Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Eprel 15, 2011
Nke a Na-amụ Amụ
ISIOKWU A GA-AMỤ N’IZU:
Mee 30, 2011–Jun 5, 2011
Jiri Ozi Ị Na-ejere Jehova Kpọrọ Ihe
PEEJI NKE 9
Jun 6-12, 2011
Mee Mkpebi Ndị Na-ewetara Chineke Otuto
PEEJI NKE 13
Jun 13-19, 2011
“Mkpụrụ nke Mmụọ Nsọ” Na-ewetara Chineke Otuto
PEEJI NKE 18
Jun 20-26, 2011
Ị̀ Na-ekwe Ka Mmụọ Chineke Na-edu Gị?
PEEJI NKE 23
Ihe Isiokwu Ndị A Ga-amụ Amụ Na-ekwu
ISIOKWU NKE 1 PEEJI NKE 9-13
Ndị Kraịst kwesịrị iji ihe ndị dị mkpa akpọrọ ihe n’agbanyeghị na ụwa ejighị ihe ndị a kpọrọ ihe. Nke a dị mkpa karịchaa mgbe a bịara n’ihe banyere ofufe anyị na-efe Jehova. Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọta ihe anyị kwesịrị ime nakwa ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru banyere otú anyị bụ́ Ndị Kraịst kwesịrị isi jiri ọrụ e nyere anyị kpọrọ ihe.
ISIOKWU NKE 2 PEEJI NKE 13-17
Ime mkpebi na-esiri ọtụtụ ndị ike. Isiokwu a ga-eme ka anyị ghọta ihe mere anyị ji kwesị ịmụta otú anyị ga-esi na-eme mkpebi ndị dị mma. Anyị ga-atụlekwa ihe ndị anyị ga-eme iji hụ na mkpebi ndị anyị na-eme ga-ewetara Chineke otuto.
ISIOKWU NKE 3, 4 PEEJI NKE 18-27
Gịnị bụ “mkpụrụ nke mmụọ nsọ”? Olee ihe anyị ga-eme ka anyị wee nwee ya? Gịnịkwanụ mere anyị ji kwesị inwe ya? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a ka anyị na-atụle ihe itoolu ndị so ná mkpụrụ nke mmụọ nsọ. N’isiokwu a, a tụlekwara ihe ndị ga-enyere ọtụtụ ndị aka inwe mkpụrụ nke mmụọ nsọ.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A
3 Ị̀ Na-aghọta Ihe Ndị Na-egosi na Chineke Na-edu Gị?
6 Otú Ị Ga-esi Na-eme Ihe n’Eziokwu n’Ụwa Ndị Na-anaghị Eme Ihe n’Eziokwu Juru
28 Ì Chetara?