Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 10/1 p. 3-4
  • Ị̀ Pụrụ Ikwere na Chineke Bụ́ Onye?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Pụrụ Ikwere na Chineke Bụ́ Onye?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nhụjuanya na Chineke Bụ́ Onye
  • È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?—Agba nke Mbụ: Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Mmadụ Ò Nwere Ike Ịmalite Inwe Okwukwe n’Onye Okike?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Mara Jehova—Chineke Bụ́ Onye
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Onye Kere Ihe Nile
    Mụta Ihe Site n’Aka Onye Ozizi Ukwu Ahụ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 10/1 p. 3-4

Ị̀ Pụrụ Ikwere na Chineke Bụ́ Onye?

“Ọ DỊGHỊ gị mkpa ikwere na Chineke iji bụrụ onye Kraịst . . . Anyị bụ akụkụ nke mgbanwe ugbu a, ma na narị afọ nke 21 a gaghị enwe Chineke na chọọchị n’echiche ọdịnala,” ka nnukwu onye ụkọ nke mahadum Britain kọwara. Ọ nọ na-ekwuchitere òtù Sea of Faith bụ́ nke ọ dịkarịa ala narị ndị ụkọchukwu Britain na-akwado. Ndị a “na-ekweghị na Chineke bụ́ ndị Kraịst” na-ekwusi ike na okpukpe bụ ihe mmadụ mepụtara nakwa na, dị ka otu onye òtù si tinye ya, Chineke bụ nanị “ihe e chepụtara n’echiche.” Chineke karịrị mmadụ ekwekọkwaghị n’ụzọ ha si eche echiche.

“Chineke anwụwo” bụ okwu wuru ewu n’afọ ndị 1960. O gosipụtara echiche ndị onye ọkà ihe ọmụma Germany na narị afọ nke 19 bụ́ Friedrich Nietzsche nwere ma nye ọtụtụ ndị na-eto eto ihe ngọpụ ha chọrọ iji mere otú ha chọrọ, itinye aka ná mmekọahụ n’efu na ịṅụ ọgwụ ọjọọ n’enweghị nchịkwa nke omume. Ma nnwere onwe dị otú ahụ ò dujere ụmụ agaracha ahụ, dị ka a matara ha, ná ndụ obi ụtọ nke na-enye afọ ojuju karị?

N’otu iri afọ ahụ, bishọp Anglịkan bụ́ John A. T. Robinson bipụtara akwụkwọ ya kpaliri arụmarụ bụ́ Honest to God. Ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu ibe ya katọrọ ya maka iche banyere Chineke “nanị dị ka otu akụkụ nke ọnọdụ dị omimi n’ahụmahụ ụmụ mmadụ.” Prọfesọ nkà mmụta okpukpe bụ́ Keith Ward jụrụ, sị: “Ikwere na Chineke ọ̀ bụ otu ụdị nkwenkwe ụgha oge ya gafeworo, nke ndị maara ihe tụfuworo ugbu a?” N’ịza ajụjụ nke ya, ọ sịrị: “Ọ dịghị ihe ka mkpa n’okpukpe taa karịa inwetaghachi ihe ọmụma nke echiche ọdịnala banyere Chineke.”

Nhụjuanya na Chineke Bụ́ Onye

Ọ na-esiri ọtụtụ ndị kwere na Chineke bụ́ onye ike ijikọ nkwenkwe ha na ọdachi na nhụjuanya ha na-ahụ. Dị ka ihe atụ, na March 1996, a gbagburu ụmụaka 16, tinyere onye nkụzi ha, na Dunblane, Scotland. “Aghọtaghị m nnọọ ihe bụ uche Chineke,” ka otu nwanyị nọ n’obi abụọ kwuru. E kwupụtara obi ụfụ nke ọdachi ahụ n’otu kaadị a hapụrụ ya na okooko osisi n’èzí ụlọ akwụkwọ ụmụaka ahụ. O bu okwu bụ́, “N’IHI GỊNỊ?” N’azịza onye okwuchukwu nke Katidral Dunblane kwuru, sị: “A pụghị inwe nkọwa ọ bụla. Anyị apụghị ịza ihe mere nke a kwesịrị iji mee.”

Mgbe e mesịrị n’otu afọ ahụ, e ji obi ọjọọ gbuo otu onye ụkọchukwu na-akatabeghị ahụ a ma ama nke Chọọchị England. Church Times kọrọ na otu ọgbakọ ọ na-enyeghị ọnụ okwu nụrụ ka achịdikọn nke Liverpool na-ekwu banyere “iburu ajụjụ bụ́ n’ihi gịnị? n’ihi gịnị? na-akụ aka n’ọnụ ụzọ Chineke.” Onye ụkọchukwu a enyeghịkwa okwu nkasi obi ọ bụla sitere n’aka Chineke bụ́ onye.

Gịnịzi ka anyị ga-ekwere? Ezi uche dị n’ikwere na Chineke bụ́ onye. Ọ bụ mkpịsị ugodi nke ịza ajụjụ ndị na-akpali akpali e welitere n’elu. Anyị na-akpọ gị òkù ịtụle ihe àmà e nyere n’isiokwu na-esonụ.

[Foto dị na peeji nke 3]

Kaadị ahụ jụrụ “N’ihi Gịnị?”

[Ebe E Si Nweta Foto]

NEWSTEAM No. 278468/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya