Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 4/1 p. 2-4
  • N’ihi Gịnị Ka Oge Ndị A Ji Dị Oké Njọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ihi Gịnị Ka Oge Ndị A Ji Dị Oké Njọ?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • N’ihi Gịnị Ka Ndị Ọma Ji Ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Akụkụ nke 1—Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
    Chineke Ọ̀ Na-eche Banyere Anyị n’Ezie?
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 4/1 p. 2-4

N’ihi Gịnị Ka Oge Ndị A Ji Dị Oké Njọ?

MGBE ị na-anọdụ ala ịgụ akwụkwọ akụkọ ma ọ bụ ikiri akụkọ TV ma ọ bụ ige ntị ná mgbasa akụkọ redio, ị na-atụ anya akụkọ ọjọọ ụfọdụ, ọ́ bụghị ya? Ikekwe o jughị gị anya ịmara na agha na-aga n’ihu ka na-akpọtụ, na mpụ ime ihe ike ka juru ebe nile, ma ọ bụ na ụnwụ nri ka na-amịkọ ume nke ala na-emepe emepe.

Ọ bụrụ na i bitụ ebe dị anya site n’ebe ihe ndị a na-eme, ikekwe akụkọ ndị dị otú ahụ adịghị enye gị oké nsogbu mgbe nile. E kwuwerị, ònye pụrụ inwe mmetụta maka ìgwè mmadụ nile ahụ na-ata ahụhụ? Ọ bụrụgodị otú ahụ, o siri oké ike ịbụ onye ọ na-emetụtaghị mgbe anyị hụrụ n’onwe anyị ụzọ ahụhụ si emetụta ndị mmadụ n’otu n’otu. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ebe ọ bụ otu ihe ịgụ banyere agha ma tụgharịa uche ná ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị e gburu, ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịgụ banyere obere Adnan, nwata nwoke onye Bosnia dị afọ itoolu bụ́ onye e gburu nne ya mgbe bọmbụ bibiri ebe obibi ha. Nanị ọnwa ụfọdụ ka e mesịrị, onye zoro ezo gbagburu nna Adnan ka ha nọ na-agakọ n’otu okporo ámá. Nanị izu ole na ole n’ihu, n’anya ya abụọ, nwanne ya nwanyị gbagidere ọbara nwụọ, bụ́ onye ogbunìgwè nke dara n’ogige ụlọ akwụkwọ metụtara. Ndị dọkịta gwọrọ Adnan maka mkpasasị uche chọpụtara na nwata nwoke ahụ adịghị enwe mkpali, adịghị enwe mmetụta ọ bụla—ọbụna ọchịchọ ịmata ihe. Egwu na icheghachi uche azụ na-emetụta hour ndị ọ mụ anya; nrọ ọjọọ ekweghị ya hie ụra nke ọma. Adnan abụghị nnọọ ihe dị ná ngụkọ ọnụ ọgụgụ. Ọ bụ nwatakịrị na-ata ahụhụ; anyị aghaghị inwe ọmịiko n’ahụ ya.

Otú ahụ ka ọ dịkwa nsogbu ụwa ndị ọzọ. Ọ bụ otu ihe ịgụ banyere ụnwụ nri; ọ bụkwa nnọọ ihe ọzọ ịhụ ihe osise nke nwata nwanyị dị afọ ise nke afọ toro ma nwee ụkwụ na aka azịza, onye dị nnọọ ndụ nke agụụ na-agụgbu. Ọ bụ otu ihe ịgụ banyere ndekọ ọnụ ọgụgụ nke mpụ; ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịnụ banyere nwanyị di ya nwụrụ meworo agadi nke e ji obi ọjọọ tie ihe, zuo ohi, ma dinaa n’ike. Ọ bụ otu ihe ịgụ banyere ndakpọ nke ezinụlọ; ọ bụ nnọọ ihe ọzọ ịchọpụta na otu nne kpachara anya kwụwa nwa ya agụụ ma metọọ ya n’ụzọ obi ọjọọ.

Ọ na-egbu mgbu ịgụ banyere ihe ndị dị otú ahụ. Ma lee ka o si ka njọ mgbe otu n’ime ihe otiti ndị a zuru ụwa ọnụ metụtara anyị kpọmkwem! Mgbe ihe ọjọọ dakwasịrị gị n’onwe gị, ọnọdụ buru ibu nke akụkọ ụwa na-egosipụta pụrụ iri ọnụ. Ọ bụ ihe na-atụ ụjọ ikweta eziokwu ahụ bụ na ahụhụ sitere n’ime mpụ, agha, ụnwụ nri, na ọrịa na-amụba n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-enwetụbeghị ụdị ya n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Mmetụta nke ime ihe banyere ihe ndị bụ eziokwu nke narị afọ nke 20 nke a pụrụ ịdị ukwuu—mgbagwoju anya, egwu, na ịda mbà n’obi bụ ihe a na-ahụkarị.

Ndị nọ n’ọtụtụ okpukpe na-achọ azịza nye ajụjụ ndị na-enye nsogbu dị otú ahụ dị ka, N’ihi gịnị ka ihe ji dị oké njọ? Ebee ka ihe a kpọrọ mmadụ na-etinye isi?

N’ụzọ dị mwute, okpukpe taa adịghị enye azịza ndị na-eju afọ. Mgbe i bu ụzọ hụ ajụjụ nke dị n’ihu magazin a, ị pụrụ ijiworị ịrụ eziokwu ụka meghachi omume—mmeghachi omume a pụrụ ịghọta. Okpukpe ndị na-ekwenyesi ike n’ozizi bụ isi na-agbalị mgbe mgbe ịghọta site na Bible ihe na-adịghị nnọọ n’ime ya—kpọmkwem ụbọchị na hour nke mbibi ụwa a. (Lee Matiu 24:36.) Ndị na-ebipụta magazin a na-ahọrọ ikwe ka Bible kọwaa onwe ya. Ọ pụrụ iju gị anya ịmara na ihe Bible kwuru banyere mgbe ikpeazụ bụ eziokwu ma bụrụ ihe ezi uche dị na ya. Bible nyekwara ihe karịrị nkọwa nke ihe mere ihe ji dị oké njọ. Ọ na-enyekwa olileanya maka ọdịnihu, nke na-akasi obi n’ezie. Anyị na-akpọ gị òkù ịtụle isiokwu ndị na-esonụ iji hụ ụzọ nke a si dị otú ahụ.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 2]

Ihu akwụkwọna peji nke 32: AFP/Corbis-Bettmann

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]

Jobard/Sipa Press

    Akwukwo Igbo (1984-2026)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2026 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya