Mpako
Nganga nke ileda ndị ọzọ anya; okomoko; ibuli onwe onye elu. Mpako bụ ihe na-emegide ịdị umeala n’obi. Okwu Grik na Hibru a sụgharịrị ịbụ “mpako” pụtara n’ụzọ bụ́ isi mmadụ ime onwe ya ka o yie “onye dị elu,” “onye e buliri elu,” “onye ka ndị ọzọ elu,” “onye dị mkpa.” N’anya onwe ya, onye dị mpako dị elu karịa ndị ọzọ, bụrụ onye e buliri elu karịa ndị ibe ya. N’ihi ya, onye dị otú ahụ na-achọkarị ka a na-egosi ya nkwanye ùgwù na mmasị na-erughịrị ya ma na-eji enweghị nkwanye ùgwù na nganga emeso ndị ọzọ ihe.
Ọnọdụ nke Obi. Mpako bụ àgwà ọjọọ nke dị omimi karịa ihe mmadụ bu n’uche. Jizọs Kraịst gụkọtara ya na igbu ọchụ, izu ohi, nkwulu, na ihe ọjọọ ndị ọzọ ma sị na ọ bụ “site n’ime, site n’obi ụmụ mmadụ,” ka ihe ndị dị otú ahụ si apụta. (Mak 7:21, 22) Meri, nne elu ala Jizọs, kwuru banyere Jehova, sị: “Ọ chụsasịwo ndị dị mpako n’ebumnuche nke obi ha.” (Luk 1:51) Devid rịọrọ Jehova, sị: “Mkpụrụ obi m adịghị elu.”—Abụ Ọma 131:1; Aịsaịa 9:9; Daniel 5:20.
Ọbụna onye dị umeala n’obi n’ozi ọ na-ejere Chineke pụrụ ịmalite ịdị mpako n’ihi inwe akụ̀ na ụba ma ọ bụ ike, mma elu ahụ́, ihe ịga nke ọma, amamihe ma ọ bụ ịja mma nke ndị ọzọ. Eze Ụzaịa nke Juda bụ onye dị otú ahụ. Ọ chịrị nke ọma ma nwee ngọzi Jehova ruo ọtụtụ afọ. (2 Ihe E Mere 26:3-5) Ma ihe ndekọ Bible na-ekwu, sị: “Ma mgbe ọ dị ike, obi ya dị elu ruo mbibi, o wee mekpuo emekpu megide Jehova, bụ́ Chineke ya; o wee baa n’ụlọukwu Jehova isure ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ n’elu ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.” (2 Ihe E Mere 26:16) Ụzaịa buliri onwe ya elu ịrụ ọrụ ndị nchụàjà, bụ́ ihe ùgwù nke Chineke gosipụtaworo n’ụzọ doro anya na ọ gaghị adịrị ndị eze Izrel, na-eme ka ọrụ onye eze na nke onye nchụàjà dị iche.
N’otu oge, ezi Eze Hezekaịa bịara dịrị mpako n’obi ya ruo nwa oge, o dokwara anya na mpako ya gafekwaara ndị ọ na-achị. E buliri ịchịisi ya elu n’ihi ngọzi Jehova, ma ọ ghọtaghị na ekele nile kwesịrị ịgara Chineke. Onye na-edekọ ihe ndị mere eme dere banyere ya, sị: “Ma ọ bụghị dị ka mmeso e mesoro ya ka Hezekaịa nyeghachiri; n’ihi na obi ya dị elu, iwe wee dịkwasị ya, dịkwasịkwa Juda na Jeruselem.” N’ụzọ na-enye obi ụtọ, o si n’omume a dị ize ndụ chigharịa. Ihe ndekọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Hezekaịa wee ruru ala n’ihi ịdị elu nke obi ya, ya onwe ya na ndị bi na Jeruselem, iwe Jehova abịakwasịghịkwa ha n’ụbọchị Hezekaịa.”—2 Ihe E Mere 32:25, 26; tụlee Aịsaịa 3:16-24; Ezikiel 28:2, 5, 17.
Chineke Na-emegide Mpako. Ọ bụghị nanị na ihe ndị dị mpako adịghị amasị ndị na-eme ihe n’eziokwu, ma nke ka njọ, Jehova Chineke na-emegide ha. (Jems 4:6; 1 Pita 5:5) Mpako bụ ihe nzuzu na mmehie (Ilu 14:3 NW; 21:4), Jehova na-adịkwasịkwa ndị dị elu ka o wee mee ka ha dị ala. (2 Samuel 22:28; Job 10:16; 40:11; Abụ Ọma 18:27; 31:18, 23; Aịsaịa 2:11, 17) Ọ bụrụ na a hapụghị ya, mpako aghaghị ịkpata mbibi. E bibiri mba oge ochie bụ́ Moab, nke weliri onwe ya elu imegide Chineke na ndị ya. (Aịsaịa 16:6; 25:10, 11; Jeremaịa 48:29) Ọbụna a hapụghị alaeze ebo iri nke Izrel mgbe ọ malitere ịdị mpako na nganga n’obi.—Aịsaịa 9:8-12.
Ịnọ na Nche Megide Mpako. N’ihi ya, mmadụ kwesịrị ilezi anya nke ọma ka o wezụga mpako n’obi ya. O kwesịrị ịnọ na nche karịsịa mgbe o nweworo ihe ịga nke ọma n’ihe omume ụfọdụ ma ọ bụ mgbe e nyere ya ọnọdụ dị elu karị ma ọ bụ nke nwere ibu ọrụ ka ukwuu. O kwesịrị iburu n’uche na “n’ihu ntipịa ka mpako na-aga, ọ bụkwa n’ihu ịsụ ngọngọ ka ịdị elu nke mmụọ mmadụ na-aga.” (Ilu 16:18) Ọ bụrụ na ọ hapụ mpako ka o tolite, ọ pụrụ ịmalite ịchịkwa ndụ ya ruo n’ókè na Jehova ga-agụnye ya ná ndị O nyefere n’aka ọnọdụ uche a jụrụ ajụ, ndị kwesịrị ọnwụ. (Ndị Rom 1:28, 30, 32) Nlezianya dị otú ahụ kwesịrị ekwesị karịsịa “n’ụbọchị ikpeazụ,” mgbe, dị ka onyeozi ahụ dọrọ aka ná ntị, mpako ga-abụ otu njimara pụtara ìhè nke oge ahụ pụrụ iche.—2 Timoti 3:1, 2.
Ọzọkwa, onye na-achọ inweta ihu ọma Chineke kwesịrị izere okwu ire ụtọ, nke nwere ike ịzụlite mpako n’ime ndị ọzọ. Ilu na-ekwu, sị: “Nwoke nke na-agwa mmadụ ibe ya okwu ire ụtọ, na-agbasara nzọụkwụ ya nile ụgbụ.” (Ilu 29:5) Ọ bụghị nanị na onye na-ekwu okwu ire ụtọ na-ewetara onye ibe ya mbibi (“ọnụ nke na-ekwu ire ụtọ na-akpata nnuda”; Ilu 26:28) kamakwa ọ na-enweta iwe Chineke. Pọl onyeozi kpachapụrụ anya ka o zere ma okwu ire ụtọ ma mpako.—1 Ndị Tesalonaịka 2:5, 6.