Iwetara Ndị Nọ n’Ụlọ Mkpọrọ Nnwere Onwe Ime Mmụọ
“ANYỊ anọwo na-echere gị.” “N’abalị ole na ole ndị a gara aga, arọwo m nrọ banyere ọbịbịa gị.” “Unu emeela maka izite mmadụ ka ọ bịa na-eleta anyị mgbe nile.” “Anyị chọrọ ikwupụta ekele anyị n’ihi ngọzi nile na-erughịịrị anyị ndị anyị nataworo site n’aka Jehova na nzukọ ya na maka nri ime mmụọ a na-enye n’oge kwesịrị ekwesị.”
Gịnị kpatara okwu ekele ndị a? Ndị a bụ ụfọdụ okwu ekele sitere n’ọnụ ndị a tụbara n’ụlọ mkpọrọ dị iche iche na Mexico. Ha nwere ekele ná nlebara anya ha na-enweta site n’aka Ndịàmà Jehova, bụ́ nke wetawooro ha nnwere onwe ime mmụọ ọbụna mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Na Mexico e nwere ụlọ nga 42 ebe Ndịàmà Jehova na-eje ozi mgbe nile maka mkpa ime mmụọ nke ndị nọ n’ime ha. A na-akpọ ebe ndị a Centro Readaptación Social (Ụlọ Ọrụ Mkpụzigharị Uche Ọha Mmadụ). N’ụfọdụ n’ime ụlọ mkpọrọ ndị a, a na-enwechi nzukọ ndị Kraịst anya, ọbụna na ha na-arụpụtakwa ọtụtụ ihe dị nnọọ mma. Dị ka ihe atụ, n’otu ngụkọ e mere n’oge na-adịbeghị anya, ihe dị ka mmadụ 380 na-abịa nzukọ n’ebe ndị a. N’oge ahụ, a nọ na-eduzi nkezi nke ọmụmụ Bible 350. Iri atọ na asaa eruwo eru ịmalite ime nkwusa, 32 ararawokwa ndụ ha nye Jehova, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri.
Otú E Si Arụ Ọrụ Ahụ
Olee otú Ndịàmà Jehova si arụ ọrụ ime nkwusa ha n’ebe ndị a? Ha na-ebu ụzọ agakwuru ndị ọrụ ọ dị n’aka ịnata ikike e dere ede iji banye n’ime ụlọ mkpọrọ, na-akọwa nzube nke nleta ahụ—ịkụziri ndị mkpọrọ ahụ ụzọ ha ga-esi mee ka ndụ ha ka mma ma jeere Chineke ozi n’ụzọ na-amasị ya.
N’oge nke ọ bụla ndị isi enyewo nkwado ha. Ndị ọrụ a na-enwe mmasị ná ntụziaka Bible a na-enye ndị mkpọrọ ahụ. Ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụwo na Ndịàmà Jehova na-erube isi n’iwu nchịkwa nchebe ndị e nwere maka ebe ndị a. Ha ekwewo ka ndị ozi a na-eme nleta nwee nzukọ ha n’ọfịs, ụlọ iri ihe, na ụlọ ọrụ dị iche iche. N’otu ebe, ọbụna na e nyere Ndịàmà ikike iwu otu obere Ụlọ Nzukọ Alaeze, dị ka e gosiri n’ahụmahụ na-esonụ nke onye nlekọta na-ejegharị ejegharị na ndịda ọwụwa anyanwụ Mexico kọrọ.
“Ná mmalite 1991 anyị malitere ileta ụlọ mkpọrọ dị na Tehuantepec, Oaxaca, ebe anyị chọpụtara agụụ ime mmụọ dị ukwuu. N’oge na-adịghị anya anyị malitere ọmụmụ Bible 27. N’ihi mmasị ndị mkpọrọ ahụ nwere, a haziri nzukọ ise nke ọgbakọ. Otu n’ime ndị mkpọrọ ahụ, onye gosiri ịhụnanya dị ukwuu maka Jehova, kpebiri iwu otu obere Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ ka e wee nwee ebe a ga na-enwe nzukọ. Ọ gakwuuru onye ntụzi ụlọ mkpọrọ ahụ ma rịọ maka nkwado, ndị isi ahụ kwenyere nke ọma. Ná mmalite December 1992, ndị mkpọrọ isii ruru eru dị ka ndị nkwusa nke ozi ọma ahụ. N’ihi ọganihu e gosiri, e mere ndokwa ime Ememe Ncheta n’ime ụlọ mkpọrọ ahụ. Anyị rịọrọ onye ntụzi ụlọ mkpọrọ ahụ ka o nye ikike iji webata ihe nnọchiteanya ndị ahụ—bred na mmanya—mgbe nkwurịta okwu were hour anọ gasịkwara, e nyere ikike.
“Ọ dabara na n’April 3, 1993 (ụbọchị atọ tupu Ememe Ncheta ahụ), a tọhapụrụ ụfọdụ ndị mkpọrọ. Mgbe otu onye bụ́ onye nkwusa natara akwụkwọ ntọhapụ ya, ọ rịọrọ ka ya gwa onye ntụzi ụlọ mkpọrọ ahụ okwu iji nata ikike ịnọrọ ruo mgbe e mesịrị Ememe Ncheta ahụ. Nke a juru onye ntụzi ahụ anya n’ezie, ebe ọ bụ na nke a abụghị arịrịọ a na-arịọkarị, ma n’ihi oké mmasị onye mkpọrọ ahụ nwere n’ịga Ememe Ncheta ahụ n’ụlọ mkpọrọ n’ebe ahụ, o mere ihe ahụ a rịọrọ. Mmadụ 53 bịara Ememe Ncheta ahụ, bụ́ ndị bepụtara anya mmiri nke ọṅụ ná ngwụsị nke usoro ihe omume ahụ. Anyị ekwekọrịtawo ịkpọ ìgwè a ‘Cereso Nnwere Onwe,’ n’ihi na ha nweere onwe ha n’ụzọ ime mmụọ.”
E nwere oké mmasị n’ọrụ Ndịàmà Jehova n’ebe ndị a. N’otu n’ime ụlọ mkpọrọ ndị a, onye nlekọta dị n’aka na-ekwu n’ezoghị ọnụ na ịga nzukọ nke Ndịàmà Jehova bụ “usoro ọgwụgwọ” maka ịkpụzigharị uche ndị mkpọrọ ngwa ngwa.
Usoro Ịkpụzigharị Uche nke Na-aga nke Ọma
Ọrụ Ndịàmà Jehova akpatawo mkpụzigharị uche zuru ezu nke ọtụtụ ndị mkpọrọ. Ọ bụ ezie na ọ na-abụkarị eziokwu na ndị gabuworo mkpọrọ na-alaghachi ná ndụ nke ime mpụ ozugbo a tọhapụrụ ha, ndị narawooro ozi nke Okwu Chineke n’ezie agbanwewo kpam kpam. Mgbanwe ha na-echetara anyị okwu nke Pọl onyeozi: “Ndị na-akwa iko . . . , ma ọ bụ ndị ohi, ma ọ bụ ndị anyaukwu, ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, ma ọ bụ ndị nkwutọ, ma ọ bụ ndị na-apụnara mmadụ ihe, ha agaghị eketa alaeze Chineke. Otú a ka ụfọdụ n’etiti unu dịkwarịị: ma unu sachara onwe unu, ma e doro unu nsọ, ma a gụrụ unu ná ndị ezi omume n’aha Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ya na n’ime Mmụọ nke Chineke anyị.”—1 Ndị Kọrint 6:9-11.
Mgbanwe dị ịrịba ama n’ụdị mmadụ ha bụ na-apụta ìhè mgbe ha kwupụtara echiche ha. Miguel, onye nọ n’ụlọ mkpọrọ Campeche dị na Campeche City, si otú a kwuo ya: “Taa apụrụ m iji ọṅụ kwuo na ana m agụ onwe m n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ndị nwere olileanya ahụ e dekọrọ na 2 Pita 3:13 na Matiu 5:5.” José, onye nọ na Koben, n’ụlọ mkpọrọ Campeche, kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na m bụ onye mkpọrọ, ọ pụkwara ịbụ na mpụ m dị oké njọ, ana m aghọta na Jehova dị obi ebere nke ukwuu, ọ na-aṅakwa ntị n’ekpere na arịrịọ m. Ọ pụrụ ịgbaghara njehie m ma nye m ohere nke iji ihe fọdụrụ ná ndụ m kerịta ozi ọma ahụ banyere Alaeze Chineke. Ekele dịrị ndị okenye anyị maka oge ha ji eleta anyị n’ụlọ nga ka anyị wee nwee ike irite uru site ná nkwa nile nke Alaeze Chineke. Lee aha ngọzi ọma ha bụ! M̀ pụrụ ikwu na m bụ onye mkpọrọ? Ee e, Jehova enyewo m nnwere onwe ime mmụọ dị m mkpa.”
Gịnị na-eme ka ndị ogbu mmadụ, ndị na-edina mmadụ n’ike, ndị na-esunye ọkụ n’ụlọ, ndị ohi, na ndị ọzọ gbanwee iji ghọọ ndị Kraịst na-ebi ndụ ziri ezi? Dị ka ndị ikom a kwa si kwuo, ọ bụ ike na-agbanwe ihe nke Okwu Chineke na iso ezi ndị raara onwe ha nye na-enwe ezi mkpakọrịta. Ihe banyere Tiburcio, onye a kpọchiri nanị ya n’ụlọ mkpọrọ dị na Mazatlán, Sinaloa, na-egosi ihe ịga nke ọma nke usoro mkpụzigharị nke a. Ọ nọbuwo n’ụlọ nga dị na Concordia, Sinaloa, ebe o nwere ọtụtụ nsogbu n’ihi obi ọkụ ya. Nwunye ya bụ otu n’ime Ndịàmà Jehova, ọ na-emesobukwa ya n’ụzọ jọrọ oké njọ, ọbụna mgbe ọ bịara ileta ya n’ụlọ nga. O nwere ndidi ma nọgide na-abịa ileta ya, ya mere di ya gwara ya ka o wetara ya akwụkwọ bụ́ Ị Pụrụ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Ala, nke ọ malitere ịmụ nanị ya.a Ọ rịọziri ka mmadụ na-abịa n’ụlọ nga ịmụrụ ya ihe. Ọ malitere inwe ọganihu ime mmụọ, mmekọrịta ya na ndị ọzọ malitekwara ịdịwanye mma. A kpọfere ya n’ụlọ mkpọrọ dị na Mazatlán ebe e nwere otu ìgwè na-amụ Bible, ọ bụkwa onye nkwusa ugbu a. Ọ na-ekwu, sị: “Ugbu a, tinyere nwunye m na ụmụ m na ndị mụ na ha nọkọrọ n’ụlọ mkpọrọ, enwere m obi ụtọ dị ukwuu inwe ike ịṅa ntị n’eziokwu Bible n’ebe a, n’olileanya bụ na n’ọdịnihu dị nso, a ga-atọhapụ m, m ga-enwekwa ike ịga mgbakọ na nzukọ nile nke ọgbakọ.”
Ọzọkwa, e nwere Conrado, onye nwere nnọọ obi ụtọ ná mgbanwe ndị o nweworo ike ime ná ndụ ya. O nwere nsogbu alụmdi na nwunye dị ukwuu nke na nwunye ya hapụrụ ya. Ya mere ọ chọtara ebe mgbaba n’ọgwụ ọjọọ. Ka oge na-aga ọ ghọrọ onye na-atụ mgbere ọgwụ ọjọọ. E jidere ya ma tụọ ya mkpọrọ n’ihi iji ụgbọ mmiri buo wii wii na cocaine. N’ụlọ mkpọrọ e nwere otu ìgwè so Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, a kpọkwara ya òkù ka o soro ha mụọ ihe. Ọ na-ekwupụta echiche ya n’ụzọ dị otú a: “Ụzọ dị n’usoro e si duzie nzukọ ndị ahụ, usoro nnyocha site ná mbipụta dị iche iche, na eziokwu ahụ bụ na ihe nile dabeere na Bible masịrị m. Arịọrọ m maka ọmụmụ Bible ozugbo ahụ ma malite ịga nzukọ.” Nke ahụ bụ na January 1993. Ugbu a Conrado esiwo n’ụlọ mkpọrọ pụta ma nọgide na-enwe ọganihu n’ọgbakọ ndị Kraịst.
Islas Marías
Na Mexico e nwere ụlọ mkpọrọ a na-atụ egwu nke nwere àgwàetiti anọ a na-akpọ Islas Marías. Ndị mkpọrọ pụrụ ime njem n’àgwàetiti ntaramahụhụ ahụ bụ́ ebe a tụrụ ha mkpọrọ. Ụfọdụ bi n’ebe ahụ ha na nwunye ha na ụmụ ha.
E guzobewo otu obere ọgbakọ. Ụmụnna nwoke atọ sitere Mazatlán na-aga ebe ahụ otu ugbo n’ọnwa, na-enye aka iduzi nzukọ, na-eweta akwụkwọ, na-enyekwa agbamume. Mgbe ụfọdụ onye nlekọta sekit na-aga ebe ahụ ileta ha. Nkezi ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa dị n’agbata 20 na 25. E nwere ndị nkwusa anọ e mere baptism na abụọ a na-emebeghị baptism. Onye nlekọta ahụ na-ejegharị ejegharị na-akọ na “ụfọdụ na-eji ụkwụ aga kilomita 17 [mile 10] ịga nzukọ na Sunday, ha aghaghịkwa iji ọsọ ọsọ hapụ nzukọ ka ha wee nwee ike ịlaghachi maka oge ịkpọ aha. N’ije ije ọkụ ọkụ, ọ na-ewe ihe karịrị hour abụọ iji laghachi.” Otu n’ime ụmụnna nwoke, onye mụtara eziokwu n’ụlọ mkpọrọ ahụ, kwuru n’oge na-adịbeghị anya, sị: “Ana m enwebu mmasị n’isi n’ebe a pụọ n’isi nso, ma ugbu a ọ pụrụ ịbụ mgbe ọ bụla ọ bụ uche Jehova, ebe ọ bụ na m nwere ọtụtụ ọrụ m ga-arụ n’ime n’ebe a.”
Anyị nwere obi ụtọ ịhụ na eziokwu ahụ na-akpa ike ya ịtọhapụ ndị nwere obi eziokwu, ndị na-achọ ụzọ isi mee ihe na-atọ Jehova ụtọ. A tọhapụwo ihe karịrị iri na abụọ ná ndị a, bụ́ ndị mụtara eziokwu ahụ n’ụlọ mkpọrọ, bụrụ ndị mere baptism, na-ebikwa ndụ kwesịrị nsọpụrụ ugbu a dị ka ndị ohu Chineke, ụfọdụ na-aghọ ọbụna ndị okenye ọgbakọ. E gosipụtawo n’ụzọ dị egwu ike Bible nwere ịgwọta obi na ịgbanwe ndị mmadụ. Ozugbo ndị ikom a a tụworo mkpọrọ n’ihi ịda iwu dị iche iche banyere n’ụzọ ìhè nke Okwu Chineke, ha na-enweta ezi nnwere onwe ahụ Jisọs kwere ná nkwa mgbe ọ sịrị: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32; Abụ Ọma 119:105.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 23]
Ọtụtụ ritere uru site n’eziokwu ndị Kraịst ha mụtara n’ụlọ mkpọrọ