M Chọtara Ihe Na-eme M Obi Ụtọ ná Ndụ
Dị ka Gaspar Martínez si kọọ
Akụkọ ndụ m bụ akụkọ na-adịghị ogologo, nke bụ́ banyere nwa okorobịa dara ogbenye nke si n’ime obodo gaa n’obodo mepere emepe wee nweta akụ̀. Ma, ị ga-ahụ na akụ̀ m nwetara abụghị kpọmkwem ihe m tụrụ anya ya.
M NỌ n’otu ime obodo ihe na-adịghị, nke aha ya bụ Rioja, too n’ihe dị ka iri afọ asatọ gara aga. Obodo a dị n’ebe ugwu Spen. M kwụsịrị ịga akwụkwọ mgbe m dị afọ iri, ma, amụtala m ịgụ ihe na ide ihe tupu mụ akwụsị. Mụ na ụmụnne m isii ndị ọzọ na-anọ n’ugbo na-elekọta atụrụ anyị ma ọ bụkwanụ na-akọ ihe n’obere ala anyị.
Ogbenye ezinụlọ anyị dara mere ka anyị na-eche na ihe onwunwe dị ezigbo mkpa. Nke ahụ mere ka anyị na-enwere ndị nwere ego anyaụfụ. N’agbanyeghị nke ahụ, bishọp anyị kwuru otu ụbọchị na obodo anyị ‘kacha obodo niile dị na dayọsis ya abịachi chọọchị anya.’ Ma, ọ maghị na ọtụtụ n’ime anyị ga-akwụsị ịga Katọlik ka oge na-aga.
M Malitere Ịchọ Ihe Ka Mma
M lụrụ Mercedes, bụ́ otu nwa agbọghọ onye obodo anyị. Ọ dịghị anya, anyị amụọ nwa nwoke. N’afọ 1957, mụ na nwunye m kwagara Logroño, bụ́ obodo dị nso n’obodo anyị. Ka oge na-aga, ezinụlọ anyị dum kwagara ebe ahụ. M chọpụtara n’oge na-adịghị anya na o nweghị ihe ga-eme ka m na-enweta ego ga-ezuru ezinụlọ m, n’ihi na enweghị m aka ọrụ. Amaghị m ihe m ga-eme eme. M malitere ịchọ ma ò nwere ihe m ga-achọta n’ọ́bá akwụkwọ dị ebe ahụ, n’agbanyeghị na o nweghị ihe m ma m na-achọ.
Ka oge na-aga, m nụrụ na o nwere ụlọ ọrụ redio nke si na post ọfịs ezitere ndị mmadụ ihe ọmụmụ Baịbụl. Ozugbo m gụchara akwụkwọ ndị ha ziteere m, ụfọdụ chọọchị Protestant bịara gwa m ka m bịawa chọọchị ha. Ugboro ole na ole m gara chọọchị ha, m chọpụtara na ndị isi ha na ibe ha na-eserịta okwu. Agaghị m ebe ahụ ọzọ, n’ihi na m kpebiri na okpukpe niile bụ otu.
M Malitere Ịhụ Ụzọ
N’afọ 1964, otu nwa okorobịa aha ya bụ Eugenio bịara na nke anyị. Ọ bụ Onyeàmà Jehova, anụtụbeghịkwa m na e nwere ndị a na-akpọ Ndịàmà Jehova. Ma, enwere m mmasị dị ukwuu ka mụ na Eugenio kwuo banyere ihe dị na Baịbụl. M chere na ama m Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Eji m amaokwu ole na ole m mụtara mgbe a na-ezitere m ihe ọmụmụ Baịbụl na post ọfịs zaa ihe o kwuru. Ọ bụ eziokwu na m gbalịrị igosi ya otú ihe ndị Protestant na-akụziri ndị mmadụ si bụrụ eziokwu, ma, ekwechaghị m na ha bụ eziokwu.
Mgbe mụ na ya kwuru okwu ugboro abụọ, nke wechara anyị ogologo oge, m kwetara na Baịbụl doro Eugenio anya nke ọma. Otú o si achọta ihe na Baịbụl na otú o si akọwa ya n’agbanyeghị na m ka ya mara akwụkwọ, tụrụ m n’anya. Eugenio gosiri m n’ime Baịbụl na anyị bi n’oge ikpeazụ nakwa na Alaeze Chineke ga-eme ka ụwa ghoọ paradaịs n’oge na-adịghị anya. Nke a kpaliri mmasị m.—Ọma 37:11, 29; Aịza. 9:6, 7; Mat. 6:9, 10.
Ekwere m ka ọ mụwara m ihe ozugbo. Ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na anụtụbeghị m ihe niile ọ na-akụziri m, ha rukwara m n’ala ala obi. M malitere inwe olileanya nke na-eme m obi ụtọ ná ndụ. M chọtala ezigbo ihe. Ugbu a, mbọ m na-agba iji nwee ego abaghịzi uru, mgbalị niile m na-agbalị iji nweta ezigbo ọrụ adịkwaghị mkpa. Ebe ọ bụ na ọbụna ọrịa na ọnwụ agaghịzi adị, ọ pụtara na a ga-emeli ka nsogbu ndị ọzọ ghara ịdị.—Aịza. 33:24; 35:5, 6; Mkpu. 21:4.
N’egbughị oge, m malitere ịgwa ndị ezinụlọ anyị ihe ndị m mụtarala. M jikwa obi ụtọ na-agwa ha na Chineke kwere nkwa na ya ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, bụ́ ebe ndị mmadụ, bụ́ ndị na-eme uche Chineke, ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi.
Ndị Ezinụlọ Anyị Anata Eziokwu
N’oge na-adịghị anya, anyị, bụ́ ndị karịrị mmadụ iri na abụọ, kpebiri ịna-ezukọ kwa ehihie Sunday n’ụlọ nwanne papa m iji tụgharịa uche ná nkwa dị iche iche dị na Baịbụl. Anyị na-eji awa abụọ ma ọ bụkwanụ atọ eme nke a kwa izu. Mgbe Eugenio hụrụ na ọtụtụ ndị ezinụlọ anyị nwere mmasị na Baịbụl, o mere ndokwa iji aka ya na-amụrụ ezinụlọ nke ọ bụla ihe.
E nwere ndị ezinụlọ anyị ndị ọzọ bi na Durango, bụ́ obere obodo dị ihe dị ka otu narị kilomita na iri abụọ ma e si n’ebe anyị bi gawa ya. O nweghị Ndịàmà nọ n’ebe ahụ. Ka ọnwa atọ gara, ahapụrụ m ọrụ m wee jiri abalị ole na ole gaa leta ha iji kọọrọ ha ihe m na-amụta na Baịbụl. N’ebe ahụ, anyị, bụ́ ndị dị ihe dị ka mmadụ iri, na-ezukọ kwa mgbede. M na-agwagide ha okwu ruo isi isi ụtụtụ. Obi na-adị ha niile ụtọ ige ntị. Mgbe m chọrọ ịla, m nyere ha Baịbụl ụfọdụ na akwụkwọ ndị e ji amụ ya. Mgbe m lara, mụ na ha nọgidere na-ezirịta ozi.
Mgbe Ndịàmà mechara bịa Durango, bụ́ ebe a na-enwetụbeghị onye ziri ozi ọma, ha hụrụ mmadụ iri na asatọ nwere mmasị ịmụ Baịbụl. Ndịàmà ndị ahụ ji obi ụtọ mee ndokwa ịmalitere ezinụlọ nke ọ bụla ọmụmụ ihe.
Kemgbe ahụ niile, Mercedes enweghị mmasị n’eziokwu n’ihi egwu mmadụ, ọ bụghị n’ihi na o nweghị mmasị na Baịbụl. N’oge ahụ, a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Spen, nke a mere ka o chee na ndị ọchịchị ga-achụ ụmụ anyị abụọ n’ụlọ akwụkwọ nakwa na anyị niile ga-abụ ndị a jụrụ ajụ. Ma, o nwere mmasị ịmụ Baịbụl mgbe ọ hụrụ na ndị ezinụlọ anyị niile anatawala eziokwu.
N’ime afọ abụọ, iri mmadụ anọ n’ezinụlọ anyị ghọrọ Ndịàmà Jehova, e meekwa ha baptizim iji gosi na ha ararala onwe ha nyefee Chineke. Ndị ezinụlọ anyị kpebiri ime otu ihe ahụ m kpebiri ime. M ma na emeela m ihe bara ezigbo uru. Chineke agọziela anyị n’ụba.
M Na-enwekwu Obi Ụtọ Ka M Na-eme Okenye
N’ime afọ iri abụọ, malite mgbe anyị mụrụ ụmụ anyị, m lekwasịrị anya n’ịzụ ha nakwa n’ịrụ ọrụ dị n’ọgbakọ anyị. Mgbe mụ na Mercedes kwagara Logroño, naanị ihe dị ka Ndịàmà iri abụọ nọ n’obodo ahụ, bụ́ ebe ihe dị ka otu narị puku mmadụ bi. N’oge na-adịghị anya, e nyere m ọtụtụ ọrụ n’ọgbakọ.
Mgbe m dị afọ iri ise na isii, ụlọ ọrụ m na-arụ ọrụ mechiri ná mberede m wee bụrụ onye na-enwekwaghị ọrụ. Ọ dịlarị anya ije ozi oge niile gụwara m agụụ, n’ihi ya, m ghọrọ ọsụ ụzọ ozugbo m kwụsịrị ịrụ ọrụ. Ntakịrị ụgwọ ezumike nká a na-akwụ m anaghị ezuru anyị. Mercedes nyeere m aka site n’ịrụ ọrụ nhicha na nzacha. Anyị malitere inweta ihe na-ezuru anyị, ihe ndị dị anyị mkpa akọghịkwa anyị. M ka bụ ọsụ ụzọ, nwunye m na-arụkwa ọrụ ịsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge, izi ozi ọma na-enyekwa ya ọṅụ nke ukwuu.
N’afọ ole na ole gara aga, Mercedes na-enye otu nwa agbọghọ aha ya bụ Merche magazin. Merche mụrụ Baịbụl mgbe ọ bụ nwata. Merche na-eji obi ụtọ agụ akwụkwọ ndị Mercedes na-enye ya. Nke a mere ka Mercedes chọpụta na ọ ka nwere mmasị n’eziokwu dị na Baịbụl. Ka oge na-aga, Merche kwetara ka a mụwara ya ihe, ya amalitekwa inwe ọganihu. Ma, di ya bụ́ Vicente bụ onye aṅụrụma, ọ naghị anọgide n’ọrụ ọ bụla o nwetara. Nke a mere ka ọ ghara ịna-elekọta ezinụlọ ya; oké mmanya ọ na-aṅụ mekwara ka ya na nwunye ya ghara ịdị n’udo.
Nwunye m gwara Merche ka ọ gwa Vicente ka mụ na ya hụ. Mụ na ya mechakwara hụ. M gara leta ya ọtụtụ ugboro tupu ya ekwere ka m mụwara ya ihe. Vicente malitere ịgbanwe nke na e nwere mgbe ọtụtụ ụbọchị gafere ọ na-aṅụghị mmanya. Ka oge na-aga, e nwere mgbe ọ na-aṅụghị mmanya ihe karịrị otu izu. N’ikpeazụ, ya akwụsị imetụ mmanya na-aba n’anya ọnụ. Ihu ya gbanwekwara, ya na ezinụlọ ya amalite ịdị n’otu. Ya na ndị ezinụlọ ya niile, ya bụ, ya na nwunye ya na nwa ya nwaanyị, na-enyere otu ntakịrị ọgbakọ dị na Canary Islands, bụ́ ebe ha bi ugbu a, nnukwu aka.
Icheta Ndụ Dị Mma M Birila
N’agbanyeghị na ụfọdụ n’ime ndị ezinụlọ anyị, bụ́ ndị natara eziokwu ọtụtụ afọ gara aga anwụọla, ezinụlọ anyị na-amụba na-aga, Chineke agọziwokwa anyị nke ukwuu. (Ilu 10:22) M na-enwe obi ụtọ dị ukwuu ma m cheta na ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị ahụ niile malitere ịmụ Baịbụl n’afọ iri anọ gara aga na ụmụ ha, nakwa ụmụ ụmụ ha, ka ji ntụkwasị obi na-efe Jehova!
Ọtụtụ ndị ikwu m, bụ́ Ndịàmà Jehova, bụ ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị ọsụ ụzọ. Diọkpara m na nwunye ya na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Madrid, Spen. E nwere ihe dị ka puku Ndịàmà Jehova atọ na Spen mgbe m ghọrọ Onyeàmà. Ha dị ihe karịrị otu narị puku ugbu a. Ozi oge niile na-enye m obi ụtọ dị ukwuu, m na-ekelekwa Jehova nke ukwuu maka ozi magburu onwe ya m na-ejere ya. Site n’oge ruo n’oge, m na-arụchitere onye nlekọta sekit anyị ọrụ, n’agbanyeghị na agụhighị m akwụkwọ nne.
N’afọ ole na ole gara aga, m chọpụtara na ọ fọrọ ntakịrị ka ọ bụrụ na o nweghịzi onye bi n’obodo ahụ m nọ too. Ịda ogbenye mere ka ndị niile bi ebe ahụ hapụ ugbo ha na ụlọ ha gbaga ebe ha ga-akpata ego. Ma, ọ dị mma ikwu na ọtụtụ n’ime ha, tinyere mụnwa, chọtara ụdị ihe onwunwe ọzọ, ya bụ, ijere Chineke ozi. Anyị chọpụtara na anyị nwere ike inwe obi ụtọ ná ndụ nakwa na ijere Jehova ozi na-eme ka mmadụ nwee ọṅụ na-enweghị atụ.
[Foto dị na peeji nke 32]
Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na ndị niile nọ na foto a bụ ụmụnne Nwanna Martínez, bụ́ ndị nọ n’ọgbakọ