Ịdị n’Otu Ụwa—Ọ̀ Dị Mgbe A Ga-enwe Ya?
“Ọ BỤRỤ na anyị ga-enwe ihe ịga nke ọma n’ọgbọ ole na ole na-abịanụ n’ịgbanwe ụwa nke mba ndị kwụụrụ onwe ha nke anyị bi na ya gaa n’otu ụdị nke ezigbo ógbè zuru ụwa ọnụ, . . . mgbe ahụ anyị ga-akwụsịwo n’otu aka ahụ obubuagha nke oge ochie n’ụzọ dị irè . . . Ma, ọ bụrụ na anyị adaa, ikekwe a gaghị enwe . . . mmepeanya ọ bụla.” Otú ahụ ka ọkọ akụkọ ihe mere eme banyere agha bụ́ Gwynne Dyer kwuru n’akwụkwọ ya a kpọrọ War.
Akụkọ ihe mere eme, ka Dyer na-ekwu, jupụtara n’akụkọ nke mba na ìgwè ndị ọzọ dị ike bụ́ ndị họọrọ agha iji dozie esemokwu ha. Adịghị n’otu ha lara ndụ nke ọtụtụ nde mmadụ n’iyi. Nkọwa nke Eze Solomọn kọwara otú nke a si metụta ndị biri n’ụbọchi ya ka dabakwara adaba taa. O dere, sị: “Mụ onwe m wee laghachi hụ mmegbu nile a na-emegbu n’okpuru anyanwụ: ma, lee, anya mmiri nke ndị a na-emegbu, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere; ma n’akụkụ ndị na-emegbu ha ka ike dị, ma ọ dịghị onye nkasi obi ha nwere.”—Eklisiastis 4:1.
Taa, dị ka ọkọ akụkọ ihe mere eme ahụ a kpọtụrụ aha n’elu na-akọwa, e wezụga ọmịiko maka “anya mmiri nke ndị a na-emegbu,” e nwere ihe ọzọ mere e ji achọ otu ụzọ isi gbanwee ụwa nke mba ndị kwụụrụ onwe ha gaa n’otu ụdị nke ezigbo ógbè zuru ụwa ọnụ: Ndịgide nke mmepeanya dị n’ihe ize ndụ! Agha oge a na-eme ka a tụọ anya ibibi mba nile na-ahọrọ ya, ọ gaghịkwa ahapụ ndị mmeri ọ bụla.
Ịdị n’Otu Ụwa Ọ̀ Dị Nso?
Gịnị bụ olileanya e nwere maka ịdị n’otu ụwa? Ọha mmadụ ọ̀ pụrụ imeri ihe ndị na-akpata nkewa bụ́ ndị na-eyi ndịgide nke ụwa egwu? Ụfọdụ chere otú ahụ. Editọ banyere nchebe nke Daily Telegraph nke Britain, bụ́ John Keegan, na-ede: “N’agbanyeghị ọgba aghara na obi abụọ, o yiri nnọọ ka ọ ga-ekwe mee ịhụperetụ mpụta ìhè nke ihe yiri ụwa nke agha na-adịghị ya.”
Gịnị mere ka o nwee nchekwube a? N’ihi gịnị ka ọtụtụ ji yie ndị nwere olileanya n’agbanyeghị ogologo akụkọ ihe mere eme mmadụ nke obubu agha na ihe yiri mmadụ enweghị ike ịchị onwe ya? (Jeremaịa 10:23) ‘Ihe a kpọrọ mmadụ na-aga ihu. Akụkọ ihe mere eme na-egosi ụkpụrụ nke ịnọgide na-enwe ọganihu,’ ka ụfọdụ n’otu oge rụrụ ụka ya. Ọbụna taa, ọtụtụ kwenyere na n’ụzọ ụfọdụ ịdị mma nke dị n’ime mmadụ ga-emeri ihe ọjọọ. Nke ahụ ọ̀ bụ olileanya ga-eme eme? Ka ọ̀ bụ nanị mmegharị anya nke ga-eduje ná ndakpọ olileanya karị? N’akwụkwọ ya bụ́ Shorter History of the World, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts dere n’ụzọ ezi uche dị na ya, sị: “O siri ike ikwu na ọdịnihu ụwa yiri ihe e ji n’aka. Ọgwụgwụ nke nhụjuanya mmadụ adịghịkwa nso ugbu a, e nweghịkwa ihe ndabere maka ikwere na o kwesịrị ịdị.”
È nwere ezi ihe ndị mere a ga-eji kwere na ndị mmadụ na mba dị iche iche n’ezie ga-emeri atụkwasịghị ibe ha obi na ndịrịta iche ha ndị na-akpata nkewa? Ka à chọrọ ihe karịrị mgbalị mmadụ? Isiokwu na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]
Ụwa dị n’azụ azụ ihu akwụkwọ: Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.