghaghị ịgụ akwụkwọ nile e nwere ọnụ, a ga-edebakwa ngụkọta ha na fọm Literature Inventory. A pụrụ ịnata ngụkọta magazin ndị e nwere site n’aka onye na-elekọta magazin. Biko zitere Society ibe nke mbụ tupu September 6 agafee. Debe ibe nke abụọ ya na faịlụ unu. A pụrụ iji nke atọ mee ihe dị ka ibe akwụkwọ a ga-eji rụọ ọrụ. Odeakwụkwọ kwesịrị ilekọta ngụkọ ahụ, onye isi oche ndị nlekọta kwesịkwara inyocha fọm ahụ e dejupụtara edejupụta. Odeakwụkwọ na onye isi oche ndị nlekọta ga-abịanye aka na fọm ahụ.
◼ A na-ezitere ọgbakọ ọ bụla fọm S-10 Congregation Analysis Report abụọ. E kwesịrị iji nlezianya dị ukwuu dejupụta fọm nke a ma zitere Society ibe nke mbụ tinyere akụkọ ozi unu nke ọnwa August tupu September 6, 1996, agafee. Ibe ya nke abụọ bụ maka faịlụ unu.
◼ Site n’August 19, 1996, ruo August 30, 1996, Society ga na-eme ngụkọ nke akwụkwọ nile e nwere na Betel dị n’Igieduma. N’ihi ngụkọ nke a, ọ dịghị ọda akwụkwọ ọgbakọ tinyere nke a ga-akwadebe maka ibupụ ya ma ọ bụ ka a bịa buru ya n’ụbọchị ahụ. Otú ọ dị, ebe nnabata ụlọ obibi akwụkwọ ga-eghe oghe n’oge a, ị pụkwara iji ego zụrụ akwụkwọ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ.
◼ Society nwere ugbu a nọmba telifon ọhụrụ nke ga-enyere anyị aka nke ukwuu ná nkwurịta okwu telifon. Nọmba ọhụrụ ahụ bụ 052-257767. Nke a bụ tụkwasị na nọmba ndị a nọwororịị na-eji eme ihe, ndị bụ 055-98023, 055-98033, 055-98051, 055-98052, na 01-821423 (Ebe Ndọba Akwụkwọ Lagos).