Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 5/1 p. 3
  • Gịnị Mere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụkpụrụ Na-adagharị Adagharị nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe
  • Ị̀ Ga-anọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Gịnị Mere Ị Ga-eji Nọgide Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Nọgide Na-ekwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ntụkwasị Obi n’Ụwa Na-ezughị Okè
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 5/1 p. 3

Gịnị Mere Iguzosi Ike n’Ezi Ihe?

IHE ji nke nta karịa otu narị afọ gara aga, Barney Barnato, onye ahịa diamond, si South Africa laghachi England. Mgbe ọ laruru otu akụkọ akwụkwọ akụkọ e dere banyere ya were ya iwe. Ya mere o nyere onye editọ ahụ ihe ụfọdụ e ji aka detuo maka isiokwu nke abụọ, “nanị iji wepụta ihe bụ eziokwu,” ya na akwụkwọ ndọrọ ego maka ùkwú ego buru ibu.

Editọ ahụ, bụ́ J. K. Jerome, tụnyere ihe ndị ahụ e deturu n’ime nkata mkpofu ahịhịa ma nyeghachi akwụkwọ ndọrọ ego ahụ. N’ijuanya, Barnato mụbara onyinye ahụ okpukpu abụọ ozugbo. A jụkwara nke ahụ. “Ego ole ka ị chọrọ?” ka ọ jụrụ. N’icheta ihe ahụ merenụ, Jerome na-ekwu, sị: “Akọwaara m ya na a dịghị eme ya eme—ọ bụghị na London.” Iguzosi ike n’ezi ihe nke akụkọ ya abụghị ihe a na-ere ere ma ọlị.

A kọwawo “iguzosi ike n’ezi ihe” dị ka “izi ezi n’omume; ịkwụwa aka ọtọ.” Onye na-eguzosi ike n’ezi ihe ruru eru ịtụkwasị ya obi. Ma taa, agbasoghị ụkpụrụ ọma—eguzosighị ike n’ezi ihe—na-emebi akụkụ nile nke ndụ.

Na Britain usoro mgbasa ozi emewo ka okwu bụ́ “adịgboroja” na-ewu ewu iji kọwaa mfu nke iguzosi ike n’ezi ihe nke omume. Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Independent si tinye ya, adịgboroja na-emetụta “ihe nile site ná mmekọrịta ịhụnanya na nghọrị ndị gọọmenti ime obodo ruo n’aka azụ ná nnukwu ọda ahịa ofesi.” Ọ dịghị akụkụ ndụ ọ na-emetụtaghị.

Ụkpụrụ Na-adagharị Adagharị nke Iguzosi Ike n’Ezi Ihe

N’ezie, iguzosi ike n’ezi ihe apụtaghị izu okè, ma ọ na-egosipụta àgwà gbara ọkpụrụkpụ n’ime mmadụ. N’ụwa anyị nke ịba ọgaranya ngwa ngwa, a pụrụ ile iguzosi ike n’ezi ihe anya dị ka ihe mgbochi, ọ bụghị àgwà ọma. Dị ka ihe atụ, ụmụ akwụkwọ iji ngwá eletrik ndị bụ ọkpọka aghọ aghụghọ n’ule na-arị elu, ihe ọhụrụ ndị a fọkwara nke nta ka ha bụrụ ndị a na-apụghị ịchọpụtali. Otu prọfesọ mahadum bụ́ onye Britain na-azọrọ na ihe karịrị ọkara ụmụ akwụkwọ Britain nile aghọwo aghụghọ, o dokwara anya na ọ bụghị nanị na Britain ka ọ na-eme.

A gaghịkwa eleghara ihe ọ na-efu ndị aka ha dị ọcha anya mgbe ndị a na-apụghị ịtụkwasị obi na-agha ụgha, na-eduhiekwa. Were ọnọdụ nke obodo India bụ́ Bhopal ebe, na 1984, nsí ikuku gas gburu ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka karịrị 2,500 ma merụọ ọtụtụ narị puku ndị ọzọ ahụ. The Sunday Times kọrọ, sị: “Atụmatụ ihe enyemaka iji nyere ndị o metụtara aka mikpuru n’àgwà rụrụ arụ. . . . Ọrụ inyocha mkpesa ndị bụ ezie abụwo nke ọtụtụ puku nzọrọ aghụghọ, akwụkwọ ndejupụta wayo na akaebe adịgboroja mere ka o sie ike.” N’ihi ya, mgbe afọ iri gasịrị nanị $3,500,000 n’ime $470,000,000 ego iti aka n’obi maka mbibi ka e kesawooro ndị nọ ná mkpa.

Gịnị banyere okpukpe? Olee ihe bụ ọnọdụ ya n’okwu a nke iguzosi ike n’ezi ihe? N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ mgbe ụkpụrụ adịghị aka nke e nwere n’ụwa nkịtị elu. Were bishọp Roman Katọlik bụ́ Eamon Casey dị ka ihe atụ, bụ́ onye kwupụtara na ya bụ nna otu nwa mkpuke, onye nọ n’afọ iri na ụma ugbu a. Ọnọdụ Casey, dị ka akwụkwọ akụkọ Britain bụ́ The Guardian gosipụtara, “apụghị iche ma ọlị.” N’otu ụzọ ahụ, The Times kọrọ, sị: “Eziokwu banyere mmechuihu Bishọp Casey abụghị na mmekpu ya pụrụ iche, kama na ịghọ aghụghọ n’ọnọdụ ịnọ n’alụghị nwunye abụghị ihe ọhụrụ nke ọ na-abụ ihe a na-adịghị ahụkebe.” N’ịkwado nzọrọ a, The Glasgow Herald, Scotland, na-azọrọ na nanị 2 pasent nke ndị ụkọchukwu Roman Katọlik na United States zerewooro mmekọrịta mmekọahụ ma ndị nke nwoke na nwanyị ma ndị nke ndina ụdị onwe. Ma ọnụ ọgụgụ ahụ ò ziri ezi ma ọ bụ na o zighị, ọ na-egosi aha ndị ụkọchukwu Katọlik meworo n’ihe banyere omume.

N’iche ihe atụ dịgasị otú a ihu, ò kwere omume na mmadụ ga-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe? Ò ruru ihe ọ na-efu? Gịnị ka ọ ga-ewe, oleekwa ụgwọ ọrụ ndị e nwere maka ime otú ahụ?

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya