Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 3/15 p. 26-28
  • Rashi—Onye A Ma Ama Na-akọwa Bible

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Rashi—Onye A Ma Ama Na-akọwa Bible
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ònye Bụ Rashi?
  • N’ihi Gịnị Ka Nkọwa Ji Dị Mkpa?
  • Ihe Mgbaru Ọsọ na Usoro Ime Ihe Rashi
  • Onye Ọnọdụ Ndị Dị n’Oge Ya Metụtara
  • Olee Otú Rashi Si Metụta Nsụgharị Bible?
  • Ònye Kwesịrị Ka A Kpọọ Ya Rabaị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Gịnị Bụ Ihe Odide Masoret Ahụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọ̀ Dị Mkpa Ka Ị Mụọ Hibru na Grik?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Nsụgharị Bible nke Gbanwere Ụwa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 3/15 p. 26-28

Rashi—Onye A Ma Ama Na-akọwa Bible

OLEE otu n’ime akwụkwọ mbụ e bipụtara n’asụsụ Hibru? Nkọwa banyere Pentateuch (akwụkwọ ise nke Mosis). E bipụtara ya na Reggio Calabria, Itali, na 1475. Ònye dere ya? Ọ bụ otu nwoke a maara dị ka Rashi.

N’ihi gịnị ka a ga-eji asọpụrụ otu nkọwa n’ụzọ pụrụ iche? N’akwụkwọ ya bụ́ Rashi—The Man and His World, Esra Shereshevsky na-ekwu na nkọwa Rashi “ghọrọ akụkụ ihe odide bụ́ isi n’ebe obibi ndị Juu nakwa n’ụlọ ọmụmụ ihe. Ọ dịbeghị akwụkwọ ọzọ n’ime akwụkwọ ndị Juu nke a tụletụworo otú ahụ . . . A maara ihe karịrị nkọwa 200 ndị bụ́ ọkpọka bụ́ ndị na-ekwu kpọmkwem banyere nkọwa Rashi kọwara Pentateuch.”

Ọ̀ bụ nanị ndị Juu ka nkọwa Rashi metụtaworo? Ọ bụ ezie na ọtụtụ mmadụ amataghị ya, nkọwa Rashi banyere Akwụkwọ Nsọ Hibru emetụtawo nsụgharị Bible ruo ọtụtụ narị afọ. Ma ònye bụ Rashi, oleekwa otú o si bịa bụrụ onye a ma ama nke ukwuu?

Ònye Bụ Rashi?

A mụrụ Rashi na Troyes, France, n’afọ 1040.a Dị ka nwa okoro, ọ gara ụlọ akwụkwọ okpukpe ndị Juu dị na Worms na Mainz dị na Rhineland. N’ebe ahụ ọ gụrụ akwụkwọ n’okpuru ndị ọkà mmụta bụ́ ndị Juu a kasị mara amara na Europe. Mgbe ọ gbara ihe dị ka afọ 25, ọnọdụ ya mere ka ọ dị mkpa ka ọ laghachi Troyes. N’ịbụ onye a mataworo dị ka ọkà mmụta pụtara ìhè, ngwa ngwa Rashi ghọrọ onye ndú okpukpe nke ógbè ndị Juu dị n’ebe ahụ ma guzobe ụlọ akwụkwọ okpukpe nke ya. Ka oge na-aga, ebe ọmụmụ ihe ọhụrụ a nke ndị Juu ghọrọ ọbụna nke a ma ama karịa nke ndị nkụzi Rashi dị na Germany.

N’oge ahụ, ndị Juu nọ na France na ndị agbata obi ha bụ́ ndị sịrị na ha bụ ndị na-eso ụzọ Kraịst nọtụ n’udo na nkwekọ, na-eme ka Rashi nwerekwuo onwe ya ịchụso ọrụ nkà mmụta ya. Ma, ọ bụghị ọkà mmụta na-anọpụrụ onwe ya iche. N’agbanyeghị ùgwù ya dị ka onye nkụzi na onyeisi nke ụlọ akwụkwọ ahụ, Rashi nwetara ihe o ji bie ndụ site n’imepụta mmanya. Ihe ọmụma a chiri anya o nwere banyere ọrụ aka a na-arụkarị mere ka ya na ndị Juu nkịtị na-emekọ ihe, na-enyere ya aka ịghọta na ikwekọ n’ọnọdụ ha dị iche iche. Ebe Troyes dị tụnyekwara ụtụ ná nghọta Rashi. N’ịbụ nke dị n’ogologo ụzọ azụmahịa ndị bụ́ isi, ndị si ná mba dị iche iche bijupụtara n’obodo ahụ, nke a mekwara ka Rashi nwee ike ịmata àgwà na omenala nke mba dị iche iche.

N’ihi Gịnị Ka Nkọwa Ji Dị Mkpa?

A maara ndị Juu dị ka ndị gụrụ akwụkwọ. Ma “akwụkwọ ahụ”—Bible—dị n’asụsụ Hibru, “ndị ahụ” na-asụkwa Arabic, French, German, Spanish, na ụba asụsụ ndị ọzọ ugbu a. Ọ bụ ezie na a ka na-akụziri ihe ka ọtụtụ ná ndị Juu asụsụ Hibru site n’oge ha bụ ụmụntakịrị, ha aghọtaghị ọtụtụ okwu Bible nke ọma. Tụkwasị na nke ahụ, ruo ọtụtụ narị afọ otu omume siri ike dị n’ime okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị dugara ụmụ mmadụ ịhapụ inyocha ihe akụkụ ihe odide Bible pụtara n’ụzọ nkịtị. Akụkọ ilu na akụkọ mgbe ochie bụ́ ndị metụtara okwu na amaokwu dị iche iche nke Bible, jupụtara ebe nile. E dekọrọ ọtụtụ nkọwa na akụkọ ndị dị otú ahụ n’ihe odide ndị buru ibu, bụ́ nke a kpọrọ Midrashb n’ozuzu ha.

Nwa nwa Rashi, bụ́ Rabaị Samuel ben Meir (Rashbam), bụkwa ọkà mmụta Bible. Ná nkọwa ya banyere Jenesis 37:2, o kwuru na “ndị nkọwa bu ụzọ [tupu Rashi] . . . nwere ọchịchọ ikwusa ọtụtụ okwuchukwu (derashot), bụ́ nke ha weere dị ka nzube kasị mkpa, [ma] ọ maraghị ha ahụ inyocha ihe akụkụ ihe odide Bible pụtara n’ụzọ nkịtị.” N’ikwu okwu banyere omume a, Dr. A. Cohen (onyeisi ndị nchịkọta akụkọ nke Soncino Books of the Bible) na-ede, sị: “Ọ bụ eziokwu na ndị Rabaị nyere iwu na a gaghị anabata nsụgharị ọ bụla bụ́ nke na-ekwekọghị na peshat ma ọ bụ ihe doro anya akụkụ ihe odide ahụ pụtara; ma n’omume, ha ejighị iwu a kpọrọ oké ihe.” N’ọnọdụ okpukpe dị otú ahụ, obi adịghị esi onye Juu nkịtị ike mgbe ọ na-agụ akụkụ Bible ahụ, ọ na-enwekwa mkpa maka ụfọdụ akwụkwọ nkọwa.

Ihe Mgbaru Ọsọ na Usoro Ime Ihe Rashi

Ihe mgbaru ọsọ ga-adịru ogologo ndụ nke Rashi nwere bụ ime ka akụkụ ihe odide Akwụkwọ Nsọ Hibru bụrụ nke ndị Juu nile ga na-aghọta. Iji mezuo nke a, ọ malitere ịchịkọta akwụkwọ ndekọ ihe ndị kwuru okwu kpọmkwem banyere okwu na amaokwu ndị o chere na ha ga-esiri onye na-agụ ha ike. Ihe Rashi deturu kwuru banyere nkọwa dị iche iche onye nkụzi ya nyere, sitekwa n’ihe ọmụma ya sara mbara banyere ihe akwụkwọ ọgụgụ ndị rabaị metụtazuru. N’inyocha nkà asụsụ, Rashi nyochara ebe nile dịnụ. O tinyere uche n’otú itinye kpọm na akara ụda dị iche iche nke ndị Masorete si emetụta nghọta nke akụkụ ihe odide. Iji mee ka ihe okwu pụtara doo anya, nkọwa ya banyere Pentateuch na-ezokarị aka ná nsụgharị Aramaic (Targum nke Onkelos). Rashi gosipụtara ịdị njikere ime mgbanwe na ịdị nkọ ka ọ na-enyocha ikwe omume ndị dịnụ n’ịkọwa mbuụzọ, njikọ, ihe ngwaa dị iche iche pụtara, na akụkụ ndị ọzọ nke ụtọasụsụ na otú e si ahazi okwu, bụ́ ndị a na-enyochabughị. Nkọwa ndị dị otú ahụ tụnyere ụtụ ndị bara uru n’ịghọta otú e si ahazi okwu na ụtọasụsụ nke asụsụ Hibru.

N’ụzọ dị iche n’ihe a na-emekarị n’okpukpe ndị Juu nke ndị rabaị, Rashi chọrọ mgbe nile ime ka ihe otu akụkụ nke ihe odide pụtara n’ụzọ dị mfe nakwa n’ụzọ nkịtị pụta ìhè. Ma a pụghị ileghara ihe odide sara mbara nke Midrash, bụ́ nke ndị Juu maara nnọọ nke ọma, anya. Akụkụ dị ịrịba ama nke nkọwa Rashi bụ otú o si gosi njikọ dị n’etiti ya na ihe odide Midrash bụ́ nke meworo mgbe mgbe ka ihe akụkụ Bible pụtara n’ụzọ nkịtị ghara ido anya.

Ná nkọwa ya banyere Jenesis 3:8, Rashi na-akọwa, sị: “E nwere ọtụtụ midrash nke akwụkwọ aggadah bụ́ ndị Ndị Amamihe anyị doziwororị n’ụzọ dabara adaba na Bereshit Rabbah na nchịkọta akụkụ ihe odide ndị ọzọ nke midrash. Otú ọ dị, ana m enwe nchegbu banyere ihe amaokwu ahụ pụtara (peshat) kpọmkwem, nakwa banyere aggadot dị otú ahụ dị ka ihe ndekọ Akwụkwọ Nsọ na-akọwa banyere ya.” Site n’ịhọrọ na idetu nanị midrash ndị ahụ bụ́ ndị, n’echiche ya, nyere aka ime ka ihe otu amaokwu pụtara ma ọ bụ ihe ọ na-ekwu banyere ya doo anya, Rashi kachapụrụ, ma ọ bụ wezụga, midrash ndị kpatara enweghị nkwekọ na mgbagwoju anya. N’ihi idetu ihe a, ọgbọ ndị Juu dị n’ihu maara ihe ndekọ Midrash ndị magburu onwe ha nke Rashi karịsịa.

Ọ bụ ezie na ọ na-eto ndị nkụzi ya mgbe nile, Rashi alaghị azụ ịjụ nkọwa ha mgbe o chere na ha megidere echiche doro anya n’akụkụ ihe odide. Mgbe ọ na-aghọtaghị akụkụ okwu ụfọdụ ma ọ bụ chee na ya akọwawo ya n’ụzọ na-ezighị ezi na mbụ, ọ na-adị njikere ịnabata nke a, ọbụna na-akpọtụ aha ọnọdụ ebe ụmụ akwụkwọ ya nyere aka n’ịgbazi nghọta ya.

Onye Ọnọdụ Ndị Dị n’Oge Ya Metụtara

Rashi bụ nnọọ onye kwekọrọ oge ya. Otu onye edemede chịkọtara ya n’ụzọ dị otú a: “Ụtụ dị ukwuu [Rashi] tụnyere ná ndụ ndị Juu bụ nkọwa ọ kọwagharịrị akụkụ akwụkwọ nile dị mkpa gaa n’asụsụ ógbè ahụ bụ́ nke a na-asụ mgbe ahụ, n’asụsụ doro anya, nke a pụrụ ịghọta, na-eji nnọọ ikpo ọkụ na mmetụta, na-eji nkà a na-adịghị ahụkarị nnọọ na nkà mmụta, nke na nkọwa ya ghọrọ nke a na-asọpụrụ dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ na nke a hụrụ n’anya dị ka akwụkwọ ọgụgụ. Rashi ji ịdị nkọ na ụzọ dị mfe dee Hibru dị ka a ga-asị na ọ bụ French. Mgbe ọ bụla ọ na-amaghị okwu Hibru ọ ga-eji mee ihe kpọmkwem, o ji okwu French mee ihe n’ọnọdụ ya, na-asụpe ya ná mkpụrụ akwụkwọ Hibru.” Okwu French ndị a e ji mkpụrụ akwụkwọ Hibru degharịa—Rashi ji ihe karịrị 3,500 n’ime ha mee ihe—aghọwo ebe dị mkpa ụmụ akwụkwọ na-amụ asụsụ na ụzọ e si akpọpụta French Ochie si enweta ihe ọmụma.

Ọ bụ ezie na ndụ Rashi malitere na gburugburu ebe e nwetụrụ ịdị jụụ, afọ ndụ ya ndị sochirinụ hụrụ esemokwu na-arịwanye elu n’etiti ndị Juu na ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst. Na 1096 Agha Ntụte Mbụ wetara mbibi n’ógbè ndị Juu nke Rhineland, bụ́ ebe Rashi mụworo ihe. E gbuchapụrụ ọtụtụ puku ndị Juu. O yiri ka akụkọ banyere mgbuchapụ a nwere mmetụta n’ahụ ike Rashi (bụ́ nke kawanyere njọ ruo n’ọnwụ ya na 1105). Site na mgbe ahụ gaa n’ihu, e nwere mgbanwe pụtara ìhè ná nkọwa ndị o nyere banyere Akwụkwọ Nsọ. Otu ihe atụ pụtara ìhè bụ Aịsaịa isi nke 53, bụ́ nke na-ekwu banyere ohu Jehova na-ata ahụhụ. Na mbụ, Rashi ji akụkụ akwụkwọ nsọ a mee ihe n’ebe Mesaịa ahụ nọ, dị ka Talmud mere. Ma o yiri ka mgbe Agha Ntụte ahụ gasịrị, o chere na amaokwu ndị a metụtara ndị Juu, bụ́ ndị cheworo ntaramahụhụ na-ezighị ezi ihu. Nke a ghọrọ oge oké mgbanwe ná nkọwa ndị Juu banyere akụkụ ihe odide ndị a.c N’ihi ya, akparamàgwà Krisendọm nke na-abụghị nke ndị Kraịst na-echigharị ọtụtụ ndị, gụnyere ndị Juu, pụọ n’eziokwu banyere Jisọs.—Matiu 7:16-20; 2 Pita 2:1, 2.

Olee Otú Rashi Si Metụta Nsụgharị Bible?

Rashi ịbụ onye a ma ama gabigara okpukpe ndị Juu n’oge na-adịghị anya. Onye France so n’òtù Franciscan bụ́ onye na-akọwa Bible bụ́ Nicholas nke Lyra (1270-1349) zoro aka mgbe mgbe n’echiche “Rabaị Solomon [Rashi]” nke na e nyere ya utu aha bụ́ “Onye na-eṅomi Solomon.” N’aka nke ya, Lyra metụtara ọtụtụ ndị na-enye nkọwa na ndị nsụgharị, gụnyere ndị butere ụzọ n’ịsụgharị King James Version n’asụsụ Bekee nakwa onye na-eme mgbanwe bụ́ Martin Luther, bụ́ onye gbanwere nsụgharị Bible na Germany. Luther dabeere na Lyra nke ukwuu nke na otu uri a ma ama gụrụ, sị: “A sị na Lyra akpọghị ụbọ lyre, Luther agaraghị agba egwú.”

Echiche ndị rabaị ndị na-ekwekọghị n’eziokwu ndị Kraịst metụtara Rashi nke ukwuu. Ma, n’iji nghọta miri emi o nwere n’ebe okwu, otú e si ahazi okwu, na ụtọasụsụ nke Bible Hibru mee ihe ná mgbalị ọ na-eme mgbe nile ịmata ihe akụkụ ihe odide ahụ pụtara n’ụzọ doro anya nakwa n’ụzọ nkịtị, Rashi mepụtaara ndị nnyocha na ndị nsụgharị Bible ihe bara uru iji eme ntụnyere.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a “Rashi” bụ aha ndebiri Hibru e nwetara site ná mkpụrụ okwu ndị mbụ nke okwu ndị bụ́ Rabbi Shlomo Yitzḥaqi [Rabaị Solomon ben Isaac].”

b Okwu ahụ bụ́ “Midrash” sitere n’okwu Hibru bụ́ isi nke pụtara “ịjụta, ịmụ, inyocha,” ọ bụrụkwa na a gbatịkwuo ya, “ikwusa.”

c Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ a, lee igbe bụ́ “My Servant”—Who Is He?, dị na peji nke 28 nke broshuọ bụ́ Will There Ever Be a World Without War?, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ebe e si nweta foto dị na peeji nke 26]

Ihe Odide: Per gentile concessione del Ministero dei Beni Culturali e Ambientali

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya