Isiokwu Ndị Dị n’Akwụkwọ A
Ọktoba 15, 2010
Nke A Na-amụ Amụ
ISIOKWU A GA-AMỤ N’IZU:
Nọvemba 29, 2010–Disemba 5, 2010
PEEJI NKE 3
Disemba 6-12, 2010
Burunụ Ụzọ Na-achọ “Ezi Omume Chineke”
PEEJI NKE 7
Disemba 13-19, 2010
Ị̀ Na-ebute Ụzọ n’Ịsọpụrụ Ụmụnna Gị?
PEEJI NKE 16
Disemba 20-26, 2010
Ị̀ Na-eso Eme Ka Ọmụmụ Ihe Na-ewuli Elu?
PEEJI NKE 20
Ihe Isiokwu Ndị A Ga-amụ Amụ Na-ekwu
ISIOKWU NKE 1, 2 PEEJI NKE 3-11
Isiokwu ndị a na-eme ka anyị ghọta otú ịmụta ihe n’aka Jizọs ga-esi mee ka anyị na Jehova dịrị ná mma. Ha na-emekwa ka anyị ghọta ihe ezi omume Chineke bụ, ihe mere anyị ga-eji buru ụzọ na-achọ ya, nakwa ihe mere na anyị ekwesịghị ịtụ anya ka Jehova na-ele ihe anya otú mmadụ si ele ihe anya.
ISIOKWU NKE 3 PEEJI NKE 16-20
Olee ihe ndị ọ ga-abụ anyị na-eme ha egosi na anyị na-asọpụrụ ụmụnna anyị? Olee ihe mere anyị ji kwesị ịna-asọpụrụ ụmụnna anyị? Olee otú onye ọ bụla n’ime anyị nwere ike isi gosi na ya na-ebute ụzọ n’ịsọpụrụ ndị ọzọ? Ndị a bụ ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị a tụlere n’isiokwu a.
ISIOKWU NKE 4 PEEJI NKE 20-25
Isiokwu a na-egosi otú ndị na-eduzi ọmụmụ ihe n’ọgbakọ nakwa ndị na-abịa ọmụmụ ihe nwere ike isi mee ka ọmụmụ ihe na-ewuli ndị niile bịaranụ elu. A tụlekwara ụfọdụ mgbanwe ndị e mere n’Ụlọ Nche n’isiokwu a.
ISIOKWU NDỊ ỌZỌ DỊ N’ỤLỌ NCHE A:
Ịkụdo Ihe Aka—Olee Otú Jehova Si Ele Ya Anya? 12
Nyere Ndị Na-eto Eto Aka Ịma Otú Ihe Si Aga n’Ọgbakọ Jehova 25
Otú M Si Arụsi Ọrụ Ike n’Ọgbakọ Jehova 29
“Ọ Na-enyere M Aka Ime Ka Ozi Ọma Ruo Ndị Mmadụ n’Obi” 32