Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w03 11/15 p. 32
  • Ụwa nke Mpụ Na-adịghị na Ya n’Ọdịnihu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụwa nke Mpụ Na-adịghị na Ya n’Ọdịnihu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
w03 11/15 p. 32

Ụwa nke Mpụ Na-adịghị na Ya n’Ọdịnihu

Ọ BỤRỤ na ị pụrụ, weregodị anya nke uche gị hụ ụwa nke ndị omekome na-adịghị na ya! Ọ gaghị adị mkpa inwe ndị uwe ojii, ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ usoro ikpe na-efu ego na nke tara akpụ. Ọ ga-abụ ụwa ebe onye ọ bụla ga-akwanyere ihe onwunwe na ndụ ndị ọzọ ùgwù. Nke ahụ ò yiri ihe na-apụghị ime eme? Ị pụrụ iche otú ahụ, ma mgbanwe a dị ịtụnanya gaa n’ọnọdụ ka mma bụ nnọọ ihe Bible kwere nkwa ya. Gịnị ma ị tụlee ihe Akwụkwọ Nsọ na-ekwu banyere mpụ na ihe ọjọọ ndị ọzọ dị n’ụwa a?

N’akwụkwọ Abụ Ọma, anyị na-agụ, sị: “Emela ka iwe gị dị ọkụ n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ. Ekwosola ndị na-eme ajọ omume ekworo. N’ihi na dị ka ahịhịa ka a ga-ebipụ ha ngwa ngwa, dị ka akwụkwọ ahịhịa ndụ ka ha ga-akpọnwụ. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala, ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” (Abụ Ọma 37:1, 2, 11) N’ezie, ọ dịghị onye pụrụ igbochi Chineke imezu nkwa a na nkwa ya ndị ọzọ na-emesi obi ike.

Ihe Chineke ga-eji weta ngọzi ndị a bụ Alaeze ya. N’Ekpere Onyenwe Anyị, Jizọs Kraịst kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ikpe ekpere ka Alaeze a bịa na ka uche Chineke mee “n’ụwa, dị ka ọ na-eme n’eluigwe.” (Matiu 6:9, 10) N’oge na-adịghị anya, n’okpuru Alaeze ahụ, ọ dịghị onye nọ n’ụwa a ga-akpali ime mpụ n’ihi ịda ogbenye, mmegbu, ma ọ bụ ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Kama nke ahụ, Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) N’ezie, Jehova Chineke ga-enye onye ọ bụla nọ n’ụwa ihe ọma ndị na-adịghị agwụ agwụ. Nke kasị mkpa, ọha mmadụ ga-enwe ịhụnanya dị omimi n’ebe Chineke na ndị agbata obi ha nọ, a gaghị enwekwa mgbe mpụ ga-enye ụwa nsogbu ọzọ.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya