Ndị Na-eto Eto Ndị Nwere Ọdịnihu Dị Nchebe
“Ọ NA-ATỤ ụjọ ma na-asọ oyi nke ukwuu dị nnọọ ka [ikpe ndina n’ike] ọ bụla pụrụ ịdị”—nke ahụ bụ otú onye ọkàikpe nọ n’isi otu ikpe e kpere n’oge na-adịbeghị anya si kọwaa mpụ ahụ. Otu ìgwè nke ndị nọ n’afọ iri na ụma asatọ, ndị afọ ndụ ha bụ site na 14 ruo 18, chechiri otu nwanyị na-eme njem nleta n’akụkụ London ebe ndị mmadụ bijupụtara, wakpoo ya ugboro ugboro n’ụzọ mmekọahụ, tụbazie ya n’otu ọwa mmiri dị nso ọ bụ ezie na o kwuru na ya apụghị igwu mmiri. N’ụzọ kwere nghọta, nne nke otu n’ime ndị ahụ nọ n’afọ iri na ụma kwuru na ya dara ọrịa mgbe ya hụrụ akụkọ TV ahụ nke ihe nwa ya nwoke meworo.
N’ụzọ dị mwute, ihe a merenụ na-egosi ihe na-eme n’ọha mmadụ taa. Obi ọjọọ aghọwo ụzọ ndụ, ma ọ bụ n’omume ime mpụ, esemokwu ebe obibi, ma ọ bụ n’ọgụ agbụrụ nke ndị Balkan, etiti na ebe ọdịda anyanwụ Africa, na ebe ndị ọzọ. Ndị na-eto eto na-etolite n’etiti ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ma ọ bụ ha na-anụ banyere ha mgbe mgbe. Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ ndị na-azụlite ọdịdị elu ahụ siri ike, bụrụ “ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ” na “ndị na-adịghị ejide onwe ha.”—2 Timoti 3:3.
“Ndị Dị Ka Anụ Ọhịa”
Mgbe onye Kraịst bụ́ Pọl onyeozi dere akwụkwọ ozi ya nke abụọ o degaara onye okenye ibe ya bụ́ Timoti, Rom bụ ike ụwa na-achị achị. Mmekpọ ọnụ na ime ihe ike bụ ihe a na-ahụkarị n’ọgbọ egwuregwu ndị Rom. Ma, Pọl dọrọ aka ná ntị na n’ọdịnihu, oge ga-aghọ nke dị “oké egwu.” (2 Timoti 3:1) N’ụzọ na-akpali mmasị, okwu Grik nke na-akọwa oge ndị a dị ka nke dị “oké egwu” na-agụnye echiche nke ha ịdị ka “anụ ọhịa.” Otu ihe merenụ n’oge ije ozi elu ala Jisọs n’ihe karịrị afọ 30 tupu mgbe ahụ na-egosi ihe kpatara ụfọdụ n’ime àgwà ime ka anụ ọhịa ndị dị n’oge ya.
Jisọs ka jisịrị ụgbọ mmiri rute n’akụkụ ọwụwa anyanwụ nke Osimiri Galili. Ka ọ rịturu n’ala, ndị ikom abụọ zutere ya. Ọdịdị ara ara na iti mkpu ha mere ka o doo anya na ha nwere ezigbo nsogbu. Ha bụ “ndị anya ha dị oké egwu,” n’ezie, ndị ndị mmụọ ọjọọ ji aka.a Ihe ha tiri ná mkpu sitere n’aka ndị ajọ mmụọ bụ́ ndị na-achịkwa omume ime ihe ike ha. “Gịnị ka anyị na Gị nwekọrọ, Gị Ọkpara Chineke?” ka ndị ikom ahụ tiri ná mkpu. “Ị̀ bịara ebe a imekpa anyị ahụ mgbe oge anyị aka-erughị?” Ndị ajọ mmụọ ahụ ji ndị ikom abụọ ahụ aka maara nke ọma na Chineke esetịpụworị oge maka imezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ ndị mmụọ ọjọọ. Nke a ga-apụta mbibi ebighị ebi ha. Ma ruo mgbe ahụ ha ga na-eji ike ha karịrị nke mmadụ na-eme ihe iji kpasuo ime ihe ike dị egwu. Ọ bụ nanị ọrụ ebube Jisọs rụrụ iji chụpụ ndị mmụọ ọjọọ ahụ wetaara ndị ikom abụọ ahụ ahụ efe.—Matiu 8:28-32; Jud 6.
Mgbe ndị mmadụ taa, gụnyere ndị ntorobịa, na-akpa àgwà n’ụzọ ịwị ara, anyị ga-eme nke ọma icheta ihe ahụ merenụ. N’ihi gịnị? N’ihi na n’ime narị afọ nke 20 a, anyị na-eche ihe ize ndụ yiri nke ahụ ihu, dị ka akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, na-akọwa: “Ahụhụ ga-adịrị ụwa na oké osimiri: n’ihi na ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.” (Mkpughe 12:12) Biko, rịba ama na “oké ọnụma” na mweda n’ala a nke Setan na-agakọ n’ihi na ọ maara na oge ya dị mkpirikpi.
Ndị A Na-awakpo
Dị ka e kwuru mgbe mgbe na magazin a, n’afọ 1914 e chiri Kraịst Jisọs echichi dị ka Eze nke Alaeze Chineke n’eluigwe. Jisọs mere ihe ozugbo megide onye iro bụ isi nke Chineke, bụ́ Setan. N’ihi ya, a chụpụwo Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya n’eluigwe, ugbu a kwa ha na-elekwasị anya n’ụwa a. (Mkpughe 12:7-9) N’ịbụ onye a kpaara ebe ikike ya na-eru ókè n’ụzọ dị ukwuu, Setan “dị ka ọdụm na-agbọ ụja, ọ na-ejegharị, na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Olee ndị dịịrị ya mfe ijide? Ọ̀ bụ na o kweghị nghọta na ọ ga-abụ kpọmkwem ndị ahụ na-enweghị ahụmahụ ná ndụ na ná mmekọrịta mmadụ na ibe ya? Ndị na-eto eto taa esiwo otú a ghọọ ebe Ekwensu lekwasịrị anya. Site n’ọtụtụ n’ime egwú ha na ihe ndị ha na-achụso mgbe ha na-ezu ike, ha na-adaba nnọọ n’aka onye nduhie a a na-adịghị ahụ anya nke dị aghụghọ.—Ndị Efesọs 6:11, 12.
Ọbụna mgbe ndị na-eto eto na-agbalị iji ndụ ha mee ihe bara uru, ha na-enwe ihe ndọla azụ. Kemgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri, ndị nọ n’ọtụtụ mba ndị ahụ nọbu n’agha gbalịrị ịkwụghachi ihe a tụfuru site n’inye ezinụlọ ha ohere ibi ndụ ọgaranya. Ihe onwunwe, izu ike a na-akparaghị ókè, na ntụrụndụ aghọwo ihe mgbaru ọsọ ndị bụ isi. Dị ka ihe si na nke a pụta, ọtụtụ ndị atawo ahụhụ. “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya,” ka Pọl dọrọ Timoti aka ná ntị, “na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ agụụ ihe ọjọọ nke uche na-adịghị n’ime ha . . . N’ihi na ịhụ ego n’anya bụ mkpọrọgwụ nke ihe ọjọọ nile dị iche iche: nke ụfọdụ na-agbasosi ike . . . ha werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.” (1 Timoti 6:9, 10) N’ozuzu, anyị na-achọta ọha mmadụ hụrụ ihe onwunwe n’anya nke taa ka e ji ihe mgbu nke akụ̀ na ụba, ego, na mmetụta uche dụpuo ha. E nwere ọtụtụ ndị na-eto eto n’etiti ha, ndị atụmatụ a nke onye iro bụ isi nke Chineke metụtaworo.
Ma, n’ụzọ na-enye obi ụtọ, e nwere akụkọ ọma. O metụtakwara ndị na-eto eto, ndị nwere ọdịnihu dị nchebe n’ihu ha. Olee otú nke a pụrụ isi kwe omume?
Chọọnụ, Unu Ga-achọtakwa
Ọtụtụ ndị na-eto eto nwere echiche ndị dị mma. Ha na-ajụ ụkpụrụ ndị na-eretọ eretọ a na-ahụkarị n’etiti ndị okenye. Ha na-asọ ikpe na-ezighị ezi na omume obi ịta mmiri nke ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọchụ nta ego agụụ inwe ike na-agụ oyi. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto, ikekwe nke a bụ otú ọ dị gị.
Tụlee Cedric, bụ́ nwa okorobịa nọ ná ngwụsị afọ iri na ụma ya, onye ahụmahụ ya na-abụghị ọpụrụiche ma ọlị.b Mgbe ọ bụ nwata, o nwere ọtụtụ egwu, gụnyere egwu ọnwụ. O chere echiche banyere ihe bụ nzube nke ndụ. N’achọtaghị azịza nye ajụjụ ya ruo mgbe ọ dị afọ 15, o nyefere onwe ya n’ịtụgharị uche banyere ndụ ya na ndị na-eto eto ndị ọzọ nwere echiche ndị dị elu. “Anyị ga-ese wii wii, nọrọkwa ọdụ na-akpa nkata ruo ọtụtụ hour,” ka ọ na-echeta. “Ọ ga-adị gị ka onye ọ bụla ọ na-eche otu ihe ahụ ị na-eche, ma ọ dịghị onye nwere azịza.”
Dị ka ọtụtụ ndị na-eto eto, Cedric chọrọ ihe mkpali. Nanị ịṅụ ọgwụ ọjọọ ejughị ya afọ. N’oge na-adịghị anya ọ malitere izu ohi na ibu ọgwụ ọjọọ. Ma ọ chọrọ ihe mkpali ndị ọzọ. Ọ malitere izute ihe ndị mmadụ chọrọ ka o zutere ha. “M na-enweta obi ụtọ na ya,” ka ọ na-anakwere. “Ma ọ dịghị mgbe m zunaara onye ọkwá ya dị ala ihe. M zuo ụgbọala, m na-ahapụ ya n’ọnọdụ dị mma. M waba n’ebe azụmahịa, m na-eme otú ahụ nanị ebe m maara na ndị inshọransị ga-akwụghachi ha ụgwọ. O nyeere m aka ịgọpụ ihe m na-eme.” Dị ka ị pụrụ ịtụ anya ya, Cedric mesịrị gaa mkpọrọ.
Cedric na-echeta, sị: “Mark, onye mkpọrọ ibe m, gwara m okwu. N’ịhụ na a kanyere m nnukwute obe n’elu ogwe aka, ọ jụrụ m ihe mere m ji nwee nke a. O chere na ọ ghaghị ịdị m mkpa n’ụzọ okpukpe.” Izu ụfọdụ n’ihu, Mark nyere Cedric akwụkwọ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala.c “‘Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi’—okwu ole na ole ndị ahụ dọọrọ mmasị m ozugbo. Nke ahụ bụ ihe anyị na-ekwu okwu ya mgbe nile, ma anyị enwebeghị ike ịchọpụta isi ya.” Mgbe o sosịrị otu onye n’ime Ndịàmà Jehova nke letara ụlọ mkpọrọ ahụ kwurịta okwu ọtụtụ ugboro, Cedric chọpụtara na ihe ọ na-achụso bụ ihe a pụrụ inweta—ma ọ bụ nanị n’ụzọ nke Chineke.
“Ozugbo m kwụsịrị iso ndị enyi m mbụ na-akpakọrịta, enwere m ọganihu dị ngwa,” ka Cedric na-ekwu. Ọganihu ya n’inweta nghọta na obi ụtọ adịghị mfe. “M ka na-arụ ọrụ banyere ya,” ka ọ na-ekwu. “Aghaghị m ịkpachara anya banyere ụzọ m si eche echiche.” Ee, Cedric na-aghọta ugbu a na inwe echiche dị elu dubara ya n’ọnyà Ekwensu, na-eche na ya pụrụ iru ihe mgbaru ọsọ ya nanị site n’itinye aka n’ihe omume ndị dabeere n’inwe mkpali.
N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Cedric apụtawo n’ụlọ mkpọrọ kemgbe, ọ na-enwetakwa ọṅụ n’iso ndị ọzọ ndị chọtaworo ihe ha na-achọ na-akpachi anya. Ọ bụ ugbu a otu n’ime Ndịàmà Jehova, sorokwa ha na-enwe olileanya ha nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs n’elu ala ebe a. Ọ na-elepụkwa anya n’ọgwụgwụ nke mmetụta Setan n’ụdị ya nile.
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ndị na-eto eto dị ka Cedric nwere ọdịnihu dị nchebe; ndị ọzọ bụ ndị nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere, bụ́ ndị kụnyere n’ime ụmụ ha ịhụnanya maka eziokwu Bible.
Ọzụzụ Chineke Na-akwụghachi Ụgwọ
“Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi na ya wezụga onwe ya,” ka Eze Solomọn maara ihe nke oge ochie dere. (Ilu 22:6) Nke a abụrụwo eziokwu n’ọnọdụ ọtụtụ ndị ntorobịa nwere otu nzube bụ́ ndị họrọwooro ịgbaso ụkpụrụ Bible.
Sheila, Gordon, na Sarah mere nke a. Ha na-echeta na ndị mụrụ ha ji irube isi n’iwu Kraịst ahụ nke ‘ịga mee ndị na-eso ụzọ’ site n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ kpọrọ ihe nke ukwuu. (Matiu 24:14; 28:19, 20) “Ná mkpebi ọ bụla a ga-eme, mụ na nne m na-asịrịtabu onwe anyị, ‘Olee otú ọ ga-esi metụta ọrụ nkwusa ahụ?’” ka Sheila na-echeta. “Anyị hapụrụ ọtụtụ atụmatụ n’ihi echiche a,” ka ọ na-ekweta, na-agbakwụnye, sị, “ma lee ọtụtụ ngọzi anyị nwetara!” Ọbụna n’ọgwụgwụ nke ogologo ụbọchị ndị e ji ozi ọma ahụ leta ebe obibi ndị mmadụ, Sheila na nne ya na-abụrụ abụ zọrọ ije na-ala. “Ọṅụ m zuru ezu,” ka ọ na-asị. “M ka pụrụ inwe mmetụta ya ugbu a.”
Gordon na-echeta ọtụtụ mgbede Saturday na-enye ọṅụ. “Ndị okenye ọgbakọ kpọrọ m òkù n’ụlọ ha, ebe anyị nwere gwam gwam gwam na nkwurịta okwu ndị bara uru. A gbara anyị ume ibu amaokwu Bible n’isi, ikwu okwu n’isiokwu Akwụkwọ Nsọ dị iche iche n’ụzọ gara were were n’ọnụ, ịkọ ahụmahụ nke ime nkwusa, na ịmata otú ọrụ Alaeze ahụ si na-amụba,” ka Gordon na-echeta. “Ihe a nile nyeere m aka ịtọ ezi ntọala na ịzụlite ịhụnanya maka Jehova Chineke.”
Sarah ji obi ụtọ na-echeta mgbede ndị o ji na-eleta Ndịàmà. “Anyị ga-erikọ ihe ọnụ. Mgbe ahụ iji weta ụbọchị ahụ ná njedebe, anyị na-apị piano, na-esoro ndị na-abụ abụ ndị na-ekwu banyere Alaeze Chineke. Egwú nyeere anyị aka nke ukwuu, karịsịa n’afọ ndị anyị nọ n’ụlọ akwụkwọ, n’ihi na o nyere anyị ohere imekọ ihe ọnụ dị ka otu ezinụlọ.”
N’ezie, ọ bụghị ndị na-eto eto nile na-achọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ nwere ọnọdụ ezinụlọ ndị dị mma. Otú ọ dị, iso ezinụlọ ndị ọzọ bụ́ Ndịàmà n’ọgbakọ na-akpachi anya na-enye ha nchebe na echiche nke ịbụ ndị a chọrọ.
Jiri Ntọala Dị Nchebe Maka Ọdịnihu Kpọrọ Ihe
Ndị na-eto eto taa nwere ohere ime nhọrọ. Ha pụrụ ịnọgide na-eso ajọ ụwa nke a ka ọ na-amaba ná mbibi ná “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịa abịa nke Jisọs buru amụma banyere ya. Ma ọ bụ ha pụrụ ‘ịtụkwasị obi ha na Chineke ma debe ihe nile O nyere n’iwu,’ dị ka ọbụ abụ ahụ nwere ike mmụọ nsọ bụ́ Esaf bụrụ n’abụ. Nrubeisi nye Chineke ga-egbochi ha ịghọ “ọgbọ na-ewezụga onwe ha nke na-enupụkwa isi; ọgbọ ndị na-edozighị obi ha, ndị mmụọ ha na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ.”—Matiu 24:21; Abụ Ọma 78:6-8.
N’ime ọgbakọ karịrị 80,000 nke Ndịàmà Jehova n’ụwa dum, ị ga-ahụ ọtụtụ ndị na-eto eto ndị ị pụrụ inwe mmasị n’ebe ha nọ. Ha aṅawo ntị na ndụmọdụ Pọl nyere Timoti na-eto eto “ka ha na-eme ezi ihe, ka ha bụrụ ọgaranya n’ọrụ ọma nile, ka ha bụrụ ndị kwadebeworo ime ka ndị ọzọ keta ihe ha nwere, ka ha bụrụ ndị kwere ka ndị ọzọ soro ha nwekọọ ihe; ka ha kpadooro onwe ha ntọala ọma nye oge gaje ịbịa.” N’ihi ya, ha ‘ejidewo ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie’ ugbu a. (1 Timoti 6:18, 19) Chọpụtakwuo ihe banyere ezi ndị Kraịst ndị a site n’ije nzukọ ha. Mgbe ahụ gị onwe gị kwa pụrụ inwe olileanya maka ọdịnihu dị nchebe.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a “Dị ka anụ ọhịa” na-asụgharị otu okwu Grik ahụ e ji mee ihe na Matiu 8:28 nakwa na 2 Timoti 3:1.
b A gbanwewo aha ụfọdụ.
c Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 7]
Ndị mmụọ ọjọọ mere ka e nwee ndị ikom ahụ “anya ha dị oké egwu” ndị Jisọs gwọrọ
[Foto dị na peeji nke 8]
Iwulite “ntọala ọma nye oge gaje ịbịa”