Ị̀ Bụ Onye Na-enwe Nchekwube Ka Ọ Bụ Onye Na-adịghị Enwe?
“Ọ BỤ oge kasị mma, ọ bụ oge kasị njọ, . . . ọ bụ mmalite nke olileanya, ọ bụ ajọ oge nke obi nkoropụ, anyị nwere ihe nile n’ihu anyị, anyị enweghị ihe ọ bụla n’ihu anyị.” Okwu mmeghe nke ọmarịcha akwụkwọ ọgụgụ nke Charles Dickens bụ́ A Tale of Two Cities ji nkà gosi ọdịiche dị n’otú ihe omume pụrụ isi metụta echiche anyị, mmetụta anyị, na ụzọ anyị si ele ihe anya.
Obodo abụọ e zoro aka na ha bụ London na Paris mgbe oké ọgba aghara nke Mgbanwe Ọchịchị France na-aga n’ihu. Nye ndị amaala France nke narị afọ nke 18 a na-emegbu emegbu, mkpọsa nke mgbanwe ọchịchị ahụ maka ihe ndị ruuru mmadụ bụ n’ezie “mmalite nke olileanya.” Ma nye ndị so n’usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ na-ala ala, ọ bụ “ajọ oge nke obi nkoropụ,” na-eduje n’ọnwụ na mbibi.
Inwe nchekwube ka ọ̀ bụ enweghị nchekwube? Ọ dabeere kpam kpam n’akụkụ ị nọ na ya. Ọ ka na-adabekwara na ya.
Oge Ime Nnyocha Onwe Onye
Ị̀ bụ onye nwere nchekwube? Ị̀ na-ahụ akụkụ dị mma nke ndụ, na-atụ anya ihe kasị mma mgbe nile? Ka ọ̀ bụ na ị dịghị enwekarị nchekwube, na-enwe echiche na-ezighị ezi banyere ihe ndị ị na-atụ anya ha, na-ele anya ihe kasị mma ma n’otu mgbe ahụ na-atụ anya nke kasị njọ?
Afọ 60 gara aga, onye America na-ede akwụkwọ ọgụgụ bụ́ James Branch Cabell chịkọtara nkà ihe ọmụma abụọ ahụ na-emegide onwe ha otú a: “Onye nwere nchekwube na-akpọsa na anyị bi n’ụwa ndị kachasị mma a pụrụ inwe; ma onye na-enweghị nchekwube na-atụ ụjọ na nke a bụ eziokwu.” Ọ bụrụ na i chere na echiche a bụ nnọọ ịkwa emo, nyochaa uru na ọghọm nke nanị akụkụ atọ nke ụwa nke oge a dị ka a tụlere n’okpuru. Mgbe ahụ tụlee mmeghachi omume gị, ma jụọ onwe gị, ‘Àbụ m onye nwere nchekwube ka ọ bụ onye na-enweghị?’
Udo Na-adịgide Adịgide: Ebe ole e nwegasịrị nsogbu n’ụwa ka ị̀ pụrụ ịkpọ aha? Ireland, ebe bụbu Yugoslavia, Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Burundi, Rwanda—ndị a na-abata n’uche ngwa ngwa. Ọ̀ dị mgbe a pụrụ idozi ọgụ ndị a na ndị ọzọ iji hụ na e nwere udo na-adịgide adịgide, nke zuru ụwa ọnụ? Ụwa ọ̀ na-eche udo ihu?
Nkwụsi Ike nke Akụ̀ na Ụba: N’olileanya inwe otu akwụkwọ ego ka ọ na-erula 1999, mba ndị so n’Òtù Ndị Europe na-agbasosi nsogbu ịrị elu nke ọnụ ahịa na mgbaziri ego mgba ike. N’ebe ndị ọzọ, nrụrụ aka na-emebi usoro akụ̀ na ụba nke ọtụtụ mba America na Africa, ebe ịrị elu nke ọnụ ahịa na-eweta ibu arọ gabigara ókè, nsogbu agbụrụ ka na-ekewasịkwa ndị mmadụ. Nkwụsi ike nke akụ̀ na ụba ụwa, ọ̀ dị nnọọ n’ihu?
Enweghị Ọrụ: Ná ntụli aka mba nke 1997, chọọchị ndị dị na Britain jikọtara aka gbaa òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile ume itinye inweta ọrụ na-ezu ezu n’ọnọdụ mbụ n’isiokwu ndị ha ga-atụle. Ma ebe ihe fọrọ nke nta ka o ruo pasent 30 nke ndị ọrụ n’ụwa na-enwekwaghị ọrụ ma ọ bụ na-adịghị arụta ihe na-ezuru ha, à pụrụ inwe ọrụ na-ezu ezu, nke na-adịgide adịgide—karịsịa maka ndị na-eto eto?
Lee otú o si dị mfe ịghara inwe nchekwube! Ma e nwere akụkụ dị mma, anyị na-akpọkwa gị òkù ịtụle otú ọ pụrụ isi kwee omume ịzụlite echiche inwe nchekwube.
[Foto dị na peeji nke 3]
Mgbanwe Ọchịchị France
[Ebe E Si Nweta Foto]
Site n’akwụkwọ bụ́ Pictorial History of the World