Isiokwu Ndị Dị na Magazin A
Jenụwarị 15, 2015
© 2015 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
NKE A NA-AMỤ AMỤ
MACH 2-8, 2015
MACH 9-15, 2015
Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs
MACH 16-22, 2015
Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-adịkwu ná Mma ma Na-enwe Obi Ụtọ
MACH 23-29, 2015
Kwee Ka Jehova Mee Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-adị ná Mma ma Ghara Itisa
MACH 30, 2015–EPREL 5, 2015
ISIOKWU NDỊ A GA-AMỤ AMỤ
▪ Na-ekele Jehova Ka Ọ Gọzie Gị
Anyị ga-amụta ịna-ekele Jehova ma ọ bụrụ na anyị na-atụgharị uche n’ihe ọma ndị o meere anyị. Icheta ihe ọma Jehova na-emere anyị ga-eme ka anyị na-ekele ya, nyekwara anyị aka ịna-edi ọnwụnwa ndị bịaara anyị. Isiokwu afọ 2015 ga-eme ka anyị na-echeta ikele Chineke.
▪ Ihe Mere Anyị Ji Eme Ncheta Ọnwụ Jizọs
Isiokwu a ga-eme ka a ghọta ihe mere anyị kwesịrị iji na-aga Ncheta Ọnwụ Jizọs. Ọ ga-akọwa ihe achịcha na mmanya e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs pụtara, kọwaakwa otú mmadụ ga-esi mata ma ò kwesịrị ịta achịcha ahụ, ṅụọkwa mmanya ahụ. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịghọta otú anyị ga-esi kwado maka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị.
▪ Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-adịkwu ná Mma ma Na-enwe Obi Ụtọ
▪ Kwee Ka Jehova Mee Ka Gị na Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-adị ná Mma ma Ghara Itisa
E nwere ọtụtụ nsogbu na ọnwụnwa chọrọ itisa ndị di na nwunye. Ma, n’ike Jehova, di na nwunye nwere ike ịna-adịkwu ná mma, na-enwekwa obi ụtọ. Isiokwu nke mbụ ga-atụle ihe ise ga-enyere di na nwunye aka ịna-adịkwu ná mma ma ghara itisa. N’isiokwu nke abụọ, anyị ga-eleba anya n’ihe di na nwunye ga-eme ka adịm ná mma ha ghara iji nwayọọ nwayọọ na-anyụ ka ọkụ.
▪ Ịhụnanya Ò Nwere Ike Ịdịgide?
Gịnị bụ ezigbo ịhụnanya nwoke na nwaanyị kwesịrị inwe? Ịhụnanya ò nwere ike ịdịgide? Olee otú e si egosi ụdị ịhụnanya ahụ? Isiokwu a ga-eme ka anyị mata ihe Abụ Sọlọmọn na-akụziri anyị gbasara ezigbo ịhụnanya.
ISIOKWU ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
IHE E SERE N’IHU ỤLỌ NCHE A: Ebe ụmụnna ji Baịbụl n’aka na-ezi ozi ọma n’otu ebe mara mma a na-akpọ Grindelwọld. Ihe dị n’azụ ha bụ otu ugwu a na-akpọ Ugwu Ben
SWIZALAND
MMADỤ OLE BI NA YA
7,876,000
NDỊ NKWUSA OLE NỌ NA YA
18,646
NDỊ BỊARA NCHETA ỌNWỤ JIZỌS N’AFỌ 2013
31,980