Ụwa nke Mpụ Na-adịghị na Ya n’Ọdịnihu
Ọ BỤRỤ na ị pụrụ, weregodị anya nke uche gị hụ ụwa nke ndị omekome na-adịghị na ya! Ọ gaghị adị mkpa inwe ndị uwe ojii, ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ usoro ikpe na-efu ego na nke tara akpụ. Ọ ga-abụ ụwa ebe onye ọ bụla ga-akwanyere ihe onwunwe na ndụ ndị ọzọ ùgwù. Nke ahụ ò yiri ihe na-apụghị ime eme? Ị pụrụ iche otú ahụ, ma mgbanwe a dị ịtụnanya gaa n’ọnọdụ ka mma bụ nnọọ ihe Bible kwere nkwa ya. Gịnị ma ị tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mpụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị n’ụwa a?
N’akwụkwọ Abụ Ọma, anyị na-agụ, sị: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ. Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo. N’ihi na dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala, ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:1, 2, 11) N’ezie, ọ dịghị onye pụrụ igbochi Chineke imezu nkwa a na nkwa ya ndị ọzọ na-emesi obi ike.
Ihe Chineke ga-eji weta ngọzi ndị a bụ Alaeze ya. N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ka Alaeze a bịa na ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) N’oge na-adịghị anya, n’okpuru Alaeze ahụ, ọ dịghị onye nọ n’ụwa a ga-akpali ime mpụ n’ihi ịda ogbenye, mmegbu, ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Kama nke ahụ, Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) N’ezie, Jehova Chineke ga-enye onye ọ bụla nọ n’ụwa ihe ọma ndị na-adịghị agwụ agwụ. Nke kasị mkpa, ọha mmadụ ga-enwe ịhụnanya dị omimi n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ, a gaghị enwekwa mgbe mpụ ga-enye ụwa nsogbu ọzọ.