Ala Ịta Nri Maka Ndị Yiri Atụrụ n’Ala Navajo
HÓZHÓNÍ, n’asụsụ ndị Navajo India, pụtara “mara mma,” nke ahụ bụkwa otú ndị Navajo si akọwa ala ha. Eri 1868 gọọmenti United States ekenyewo Navajo ókèala ọha mmadụ dị ihe dị ka square kilomita 62,000 n’ugwu ebe ọwụwa anyanwụ Arizona, n’akụkụ ebe a na-akpọ nkuku anọ, ebe steti anọ bụ́ Arizona, Colorado, New Mexico, na Utah zutere. Ndagwurugwu Ihe Ncheta, nke ihe nkiri sinima Ebe Ọdịda Anyanwụ Ụwa mere ka ọ na-ewu ewu, bụ nke e chekwara ugbu a dị ka Ogige Ntụrụndụ Agbụrụ Navajo, na-adọtakwa ndị na-eme njem nleta sitere gburugburu ụwa. Ndagwurugwu ahụ nwere oké nkume dị ịtụnanya na-acha ọbara ọbara nke dị mita 300 n’ịdị elu, nke guzopụrụ nnọọ iche n’elu ala dị larịị nke ọzara. N’ụzọ dabara adaba, okwu Navajo maka ndagwurugwu ahụ pụtara “oghere dị n’agbata oké nkume.”
A maara ndị Navajo dum maka àgwà obi umeala ha, ezi afọ ọma, na inwe ndị ikwu chiri anya. Mmadụ 170,000 ahụ bi n’ókèala ọha mmadụ ahụ bi karịsịa n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ, n’ikwekọ n’ụzọ ọdịnala. Ụfọdụ ka na-akpa atụrụ ma biri n’ụlọ akịrịka ndị e ji osisi na ájá wuo, a na-akpọ hogan. Nkà ihe ịchọ mma na nke ọrụ aka Navajo abụrụwo nke a ma ama n’ọtụtụ ebe. E ji rug na blanket ha ndị nwere ahịrị tụrụ àgwà ọma ma ọ bụ ihe ịchọ mma e ji mara ya, ndị e ji ajị́ atụrụ kpaa, kpọrọ ihe karịsịa. Ihe ọzọ a maara nke ọma otú ahụ bụ iyeri ọlaọcha Navajo nke nwere nkume turquoise na ihe ndị ọzọ na-abụghị aka mere.
Iweta Ozi Ọma n’Ala Navajo
Eri ihe karịrị afọ 30, Ndịàmà Jehova abịawo n’ala Navajo, ọ bụghị nanị ịga nlere anya kamakwa iwetara ndị nọ n’ógbè a dịmiri adịmi ozi ọma Alaeze Chineke. (Matiu 24:14) Ndị ozi ọsụ ụzọ oge nile na ndị nke pụrụ iche nke Ndịàmà Jehova ebutewo ụzọ n’ọrụ nkwusa ahụ. Ọtụtụ n’ime ha abịawo n’ịza òkù ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na Ndịàmà bi n’ebe ahụ kpọrọ ka e nye aka n’ebe e nweworo mkpa ka ukwuu. Ụfọdụ esitewo n’ọgbakọ ndị dị nso bịa, ebe ndị ọzọ, tinyere ndị si n’agbụrụ dị iche iche nke Ndị Amaala America, esitewo n’akụkụ dịgasị iche iche nke United States bịa.
Ndị ikom na ndị inyom ndị a na-achụ onwe ha n’àjà ejiriwo ozi ha na-eje n’ebe a tụnyere ozi ala ọzọ. N’ihi gịnị? Nke mbụ, asụsụ ala ahụ siri ike nke ukwuu ịmụta n’ihi ụda, ọdịdị, na okwu ha dịcha mgbagwoju anya. Ọzọkwa, ụmụ amaala ahụ, n’ozuzu ha, arapagidesiwo ike n’ụzọ ọdịnala okpukpe ha, ọdịdị ezinụlọ, na ịrụ ọrụ ugbo. Tụkwasị na nke a, ụlọ na ọrụ dị ụkọ maka ndị na-abụghị ndị India, na-eme ka o siere ndị kwafetaworo ike ịnọgide n’ebe a. N’ikpeazụ, ogologo akụkọ ihe mere eme nke mmeso ọjọọ ndị ọcha mesoro ndị a emewo, n’ụzọ kwere nghọta, ka ha ghara inwecha ntụkwasị obi n’ebe ndị si esi bịa nọ.a
Na mbụ, mgbe Ndịàmà jikere nke ọma ma kpọọ taị na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ, a ghọtahiere ha ịbụ ndị Mormon, ọtụtụ ndị jụkwara imepe ụzọ. Mgbe ha gbanwere ma jiwe ejiji ndị na-amachaghị mma, a nabatara ha, ọtụtụ ugboro ruo otu hour ma ọ bụ karị. Ugbu a ndị ahụ na-amata Ndịàmà Jehova, ọ bụ ezie na a nọwokwa na-eji ejiji mara mma ọzọ n’ozi.
Nanị iru na nke ndị bi n’ókèala ọha mmadụ nke Navajo bụ oké ihe ịma aka. Ịkwọ ụgbọala ọtụtụ kilomita n’okporo ụzọ a na-awaghị awa ndị pụrụ ijupụta mgbe nile na nkume, ájá, na apịtị bụ ihe a na-ahụkarị. Dị ka ọ na-adịkarị, nke a na-emekwa ka ụgbọala na-emebikarị, na-emekwa ka ike na-agwụkarị ndị o bu. Ụgbọala pụkwara imi, ma ndị na-agafe na-adịkarị njikere inye aka. Ịkpọtụrụ ndị nwere mmasị, ịga n’ọmụmụ Bible ebe obibi, ma ọ bụ ibuga mmadụ ná nzukọ ndị Kraịst na-achọkarị njem ọgịga na ọlịla na-ewe ọtụtụ hour. Ma Ndịàmà ahụ ji afọ ofufo na-adọgbu onwe ha n’ọrụ, wee si otú ahụ na-egosipụta ịhụnanya ha maka ụmụ amaala ahụ.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 2:8.
Ọ na-amasị ndị Navajo inwe nkwurịta okwu Bible. Ha na-akpọkọtakarị ezinụlọ dum—ụmụaka, ndị mụrụ ụmụ, na nne na nna ochie—ịnụ banyere olileanya nke ebe obibi paradaịs dị n’ihu maka ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe a jụrụ ya ihe o chere na Paradaịs ga-adị ka ya, otu nwoke onye Navajo zara, sị, “Ala ahịhịa ndụ, nke nwere ọtụtụ atụrụ,” na-egosipụta ịhụnanya ha nwere maka ala na ìgwè atụrụ ha. Ha nwekwara mmasị n’akwụkwọ e ji amụ Bible, na-egosi nke a mgbe ụfọdụ site n’inye onyinye ákà, aka ncha, mmiri ara ehi dị ná mkpọ, na ihe ndị yiri ha iji kwadoo ozi Alaeze. Otu ọsụ ụzọ pụrụ iche natara ihe dị ka ụtụ 200 nke Ụlọ Nche na Teta! n’otu afọ, tinyere abụọ site n’aka otu nwoke nọ n’elu ịnyịnya.
Iguzobe “Ogige Atụrụ”
Mgbe o ruru oge okpomọkụ, ọ bụ oge onye ọzụzụ atụrụ na Navajo ji achịga ìgwè atụrụ ya n’ogige atụrụ. Ụlọ atụrụ a maka oge okpomọkụ, nke a họọrọ n’ihi ịdị nso ya n’ebe ịta nri ahịhịa ndụ na ebe inweta mmiri dị mma, na-enyere ìgwè atụrụ aka ime nke ọma. N’echiche ihe atụ, a pụrụ iji Ụlọ Nzukọ Alaeze tụnyere ogige dị otú ahụ—ebe ịta nri ime mmụọ na isi iyi mmiri nke eziokwu. Ndị na-abịa pụrụ ịchọta ihe na-edozi ahụ n’ụzọ ime mmụọ nke na-eme ka ahụ dị ha mma, gbasiekwa ike n’ụzọ ime mmụọ.
Ruo oge ụfọdụ, e nwere nzukọ n’ọnụ ụlọ otu ụlọ akwụkwọ dị na Kayenta, Arizona. E mesịa n’August 1992, site n’enyemaka ọtụtụ narị Ndịàmà bụ́ ndị ọrụ afọ ofufo sitere ọtụtụ steti, e wuru otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ọhụrụ na Kayenta. Ụlọ Nzukọ Alaeze a na ọtụtụ ndị ọzọ dị n’ógbè ahụ na-enye ọrụ nkwusa ahụ echiche nke ihe na-adịgide adịgide n’uche ụmụ amaala ahụ. Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị ọzọ na-elekọta mbara ókèala a na-agụnye ndị dị na Tuba City na Chinle, ndị dịcha n’ókèala ọha mmadụ ahụ, otu dị na Keams Canyon n’ala ndị agbụrụ Hopi n’ókèala ọha mmadụ nke Navajo, ọtụtụ ndị ọzọ dịkwa n’obodo ya na ókèala ọha mmadụ ahụ gbara agbata obi. Gịnị siworo na ya pụta?
Nzaghachi Dị Ukwuu Nye Ozi Alaeze Ahụ
Na Kayenta e mewo ihe karịrị mmadụ iri na abụọ si n’ebe ahụ baptism kemgbe e wuru Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ, na-egosi ngọzi Jehova n’ebe a a na-efe ezi ofufe. Ụlọ nzukọ ahụ na-enye ihe àmà na Ndịàmà Jehova agbanyewo mkpọrọgwụ n’ebe a, na-emekwa ka e nwee obi ike n’ozi ọma Alaeze ha na-ekwusa. N’oge na-adịbeghị anya e kwuru okwu ihu ọha mbụ dabeere na Bible n’asụsụ Navajo n’ebe ahụ. Iri mmadụ anọ ahụ nọ n’ọgbakọ a nwere obi ụtọ ịnabata 245 n’okwu bụ banyere ibu ọrụ ndị mụrụ ụmụ. N’obi ekele, otu ezinụlọ dị mmadụ asatọ mere njem hour atọ iji nụrụ okwu a—nke mbụ ha gatụrụla n’Ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ngwá ọrụ ọzọ bara uru Jehova nyeworo bụ Idi Ndụ n’Elu Ala Rue Mgbe Ebighị-ebi! n’asụsụ Navajo. Ịsụgharị broshuọ ahụ gaa na Navajo, bụ́ asụsụ dị oké mgbagwoju anya, bụ nnukwu ihe ịma aka. Ndị nsụgharị ahụ tinyere ihe karịrị hour 1,000 ná nchịkọta iji jide n’aka na broshuọ ahụ wepụtara ozi Alaeze ahụ n’ụzọ kwesịrị ekwesị. Kemgbe e wepụtara ya ná ngwụsị 1995, Ndịàmà mba ahụ etinyewo ọtụtụ puku n’ime ya, na-eme ka e soro ọtụtụ ndị na-achọ eziokwu na-amụ Bible.
N’ụzọ na-arịwanye elu, e ji asụsụ Navajo eme ihe n’ozi ka ndị nkwusa Alaeze na-amụta ya. Ọgbakọ ndị dị n’ebe ahụ amalitewo iji Navajo eme ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, a na-enwekwa ọtụtụ klas asụsụ Navajo iji nye ndị nkwusa ọzụzụ. Ọzọkwa, a na-asụgharịkwa usoro ihe omume mgbakọ ndị a na-enwe ná mba ahụ gaa na Navajo. Mgbalị ndị a nile ga-edujerịrị ná nzaghachi ka ọbụna ukwuu n’ókèala ọha mmadụ ahụ.
Ihe a na-agaghị elefuru anya n’ime mkpụrụ Alaeze e nwere n’ókèala ọha mmadụ India nke a bụ ezigbo àgwà ime mmụọ ụmụnna anyị na Navajo na-egosipụta. Ruo afọ asaa, Jimmy na Sandra kpọtara ụmụ ha ise kilomita 120 ịga nzukọ kwa izu. Ezinụlọ ahụ na-echeta ọtụtụ ihe ọma banyere ịbụ abụ Alaeze na ịmụkọ Bible ọnụ n’oge ha na-eme ogologo njem ha. Ịhụnanya na ịnụ ọkụ n’obi ndị nne na nna ahụ nwere maka eziokwu ahụ kpaliri ụmụaka ahụ ịgbaso ihe nlereanya ha n’ịghọ ndị na-eto Jehova raara onwe ha nye. Anọ n’ime ha na-eje ozi ugbu a dị ka ndị ọsụ ụzọ, Jimmy bụkwa okenye. Iji tụkwasị ihe n’ọṅụ ezinụlọ a, nwanne Jimmy nke nwanyị bụ́ Elsie ghọrọ n’oge na-adịbeghị anya onye mbụ na-asụ nanị Navajo e mere baptism.
Ndị ọzụzụ atụrụ n’ógbè ahụ na ìgwè atụrụ ha na-eme ka nkume ihe ncheta ndị ahụ chọrọ ókèala ọha mmadụ Navajo mma dịkwuo jụụ. Eri ogologo oge, Aịsaịa onye amụma buru amụma banyere Jehova, sị: “Dị ka onye ọzụzụ atụrụ ka Ọ ga-azụ ìgwè atụrụ Ya, n’ogwe aka Ya ka Ọ ga-achịkọta ụmụ atụrụ, ọ bụkwa n’obi Ya ka Ọ ga-ekuru ha, Ọ ga-ewere nwayọọ na-edu ndị na-enye ụmụ ara.” (Aịsaịa 40:11) Site n’Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ya, bụ́ Jisọs Kraịst, Jehova na-achịkọta gaa n’ebe ịta nri ime mmụọ ya ndị nile nọ n’ókèala ọha mmadụ nke Navajo bụ́ ndị chọrọ ịnụrụ ozi ọma Alaeze ahụ na iru eru inweta ngọzi ebighị ebi ya.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee mbipụta Teta! nke May 8, 1948 (Bekee); February 22, 1952 (Bekee); June 22, 1954 (Bekee); na September 8, 1996.
[Foto dị na peeji nke 24]
Nwanyị Navajo na-azụ atụrụ anụrụ ozi ọma ahụ