Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/1 p. 19
  • “Kootu Dị Nsọ nke Trier”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Kootu Dị Nsọ nke Trier”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Aga Ikiri Uwe Ahụ?
  • ‘Jide Uwe Mwụda nke Nwoke Bụ́ Onye Juu Aka’
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2017
  • Ezinụlọ Jehova Nwere Ịdị N’otu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Jigide Ịdị n’Otu na Mgbe Ikpeazụ A
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ịdị n’Otu Ndị Kraịst Na-eme Ka E Too Chineke
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2010
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/1 p. 19

“Kootu Dị Nsọ nke Trier”

TRIER, nke nwere akụkọ ihe mere eme dị laa azụ n’afọ 2,000, bụ obodo ukwu kasị ochie na Germany.a Ruo ọtụtụ narị afọ Trier nwere njikọ siri ike n’ebe Chọọchị Katọlik nọ. Na 1996 katidral dị na Trier wepụtara ihe ncheta mgbe ochie nke e kwuru na ọ fọrọ nke nta ka ọ dị ochie dị ka obodo ukwu ahụ n’onwe ya. A na-akpọ ya Kootu Dị Nsọ nke Trier.

Kootu ahụ dị 1.57 mita n’ogologo na 1.09 mita n’obosara, nweekwa aka mkpirikpi. E ji ogho mee ya, dị ka Hans-Joachim Kann sikwa kwuo n’akwụkwọ ya bụ́ Wallfahrtsführer Trier und Umgebung (Nduzi Njem Ala Nsọ Gaa Trier na Gburugburu Ya), eleghịkwa anya a na-eyi ya dị ka uwe mgbokwasị. Ụfọdụ atụmatụ na-ekwu na uwe nke mbụ ahụ—bụ́ nke e jiworo ákwà ndị ọzọ dozie ihe dị ukwuu na ya ma gbakwụnye ihe eri ọtụtụ narị afọ—dị laa azụ na narị afọ nke abụọ ma ọ bụ ọbụna narị afọ nke mbụ O.A. Ọ bụrụ na o ziri ezi, nke ahụ ga-eme ka ọ bụrụ ákwà oge gboo, ihe mara mma ịdị n’ebe ngosi ihe mgbe ochie.

Otú ọ dị, ụfọdụ na-ekwusi ike na ọ bụghị nanị na uwe ahụ bụ nke a na-adịghị ahụkebe kamakwa na ọ dị nsọ—bụ́ ihe mere e ji kpọọ ya Kootu Dị Nsọ. Nke a bụ n’ihi na o nweghị ọgbụgba, dị ka uwe ime nke Jisọs Kraịst yiri. (Jọn 19:23, 24) Ụfọdụ na-azọrọ na “Kootu Dị Nsọ” ahụ bụ nke Mesaịa ahụ n’ezie.

Otú kootu ahụ si bịa Trier edoghị anya. Otu akwụkwọ ntụaka na-ekwu na ọ bụ “Helena, bụ́ eze nwanyị ukwu, nne Constantine Onye Ukwu nyere ya obodo ahụ.” Kann na-arụtụ aka na akụkọ mbụ a pụrụ ịdabere na ya banyere ịdị adị nke uwe ahụ na Trier bụ malite na 1196.

Kootu ahụ, bụ́ nke e debere n’ime katidral, abụrụwo nke a na-ewepụta maka nkiri site n’oge ruo n’oge eri narị afọ nke 16. Dị ka ihe atụ, e mere nke a na 1655, n’oge na-adịghị anya mgbe Agha Iri Afọ Atọ ahụ gasịrị, bụ́ nke fuworo Trier ihe dị ukwuu. Site n’oge ruo n’oge, ire ihe ncheta njem ala nsọ enyewo ego dị ukwuu.

E nwewo njem ala nsọ atọ nke “Kootu Dị Nsọ” na narị afọ a—na 1933, 1959, na 1996. Na 1933 a mara ọkwa njem ala nsọ ahụ n’otu ụbọchị ahụ a họpụtara Hitler dị ka onye nọ n’isi ọchịchị Reich nke Germany. Kann na-arụtụ aka na ndabakọ nke ihe omume abụọ a n’otu ụbọchị na-eme ka ọnọdụ ndị gbara njem ala nsọ ahụ gburugburu pụta ìhè. Ìgwè ndị agha Nazi yi uwe agha bụ ndị e ji dugharịa ndị njem ala nsọ nọ n’èzí katidral ahụ. Nde mmadụ abụọ na ọkara kiriri uwe ahụ n’afọ ahụ.

Herbert, onye biri na Trier ruo ọtụtụ afọ, ji njem ala nsọ nke 1996 tụnyere nke 1959. “Na 1959 okporo ámá nile jupụtara ná mmadụ, nweekwa ọdụ ahịa ndị na-ere ihe ncheta n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akụkụ okporo ámá ọ bụla. N’afọ a ihe ahụ dum dị nnọọ jụụ karị.” N’ezie, nanị 700,000 kiriri uwe ahụ na 1996, nke ji otu nde dị ala karịa ọnụ ọgụgụ nke 1959.

N’ihi Gịnị Ka Ha Ji Aga Ikiri Uwe Ahụ?

Chọọchị na-ekwusi ike na e kwesịghị iwere uwe ahụ dị ka ihe a na-efe ofufe. A na-ewere uwe ahụ na-enweghị ọgbụgba dị ka ihe nnọchianya nke ịdị n’otu chọọchị. Frankfurter Allgemeine Zeitung ahụ na-akọ na mgbe ọ na-ama ọkwa njem ala nsọ ahụ, Bishọp Spital sịrị: “Ọnọdụ a na-adịghị ahụkebe dị n’ụwa anyị na-echere anyị bụ ndị Kraịst aka mgba ka anyị nwee azịza ndị a na-adịghị enwekebe. Anyị aghaghị iguzogide ọnọdụ na-arị elu nke ịkpọasị, mmeso obi ọjọọ, na ime ihe ike.” Bishọp ahụ kọwara na ikiri uwe ahụ ga-echetara mmadụ banyere ịdị n’otu.

Ma n’ihi gịnị ka “Kootu Dị Nsọ” ahụ ji dị onye ọ bụla mkpa iji bụrụ onye e chetaara banyere ịdị n’otu chọọchị? Gịnị ma ọ bụrụ na e bibie ma ọ bụ dọwaa uwe ahụ, ma ọ bụ kpughee ya dị ka adịgboroja? Ịdị n’otu chọọchị ọ̀ ga-anọzi n’ihe ize ndụ? Gịnị banyere ndị na-enweghị ike ime njem ala nsọ gaa Trier? Ọ̀ bụ na ha amachaghị banyere ịdị n’otu n’ime chọọchị?

Akwụkwọ Nsọ ekwughị banyere ndị Kraịst oge mbụ inwe mkpa ọ bụla nke ihe ga-echetara ha otú ịdị n’otu ndị Kraịst si dị mkpa. N’ezie, Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst ume n’okwu ndị a: “Anyị sitere n’okwukwe na-ejegharị, ọ bụghị n’ọhụhụ ụzọ.” (2 Ndị Kọrint 5:7) E si otú ahụ kọwaa ịdị n’otu ndị Kraịst nwere dị ka “ịdị n’otu nke okwukwe.”—Ndị Efesọs 4:11-13.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee Teta! nke April 22, 1980 (Bekee), peji nke 21-23.

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya