Ngọzi nke Ozi Ọsụ Ụzọ
“Ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghị atụkwasịkwa ya ihe mwute.”—ILU 10:22.
1, 2. (a) Olee otú otu onye ọsụ ụzọ si kwupụta mmetụta ya banyere ozi oge nile? (b) N’ihi gịnị ka ndị ọsụ ụzọ ji nọrọ n’ọnọdụ inweta ọṅụ nke ime ndị na-eso ụzọ n’ụzọ zuru ezu karị?
“À PỤRỤ inwe ọṅụ dị ukwuu karịa ịhụ onye ị na-amụrụ ihe ka ọ na-aghọ onye siri ike na-enye Jehova otuto? Ọ na-akpali akpali ma na-ewusi okwukwe ike ịhụ otú Okwu Chineke si dị ike n’ịkwali ndị mmadụ ime mgbanwe ná ndụ ha iji na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ.” Otú ahụ ka otu onye ọsụ ụzọ sitere Canada nke nọworo n’ozi oge nile ruo ihe karịrị afọ 32 dere. Banyere ozi ọsụ ụzọ ya, ọ na-asị: “Apụghị m iche n’echiche ime ihe ọ bụla ọzọ. Enwetụghị m ike icheli n’echiche ihe ọ bụla nke ga-eweta otu ụdị ọṅụ ahụ.”
2 Ì kwere na e nwere oké ọṅụ n’ikere òkè n’inyere mmadụ aka n’ụzọ nke ndụ? N’ezie, ndị ọsụ ụzọ abụghị nanị ndị na-enweta ụdị ọṅụ ahụ. Ndị ohu Jehova nile nwere ọrụ ‘ime ndị na-eso ụzọ,’ ha na-agbalịkwa ime otú ahụ. (Matiu 28:19) Otú ọ dị, ebe ndị ọsụ ụzọ nwere ike itinye ọtụtụ hour n’ozi ubi, ha na-anọkarị n’ọnọdụ nke inweta ọṅụ nke ime ndị na-eso ụzọ n’ụzọ zuru ezu karị. Ma ịsụ ụzọ nwekwara ụgwọ ọrụ ndị ọzọ. Soro ndị ọsụ ụzọ kwurịta okwu, ha ga-agwakwa gị na ịsụ ụzọ bụ ụzọ magburu onwe ya isi nweta ‘ngọzi Jehova nke na-eme mmadụ ọgaranya.’—Ilu 10:22.
3. Gịnị pụrụ ịkpali anyị ka anyị nọgidere na-ejere Jehova ozi?
3 N’oge na-adịbeghị anya, a gwara ndị ọsụ ụzọ sitere n’akụkụ dị iche iche nke ụwa ka ha kọwaa ngọzi ndị ha nwetaworo n’ozi oge nile. Ka anyị tụlee ihe ha nwere ikwu. Otú ọ dị, adala mbà ma ọ bụrụ na a kpaara ozi gị ókè n’ihi ahụ esighị ike, ịka nká, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ. Cheta, ihe dị mkpa bụ ijere Jehova ozi site ná mkpụrụ obi dum, n’ọkwá ọ bụla. Ma, ịnụ okwu nke ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịmụba mmasị gị iwere ọrụ a na-enye ụgwọ ọrụ ma o kwe mee.
Mmetụta Dị Omimi nke Afọ Ojuju na Ọṅụ
4, 5. (a) N’ihi gịnị ka isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ ji bụrụ ahụmahụ na-enye ụgwọ ọrụ otú ahụ? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ndị ọsụ ụzọ na-enwe banyere ikere òkè n’ozi oge nile?
4 “Ọ dị ngọzi inye ihe karịa ịnara ihe,” ka Jisọs kwuru. (Ọrụ 20:35) Ee, inye ihe n’ụzọ achọghị ọdịmma onwe onye nanị nwere ụgwọ ọrụ nke ya. (Ilu 11:25) Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe a bịara n’isoro ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ. N’ezie, olee onyinye ka ukwuu anyị pụrụ inye mmadụ ibe anyị karịa inyere ya aka inweta ihe ọmụma Chineke, nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi?—Jọn 17:3.
5 N’abụghị ihe ijuanya, ndị na-ekere òkè n’ozi ahụ oge nile na-ekwukarị banyere ọṅụ na echiche dị omimi nke afọ ojuju ha na-enweta n’ozi ha. “Amaara m na o nweghị ọrụ ọzọ nke pụrụ iwetaworo m afọ ojuju nke bịaworo site n’isoro ndị ọzọ kerịta eziokwu ahụ,” ka onye ọsụ ụzọ gbara afọ 64 nke sitere Britain na-ekwu. Nwanyị di ya nwụrụ sitere Democratic Republic of Congo kwuru ihe ịsụ ụzọ pụtawooro ya: “Ozi ọsụ ụzọ bụ ezi nkasi obi nye m mgbe di m nwụnahụsịrị m. Ka m na-apụ n’ozi inyere ndị ọzọ aka karị, echiche nke mfu ọjọọ ahụ na-ebelata. M na-etinye okwukwe m ná nkwa Jehova ma na-eche karịsịa otú m pụrụ isi nyere ndị m na-amụrụ ihe aka ime mgbanwe ná ndụ ha. Ná ngwụsị ụbọchị nke ọ bụla, ụra m na-atọ ụtọ, obi m na-ejupụtakwa n’ọṅụ.”
6. Ọṅụ dị aṅaa pụrụ iche ka ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ nwetaworo?
6 Ụfọdụ ndị nọworo na-asụ ụzọ ruo ọtụtụ iri afọ enwewo ọṅụ pụrụ iche nke ije ozi n’ógbè ndị dịbara n’ime, na-eguzobe ọgbakọ dị iche iche, bụ́ ndị na-emesịa too ghọọ sekit dị iche iche. Dị ka ihe atụ, n’Abashiri, Hokkaido (àgwàetiti Japan dịmiri n’ebe ùgwù karịsịa), e nwere nwanna nwanyị bụworo ọsụ ụzọ ruo afọ 33. Ọ na-echeta na ná mgbakọ sekit nke mbụ ya—maka Hokkaido nile—e nwere nanị 70 ndị bịaranụ. Gịnịkwa banyere ugbu a? E nwere sekit 12 n’àgwàetiti ahụ, na-enwe ngụkọta karịrị ndị nkwusa 12,000. Cheedị otú obi ya ga-esi ejupụta n’ọṅụ mgbe ọ gara mgbakọ dị iche iche ya na ìgwè ndị nkwusa Alaeze ibe ya n’àgwàetiti ahụ!
7, 8. Ọṅụ dị aṅaa ka ihe ka ọtụtụ ná ndị nọteworo aka n’ịsụ ụzọ nwetaworo?
7 Ndị ọzọ nọteworo aka n’ịsụ ụzọ enwewo ọṅụ nke ịhụ ndị ha mụụrụ Bible ka e mere ha baptism, mesịa na-eru eru maka ihe ùgwù ije ozi ka ukwuu. Na Japan otu nwanna nwanyị sụworo ụzọ n’ebe itoolu dị iche iche kemgbe 1957 na-echeta inyefe otu nwanyị na-akatabeghị ahụ nke na-arụ ọrụ n’ụlọ akụ̀ magazin Teta! N’ime ọnwa itoolu e mere nwanyị ahụ baptism. Ka oge na-aga ọ lụrụ di, ya na di ya ghọkwara ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Lee ọṅụ ọ bụụrụ nwanna nwanyị onye ọsụ ụzọ ahụ mgbe, n’ebe nke atọ ọ na-eje ozi, onye nlekọta sekit ọhụrụ nke ọgbakọ ya na nwunye ya—onye bụbu onye ọ na-amụrụ Bible—bịara leta ọgbakọ ya!
8 Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị meworo ozi ọsụ ụzọ ọrụ ha na-ele ya anya dị ka “ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa a ga-eji kpọrọ ihe,” dị ka otu onye sụworo ụzọ ruo afọ 22 kwupụtara ya!
Ihe Àmà nke Nlekọta Jehova
9. Dị ka Onye Ukwu Na-enye Ihe, gịnị ka Jehova na-ekwe ndị ohu ya ná nkwa, gịnịkwa ka nke a pụtaara anyị?
9 Jehova, Onye Ukwu Na-enye Ihe, na-ekwe nkwa ịkwagide ndị ohu ya, na-elekọta ha n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ ihe onwunwe. Eze Devid pụrụ ikwu nke ọma, sị: “Nwata ka m bụworo, aghọwokwa m okenye; ma ahụghị m onye ezi omume ka a hapụrụ ya, ahụghịkwa m mkpụrụ ya ka ha na-arịọ nri.” (Abụ Ọma 37:25) Otú ọ dị, nkwa a nke Chineke adịghị ewepụ anyị n’ibu ọrụ anyị inye ezinụlọ anyị ihe na-akpa ha n’ụzọ anụ ahụ, ọ dịghịkwa enye anyị ikike iji mmesapụ aka nke ụmụnna anyị ndị Kraịst eme ihe n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. (1 Ndị Tesalọnaịka 4:11, 12; 1 Timoti 5:8) Ma, mgbe anyị ji obi anyị chụọ àjà ná ndụ anyị iji jeere Jehova ozi n’ụzọ zuru ezu karị, ọ gaghị ahapụ anyị ma ọlị.—Matiu 6:33.
10, 11. Site n’ahụmahụ, gịnị ka ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ maara banyere ikike Jehova nwere inye ihe?
10 Ndị ọsụ ụzọ gburugburu ụwa maara site n’ahụmahụ na Jehova na-enye ndị tinyere onwe ha n’aka nlekọta ya ihe na-akpa ha. Tụlee ihe banyere di na nwunye ndị ọsụ ụzọ bụ́ ndị kwagara n’obodo nta ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Mgbe ọnwa ole na ole gasịrị, ọrụ ego kọrọ ụkọ, ego ha kpakọbara agwụwokwa. Mgbe ahụ ha natara ụgwọ $81 ha ga-akwụ maka inshọransị ụgbọala. “Ọ dịghị ụzọ anyị ga-esi akwụ ya,” ka nwanna nwoke ahụ na-akọwa. “Anyị kpesiri ekpere ike n’abalị ahụ.” N’echi ya, ha natara otu kaadị site n’aka otu ezinụlọ ọ na-adịghịrị mfe n’ụzọ ego n’onwe ha. Ezinụlọ ahụ anatawo ego ha kwụfere maka ụtụ isi, ka kaadị ahụ kọwara, ebe ọ bụkwa na ọ karịrị ihe ha tụworo anya ya, ha chọrọ isoro di na nwunye ahụ na-asụ ụzọ kerịta ya. E tinyere n’ime ya akwụkwọ ndọta ego maka $81! “Enweghị m ike ichezọ ụbọchị ahụ—ajị olu m guzoro ọtọ!” ka nwanna nwoke ọsụ ụzọ ahụ na-ekwu. “Anyị nwere ekele nke ukwuu maka mmesapụ aka ezinụlọ a.” Jehova na-enwekwa ekele maka ụdị obiọma ahụ, bụ́ ụdị mmụọ mmesapụ aka ọ na-agba ume ya n’ime ndị ohu ya.—Ilu 19:17; Ndị Hibru 13:16.
11 Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịkọ ahụmahụ ndị yiri nke ahụ. Jụọ ha, ha ga-agwakwa gị na ọ dịbeghị mgbe ‘a hapụrụ’ ha. N’ileghachi anya azụ n’ihe karịrị afọ 55 n’ozi oge nile, otu onye ọsụ ụzọ gbara afọ 72 na-asị, “Ọ dịbeghị mgbe Jehova mechuru m ihu.”—Ndị Hibru 13:5, 6.
“Ụzọ Magburu Onwe Ya Isi Bịaruo Jehova Nso”
12. N’ihi gịnị ka ọrụ nke ịkpọsa ozi ọma ahụ ji bụrụ ihe ùgwù dị ịrịba ama?
12 Na Jehova ọbụna na-agwa anyị ka anyị kpọsaa ozi ọma nke Alaeze ya na-enye anyị ihe ùgwù. Ọ na-ele anyị anya—ọ bụ ezie na anyị bụ ụmụ mmadụ na-ezughị okè—dị ka ndị ya na ha “na-arụkọ ọrụ” n’ọrụ a na-azọpụta ndụ. (1 Ndị Kọrint 3:9; 1 Timoti 4:16) Ka anyị na-ekwusara ndị ọzọ banyere Alaeze Chineke, ka anyị na-akpọsa ọgwụgwụ nke ajọ omume, ka anyị na-akọwara ndị mmadụ oké ịhụnanya ya n’inye ihe mgbapụta, ka anyị na-asaghe Okwu ya dị ndụ ma na-akụziri ndị nwere obi eziokwu ihe dị ya n’ime dị oké ọnụ ahịa, a na-adọta anyị nso n’ebe Onye Okike anyị, bụ́ Jehova nọ.—Abụ Ọma 145:11; Jọn 3:16; Ndị Hibru 4:12.
13. Gịnị ka ụfọdụ na-ekwu banyere mmetụta nke ozi ọsụ ụzọ ha n’ebe mmekọrịta ha na Jehova dị?
13 Ndị ọsụ ụzọ nwere ike itinye oge dị ukwuu kwa ọnwa n’ịmụta na ịkụzi banyere Jehova. Olee otú ha na-eche nke a si emetụta mmekọrịta ha na Chineke? “Ịsụ ụzọ bụ ụzọ magburu onwe ya isi bịaruo Jehova nso,” ka onye okenye na France nke bụworo ọsụ ụzọ ruo ihe karịrị afọ iri na-aza. Ọsụ ụzọ ọzọ ná mba ahụ, bụ́ onye tinyeworo afọ 18 n’ozi oge nile, na-asị: “Ozi ọsụ ụzọ na-enye anyị ohere ‘idetụ Jehova ire wee hụ na ọ dị mma,’ kwa ụbọchị na-ekekọta mmekọrịta na-esiwanye ike n’ebe Onye Okike anyị nọ.” (Abụ Ọma 34:8) Otu nwanna nwanyị nọ na Britain bụ́ onye sụworo ụzọ ruo afọ 30 chekwara otú ahụ. “Inweta mmụọ Jehova maka nduzi n’ozi m na-eweta m nso n’ebe ọ nọ,” ka ọ na-ekwu. “Enwewo m mmetụta n’ezie na mmụọ Jehova n’ọtụtụ oge dujere m n’otu ụlọ kpọmkwem n’oge kwesịrị ekwesị.”—Tụlee Ọrụ 16:6-10.
14. Olee otú ndị ọsụ ụzọ na-esi erite uru site n’iji Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible akụziri ndị ọzọ ihe kwa ụbọchị?
14 Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ na-achọpụta na iji Bible na mbipụta ndị dabeere na Bible eme ihe kwa ụbọchị iji kọwaa ma kụzie eziokwu Akwụkwọ Nsọ na-enyere ha aka ito n’ihe ọmụma nke Okwu Chineke. Otu nwanna nwoke gbaworo afọ 85 na Spain bụ́ onye sụworo ụzọ ruo afọ 31 na-akọwa, sị: “Ịsụ ụzọ enyeworo m aka inweta ihe ọmụma dị omimi nke Bible, ihe ọmụma m jiworo nyere ọtụtụ ndị aka ịbịa mara Jehova na nzube ya.” Otu nwanna nwanyị sitere Britain bụ́ onye nọworo na-asụ ụzọ kemgbe afọ 23 na-asị: “Ozi oge nile enyeworo m aka ịzụlite ezi agụụ maka nri ime mmụọ.” Ịkọwara ndị ọzọ ‘olileanya ahụ nke dị n’ime gị’ pụrụ iwusi nkweta gị onwe gị ike banyere nkwenkwe i ji kpọrọ oké ihe. (1 Pita 3:15) Onye ọsụ ụzọ sitere Australia na-asị: “Ịsụ ụzọ na-eme ka okwukwe m na-eto ka m na-agwa ndị ọzọ ihe dị m n’obi.”
15. Gịnị ka ụfọdụ dịworo njikere ime iji banye n’ozi ọsụ ụzọ ma nọgide na ya, n’ihi gịnịkwa?
15 N’ụzọ doro anya, ndị ozi ọsụ ụzọ a kwetara na ha ahọrọwo ụdị ozi nke na-eweta ngọzi a na-apụghị ịgụta ọnụ site n’aka Jehova. Ka a sịkwa ihe mere na ọtụtụ adịwo njikere ịhazigharị ihe ná ndụ ha, ọbụna ịchụ ọrụ ego na ihe onwunwe n’àjà, iji banye n’ozi ọsụ ụzọ ma nọgide na ya!—Ilu 28:20.
Ọ̀ Na-agụ Obi Gị Agụụ Imekwu Ihe?
16, 17. (a) Ọ bụrụ na ị na-atụle n’uche ma ịsụ ụzọ ọ̀ ga-ekwe gị mee, gịnị ka ị pụrụ ime? (b) Mmetụta dị aṅaa ka ụfọdụ na-enwe mgbe ha na-enweghị ike ịsụ ụzọ?
16 Mgbe a tụlesịrị ihe ndị ọsụ ụzọ na-ekwu banyere ngọzi nile nke ozi ọsụ ụzọ, ikekwe ị na-atụle n’uche gị ma ị ga-asụli ụzọ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ma i soro onye ọsụ ụzọ nweworo ihe ịga nke ọma n’ozi oge nile kwurịta okwu? Ị pụkwara ịhụ ya dị ka ihe ga-enye aka isoro otu n’ime ndị okenye n’ọgbakọ kwurịta okwu, bụ́ onye maara gị—ọnọdụ ahụ ike gị, erughị eru gị, na ibu ọrụ ezinụlọ gị. (Ilu 15:22) Okwu kwesịrị ekwesị nke ndị ọzọ pụrụ inyere gị aka ịgbakọ nke ọma ma ịsụ ụzọ ọ ga-ekwe gị mee. (Tụlee Luk 14:28.) Ọ bụrụ na i nwere ike ịsụ ụzọ, ngọzi gị dị ukwuu n’ezie.—Malakaị 3:10.
17 Otú ọ dị, gịnị banyere ọtụtụ ndị nkwusa Alaeze kwesịrị ntụkwasị obi ndị na-anọghị n’ọnọdụ ịsụ ụzọ, ọ bụ ezie na ha pụrụ ịchọ imekwu ihe n’ozi? Dị ka ihe atụ, tụlee mmetụta nke otu nwanna nwanyị bụ́ onye Kraịst nke na-adọga ịzụlite ụmụ ya anọ n’onwe ya. “Ọ na-ewute m,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi na m bụbu ọsụ ụzọ oge nile, ma ugbu a, n’ihi ọnọdụ m, apụghị m ịpụ n’ozi ubi otú m si emebu.” Nwanna nwanyị a hụrụ ụmụ ya n’anya nke ukwuu, na-achọkwa inye ha ihe na-akpa ha. N’otu oge ahụ, ọ na-agụsi ya agụụ ike ịrụkwu ọrụ nkwusa ahụ. “Ahụrụ m ozi ahụ n’anya,” ka ọ na-akọwa. Ndị Kraịst ndị ọzọ ji ihe akpọrọ ihe bụ́ ndị ịhụnanya ha nwere maka Chineke na-akwali ha ịchọ ijere Jehova ozi ‘site n’obi ha nile’ nwekwara otu ụdị mmetụta ahụ.—Abụ Ọma 86:12.
18. (a) Gịnị ka Jehova na-atụ anya n’aka anyị? (b) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na ọnọdụ akpaara ihe anyị nwere ike ime ókè?
18 Cheta na ihe Jehova na-atụ anya n’aka anyị bụ ije ozi site ná mkpụrụ obi dum. Ihe nke a pụtara pụrụ ịdị nnọọ iche site ná mkpụrụ obi gaa ná mkpụrụ obi. Ụfọdụ nwere ike ịhazigharị ihe omume ha iji jee ozi dị ka ọsụ ụzọ oge nile. Ọtụtụ ndị ọzọ na-edebanye aha dị ka ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge ma ọ bụ mgbe nile, na-etinye hour 60 kwa ọnwa n’ozi. Otú ọ dị, ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ime ndị Jehova na-etinye onwe ha n’ọrụ nkwusa na nkụzi ahụ site ná mkpụrụ obi ha dum dị ka ndị nkwusa ọgbakọ. Ya mere ọ bụrụ na ahụ esighị ike, ịka nká, ibu ọrụ ezinụlọ, ma ọ bụ ọnọdụ ndị ọzọ akpaworo gị ókè n’ezie, adala mbà. Ọ bụrụhaala na ị na-eme ike gị nile, ozi gị bara uru n’anya Chineke, dịkwa ka nke ndị nọ n’ozi oge nile!
Mmadụ Nile Pụrụ Igosi Mmụọ Ọsụ Ụzọ
19. Gịnị bụ mmụọ ọsụ ụzọ?
19 Ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ị gaghị enwe ike edebanye aha dị ka ọsụ ụzọ, ị pụrụ igosi mmụọ ọsụ ụzọ. Gịnị bụ mmụọ ọsụ ụzọ? Mbipụta March 1989 nke Ozi Alaeze Anyị sịrị: “A pụrụ ịsị na ọ bụ inwe uche ziri ezi n’ebe iwu ahụ e nyere maka ikwusa ozi ọma na ime ndị na-eso ụzọ dị, itinye onwe onye kpam kpam n’igosi ịhụnanya na nchegbu maka ndị ọzọ, iji onwe onye chụọ àjà, inweta ọṅụ n’isochi Onyeisi ahụ anya, na inwe mmasị n’ebe ihe ime mmụọ dị, ọ bụghị n’ihe onwunwe.” Olee otú ị pụrụ isi gosipụta mmụọ ọsụ ụzọ?
20. Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gosi mmụọ ọsụ ụzọ?
20 Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna nwere ụmụntakịrị, ị pụrụ iji obi gị dum tụọrọ ha aro iwere ọsụ ụzọ dị ka ọrụ. Àgwà gị ziri ezi n’ebe ozi ahụ dị pụrụ ịkụnye n’obi ha mkpa nke ime ozi Jehova ihe kasị mkpa ná ndụ ha. Ị pụrụ ịkpọ ndị ọsụ ụzọ na ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na nwunye ha òkù n’ụlọ gị ka ụmụ gị wee nwee ike irite uru site n’ihe nlereanya nke ndị nwetaworo ọṅụ n’ozi oge nile. (Tụlee Ndị Hibru 13:7.) Ọbụna n’ezinụlọ e kewara ekewa n’ụzọ okpukpe, ndị nne na nna kwere ekwe, site n’okwu na n’ihe nlereanya, pụrụ inyere ụmụ ha aka ime ozi oge nile ihe mgbaru ọsọ ha ná ndụ.—2 Timoti 1:5; 3:15.
21. (a) Olee otú anyị nile pụrụ isi nye ndị na-asụ ụzọ nkwado? (b) Gịnị ka ndị okenye pụrụ ime iji gbaa ndị ọsụ ụzọ ume?
21 N’ọgbakọ, anyị nile pụrụ iji obi anyị dum kwadoo ndị nwere ike ịsụ ụzọ. Dị ka ihe atụ, ị̀ pụrụ iwepụta onwe gị isoro onye ọsụ ụzọ rụọ ọrụ n’ozi, karịsịa n’oge ụfọdụ mgbe onye ọsụ ụzọ ahụ gaara na-arụ nanị ya? I nwedịrị ike ịchọpụta na a ga-enwe ‘nkasirịta obi.’ (Ndị Rom 1:11, 12) Ị bụrụ onye okenye, ị pụrụ ọbụna imekwu ihe iji gbaa ndị ọsụ ụzọ ume. Mgbe òtù ndị okenye zukọrọ, ha kwesịrị ịtụle mkpa nke ndị ọsụ ụzọ mgbe nile. Mgbe a kụdara onye ọsụ ụzọ obi ma ọ bụ ya ana-enwe ụfọdụ ihe isi ike, adịla oké ngwa ịtụ aro ka ọ kwụsị ịsụ ụzọ. Ọ bụ ezie na ụdị aro ahụ pụrụ ịdị mkpa n’ọnọdụ ụfọdụ, echezọla na ịsụ ụzọ bụ ihe ùgwù dị oké ọnụ ahịa nke onye na-eje ozi oge nile pụrụ iji akpọrọ ihe nke ukwuu. Ntakịrị agbamume na ụfọdụ ndụmọdụ na enyemaka dị irè pụrụ ịbụ nanị ihe a chọrọ. Alaka ụlọ ọrụ Society dị na Spain na-ede, sị: “Mgbe ndị okenye na-agba ume ịsụ ụzọ, na-akwado ndị ọsụ ụzọ n’ozi ubi, ma na-azụ ha dị ka atụrụ mgbe nile, ndị ọsụ ụzọ na-enwekwu ọṅụ, na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị bara uru, ma chọọ ịga n’ihu n’agbanyeghị ihe mgbochi ndị pụrụ ibilite.”
22. N’oge a dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme mmadụ, gịnị ka anyị kwesịrị ikpebisi ike ime?
22 Anyị na-ebi n’oge dị oké egwu n’akụkọ ihe mere eme mmadụ. Jehova enyewo anyị ọrụ ahụ na-azọpụta ndụ ịrụzu. (Ndị Rom 10:13, 14) Ma ànyị pụrụ ikere òkè n’ọrụ a n’oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ ma ọ bụ na anyị apụghị, ka anyị gosi mmụọ ọsụ ụzọ. Ka anyị nwee echiche ịdị ngwa na mmụọ nke ịchụ onwe onye n’àjà. Ka anyị kpebisie ike inye Jehova ihe ọ chọrọ anyị n’aka—ozi sitere ná mkpụrụ obi dum. Ka anyị chetakwa na mgbe anyị nyere ihe nile anyị pụrụ inye, ma ò yiri ego nta nke nwanyị ahụ di ya nwụrụ ma ọ bụ mmanụ dị oké ọnụ nke Meri, ozi anyị sitere ná mkpụrụ obi dum, Jehova na-ejikwa ozi anyị sitere ná mkpụrụ obi dum akpọrọ ihe!
Ị̀ Na-echeta?
◻ N’ihi gịnị ka ozi oge nile ji eweta mmetụta nke afọ ojuju na ọṅụ?
◻ Site n’ahụmahụ, gịnị ka ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ maara banyere ikike Jehova nwere ilekọta ndị ohu ya?
◻ Ọ̀ na-adị ndị ọsụ ụzọ ka ozi ha ọ̀ na-enwe mmetụta dị aṅaa n’ebe mmekọrịta ha na Jehova dị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosi mmụọ ọsụ ụzọ?
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị ọsụ ụzọ na-enweta oké ọṅụ site n’ime ndị na-eso ụzọ
[Foto dị na peeji nke 23]
Ụmụ gị pụrụ irite uru site n’isoro ndị nkwusa Alaeze oge nile na-akpakọrịta
[Foto dị na peeji nke 23]
Ndị okenye pụrụ ịgba ndị ọsụ ụzọ ume n’ozi ubi