Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/96 p. 2
  • Nzukọ Ije Ozi Maka April

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nzukọ Ije Ozi Maka April
  • Ozi Alaeze Anyi—1996
  • Isiokwu Nta
  • Izu Na-amalite April 1
  • Izu Na-amalite April 8
  • Izu Na-amalite April 15
  • Izu Na-amalite April 22
  • Izu Na-amalite April 29
Ozi Alaeze Anyi—1996
km 4/96 p. 2

Nzukọ Ije Ozi Maka April

Izu Na-amalite April 1

Abụ 132 (70)

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ịma Ọkwa ndị a họtara n’Ozi Alaeze Anyị. Kọọ akụkọ ọ bụla pụrụ iche banyere Ememe Ncheta unu. Ọzọ, dọrọ uche gaa n’isiokwu bụ́ “Na-aba Ụba n’Ezi Ihe Ọmụma,” ma mesie ike mkpa ọ dị ịgachi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ anya.

18 min: “‘Na-anụrụ Ọrụ Ọma Ọkụ’ n’April!” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 1-10 nke onye nlekọta ije ozi ga-eme. Kọwaa (1) ihe e mere atụmatụ ya n’ọgbakọ maka ọrụ ije ozi ubi a gbasapụrụ agbasapụ n’April, (2) ụzọ a pụrụ isi nyere mmadụ nile aka ikere òkè, na (3) ụzọ a pụrụ isi gụnye ndị ọhụrụ na ụmụaka.

15 min: “Chọpụta Ndị Nwere Ọnọdụ Uche Ziri Ezi.” Tụlee ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ a tụrụ aro ha, ma mezie ihe ngosi abụọ na-egosi ụzọ a pụrụ isi jiri ha mee ihe. Dị ka oge nyere ohere ya, kwuo aro ụfọdụ a tụrụ maka inyefe magazin, bụ́ ndị a na-ahụ n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1996, peji nke 5.

Abụ 20 (57) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 8

Abụ 72 (58)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ụzọ ndị dị irè anyị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ bịara Ememe Ncheta aka inwekwu ọganihu ime mmụọ. Tụleghachi Ụlọ Nche April 1, 1991, peji nke 9-12.

15 min: “Na-efe Ofufe Dị Nsọ Ehihie na Abalị.” Ajụjụ na azịza. Gụpụta paragraf nke 5 na 6.

15 min: “‘Na-anụrụ Ọrụ Ọma Ọkụ’ n’April!” Ntụle ajụjụ na azịza nke paragraf nke 11-15. Gbaa mmadụ nile ume inyocha ọnọdụ onwe onye ha ma chọpụta ụzọ dị iche iche isi mụbaa nkwado ha na-enye ozi ubi.

Abụ 113 (62) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 15

Abụ 133 (68)

12 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Akụkọ ndekọ ego; hota okwu ekele maka onyinye bụ́ ndị sitere n’aka Society. Chetara ndị na-ege ntị banyere okwu ihu ọha pụrụ iche n’April 21, nke isiokwu ya bụ “Ịnọgide Na-abụ Ndị A Na-apụghị Ịta Ụta n’Etiti Ọgbọ Gbagọrọ Agbagọ.” Gbaa ume itinyekwu mgbalị n’inyere onye ọ bụla aka ịbịa.

15 min: “Oge Agbanwewo.” Ajụjụ na azịza. Kwusie okwu ike maka izi ozi Alaeze ahụ n’ụzọ na-ahụ maka mkpa ndị kasị enye ndị mmadụ nsogbu. Tụọ aro isiokwu ụfọdụ nke ezinụlọ na ọha na eze bụ́ ndị dị n’uche ọtụtụ mmadụ, dị ka a rịbara ama n’Ụlọ Nche January 1, 1994, peji nke 22, 23.

18 min: “Okwukwe Si n’Ọnụnụ Pụta.” Tụlee ụzọ a pụrụ isi jiri ntinye magazin wulite mmasị pụrụ iduba n’ọmụmụ Bible n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ihe ngosi abụọ ma ọ bụ atọ nke ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ.

Abụ 204 (109) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 22

Abụ 6 (4)

15 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị n’okwu pụrụ iche e nyere ná ngwụsị izu gara aga. Tụlee ụzọ okwu ndụmọdụ a kwesịrị isi kpalie ndị nwere mmasị iwere nguzo siri ike maka ezi ofufe.

12 min: Igbe Ajụjụ. Okwu onye okenye ga-ekwu. Kọwaa ihe mere ụmụnna na-eduzi ọmụmụ ihe kwesịrị iji zere ọbụbụenyi gabigara ókè site n’ịkpọ ndị mmadụ, na-eji nanị aha aka ha.

18 min: Nkwurịta okwu n’etiti onye okenye na ohu na-eje ozi n’isiokwu a kpọrọ “Ezinụlọ Ndị Na-asọpụrụ Chineke n’Oge Gara Aga—Ihe Nlereanya Maka Oge Anyị,” nke dị na peji nke 20-23 nke mbipụta Ụlọ Nche nke September 15, 1995. Webata okwu n’ụzọ dị irè ka ezinụlọ ndị dị n’ọgbakọ rite uru.

Abụ 143 (76) na ekpere mmechi.

Izu Na-amalite April 29

Abụ 144 (35)

10 min: Ịma ọkwa ọgbakọ. Ụfọdụ na-akọwa Ndịàmà Jehova dị ka “òtù nzuzo,” na-eduhie ndị ọzọ banyere ọrụ na ebumnobi anyị. N’iji akwụkwọ Reasoning, peji nke 202 eme ihe, kọwaa ná mkpirikpi ụzọ isi gbaghaa ebubo a.

10 min: “Nzukọ Ije Ozi Ubi.” Ajụjụ na Azịza. Gụpụta paragraf nile.

12 min: Ịrụzu Ókèala Anyị Ọrụ n’Ụzọ Hà Nhata. Okwu onye nlekọta ije ozi ga-ekwu. E nwere ike ghara ịdị na-arụchi ọrụ anya n’ókèala ndị dịsasịrị adịsasị ma ọ bụ ndị dị anya. Ụfọdụ pụrụ ịmara ụma na-ezere ịrụ ọrụ n’ógbè ebe e nwere ndị ọgaranya ma ọ bụ ebe e ji okpukpe kpọrọ oké ihe. A pụrụ ileghara ókèala achụmnta ego anya. Ụfọdụ ndị nkwusa pụrụ ịrịọ ugboro ugboro ka e nye ha ókèala na-amasịkarị ha kama ndị chọrọ ka a rụzuo ha n’oge ahụ. Gbaa mmadụ nile ume ikwenyere mgbalị ndị a na-eme iji rụzuo ókèala a na-arụbeghị ọrụ. Oge ọkọchị na-enyekarị ohere ọma iji rụọ ógbè ime obodo ndị dị anya; ma eleghị anya a pụrụ ịhazi ìgwè ụgbọ ala dị iche iche. Jide n’aka na a rụzuru ókèala ahụ nke ọma, gụnyere ndị na-anọghị n’ụlọ, tupu e weghachi ya. Tụọ aro ndị ọzọ dị irè na-egosi ụzọ mmadụ nile pụrụ isi nye aka n’ịrụzu ókèala unu n’ụzọ kasị mma.

13 min: Nyefee Ụtụ Ụlọ Nche na May. Nyefee ụtụ Ụlọ Nche. N’ebe a na-anaraghị ụtụ, nyefee broshuọ ọ bụla kwesịrị ekwesị. Mee ihe ndekọ akwụkwọ nile e tinyere, na-eburu n’uche ịmalite ọmụmụ Bible. Mesie ike abamuru na-emetụta ọtụtụ ihe ndị nkesa magazin nwere dị ka otu n’ime ụzọ ndị kasị irè isi wegara ọha mmadụ ozi Alaeze ahụ. Jide n’aka na anyị nwere ụfọdụ mgbe anyị na-aga ozi; nyefee ha n’ohere ọ bụla. Ndokwa onwe onye maka Ụbọchị Magazin kwa izu bụ ụzọ dị mma isi mụbaa ọnụ ọgụgụ a na-etinye. Iji magazin arụ ọrụ ụlọ ahịa ruo ụlọ ahịa na ịgba àmà okporo ámá na-amịkwa mkpụrụ. Jiri nletaghachi ndị a haziri ịmalite ọmụmụ ihe sochie mmasị, na-eji akwụkwọ Ihe Ọmụma. Mee ihe ngosi otu ụzọ isi tinye mbipụta ndị ọhụrụ ma ọ bụ abụọ, ma eleghị anya na-eji ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ ndị a na-ahụ n’Ozi Alaeze Anyị nke March 1996, peji nke 3, paragraf nke 3-5, eme ihe.

Abụ 195 (105) na ekpere mmechi.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya