Ọnọdụ Maka Uto n’Equatorial Guinea
UTO dị mma nke ahịhịa bụ ihe mbụ onye njem ga-ahụ mgbe ụgbọelu ya wụrụ ụkwụ n’ọdụ ụgbọelu mba nile nke Equatorial Guinea. Osisi toro ogo nke ukwuu, bụ́ ndị tokarịrị ụlọ ọdụ ụgbọelu ahụ, gbara okporo ụzọ ụgbọelu si agba gburugburu. Ahịhịa ndị na-eto nke ọma jupụtara site n’ụsọ oké osimiri ruo ọnụ ọnụ elu ugwu, nke mmiri ozuzo dị ukwuu na okpomọkụ dị oge nile n’afọ n’etiti afọ ndị 1980 kpaliri uto ha.
Ụdị uto ọzọ dị ukwuu na-ewerekwa ọnọdụ n’Equatorial Guinea, “ụba nke Chineke.” (Ndị Kọlọsi 2:19) Dị ka onye ọrụ ọchịchị Etiopịa ahụ bụ́ onye chọrọ enyemaka n’aka Filip, ọtụtụ ndị nọ n’ebe a nwere ọchịchọ siri ike ịghọta Akwụkwọ Nsọ. (Ọrụ 8:26-39) Ọ bụghị ihe ọhụrụ mmadụ ịbịakwute otu n’ime Ndịàmà Jehova n’okporo ámá ma kwuo ka e duziere ya ọmụmụ Bible. Ihe dị ka Ndịàmà 325 nọ n’Equatorial Guinea na-eduzi ihe karịrị otu puku ọmụmụ Bible.
Ịkụ Mkpụrụ n’Oge Mmalite
Equatorial Guinea, mba kasị nta n’Africa, dị ná ndịda Nigeria na Cameroon. (Lee map.) Ndịàmà bụ́ ndị Nigeria ndị bịara ịchọ ọrụ n’ubi cocoa wetara ozi ọma na nke mbụ ya n’ebe a. Ọ bụ ezie na e guzobere ọtụtụ ọgbakọ na-asụ Bekee, e mesịrị kpoghasịa ha mgbe ụmụnna ndị a na-aghaghị ịlaghachi Nigeria. Otú ọ dị, ngwa ngwa e nyesịrị mba ahụ nnwere onwe na 1968, e kenyere di na nwunye atọ bụ́ ndị ozi ala ọzọ nke Watchtower ọrụ n’ebe a. Ha enweghị ike ịnọte anya n’ihi ihe isi ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma ịgba àmà ha rụpụtara ihe ọma.
Santiago, otu n’ime ndị ozi ala ọzọ ahụ, zutere Buenaventura, nwoke toro ogologo, fụrụ afụ nke ndị bi n’ógbè ahụ maara dị ka nwoke ike. Ọ bụ nwoke nwere mmasị n’okpukpe, nke na-akwanyere Bible ùgwù, ma o nwere obi ọkụ. Mkparị kasị nta zuru ezu ime ka o tie mmadụ ihe. Mgbe iwe bịara ya n’ebe a na-aṅụ mmanya, ndị nile nọ ebe ahụ gbasasịrị, ọbụna si na window na-amapụ iji zere ọkpọ ya. N’ezie, ka ọ na-ege Santiago ntị, o bu n’obi ịkụ ya ihe ma ọ bụrụ na o nyeghị ihe nnwapụta Akwụkwọ Nsọ na-edo anya maka ihe o kwuru. ‘Ọ dịghị onye gaje itigharị nwoke ike anya,’ ka ọ gwara onwe ya. Ihe ọ nụrụ masịrị ya, karịsịa banyere olileanya nke ndụ ebighị ebi na paradaịs elu ala, ya mere o kwere ka e duziere ya ọmụmụ Bible.
Ka ọmụmụ ihe ahụ na-aga n’ihu, mmasị Buenaventura nwere ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs siwanyere ike, ọ mụtakwara na ọ ghaghị ime ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke iji nweta ụdị ihe mgbata n’ọsọ ahụ. N’ịghọta na ezi ndị Kraịst agaghị ‘enyeghachi onye ọ bụla ihe ọjọọ n’ọnọdụ ihe ọjọọ,’ ọ malitere ime ezi mgbalị iji chịkwaa iwe ya.—Ndị Rom 12:17.
Nke bụ ule n’ezie bịara otu ụbọchị mgbe ọ kụdara iko nke otu onye bịara ịṅụ mmanya n’ebe a na-aṅụ mmanya n’amaghị ama. Nwoke ahụ were iwe ma tie ya ihe. N’otu ntabi anya, ndị ọzọ nọ n’ebe ahụ a na-aṅụ mmanya gbasasịrị, na-atụ anya ka ọgụ malite. Ma Buenaventura ji obi umeala kwụọ ụgwọ iko ahụ kụwara akụwa, zụọrọ nwoke ahụ mmanya ọzọ, ma rịọ ya mgbaghara maka akpachaghị anya ya. Mgbe ndị agbata obi hụrụ na ọmụmụ Bible emewo mgbanwe ndị dị otú ahụ n’ime ya, ọtụtụ dị njikere isoro ya mụọ ihe. Mgbe ọ na-erule oge e mere Buenaventura baptism, ọ nọworị na-eduzi ọmụmụ Bible ise. O jewo ozi dị ka onye okenye kemgbe afọ ise gara aga, ọ bụkwa eziokwu na ndị mmadụ ka na-akpọ ya nwoke ike, ugbu a ha na-eme otú ahụ n’egwuregwu.
“Ndị Maara Mkpa Ime Mmụọ Ha”
N’ime afọ ndị 1970 Ndịàmà ole na ole nke ógbè ahụ gara n’ihu ime nkwusa na izukọ ọnụ ruo ókè ha pụrụ ime. Ka oge na-aga, ọtụtụ di na nwunye ndị ozi ala ọzọ si Spain bịara inye aka. Andrés Botella, bụ́ onye jeworo ozi n’Equatorial Guinea ruo afọ 12, na-echeta na ngwa ngwa ọ bịarutechara, obi dị ya ụtọ otú ndị mmadụ siri n’ezie ‘mara mkpa ime mmụọ ha.’ (Matiu 5:3, NW) “Ọ bụwo ihe obi ụtọ n’ezie iduziri ndị dị otú ahụ nwere ekele ọmụmụ Bible,” ka ọ na-ekwu.
Mary, nwanna nwanyị bụ́ onye Spain, nọ na-eduziri otu nwa agbọghọ aha ya bụ María Bible, bụ́ onye kwuru na nne na nna ya, Francisco na Fausta, nwekwara mmasị ịmụ ihe. Ebe ọ bụ na Mary nọ na-eduzi ọmụmụ ihe 15, nne na nna María ebirikwa n’ebe dịtụ anya, ọtụtụ izu gara tupu ya enwee ike ije leta ha.
Mgbe Mary na di ya, bụ́ Serafín, mesịrị zute nne na nna nwa agbọghọ ahụ, ha enweworị akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi n’ime Paradaịs n’Elu Alaa na Bible, ọ dịkwa ha ọkụ n’obi ịmalite ịmụ ihe. Ya mere ha malitere ozugbo. Serafín chọpụtara na nne na nna María maara ihe dị n’ime ya nke ọma. Otu ihe ahụ mere ná nleta nke abụọ mgbe ha gụsịrị isiakwụkwọ nke abụọ. “Ọ fọrọ nke nta ka o yie iduziri Ndịàmà abụọ e mere baptism ọmụmụ ihe,” ka Serafín na-echeta. Ná nleta nke atọ, ebe o yiri ka ha maara ihe dị n’ime ya nke ọma, Serafín tụrụ aro nnọkọ ajụjụ na azịza iji mata nnọọ ókè ha ghọtaruru n’ezie. Ọ chọpụtara na Francisco na Fausta amụwo akwụkwọ ahụ nile n’onwe ha!
Olee otú ihe ọmụma ha nwetara ọhụrụ si metụta ha? N’ikwekọ n’ihe ha mụtaworo, ha akwụsịworị ịga nzukọ ndị mgbaasị ma dọbiekwa nkekọ ha na Chọọchị Katọlik. Ọzọkwa, Francisco akwụsịwo ise siga, ha adịghịkwa eri anụ a na-ebepụghị ọbara nke ọma. Ebe ọ bụ na ihe àmà na-egosi na ha etinyewo ihe nile ha mụtaworo n’ọrụ, a gbara ha ume ịmalite isoro ndị ọzọ kerịta ihe ọmụma ha. Ha malitere ozugbo ime nkwusa nye ndị agbata obi ha. Nanị n’ime ọnwa atọ, ha ruru eru maka baptism. Francisco bụ ugbu a ohu na-eje ozi, n’ihi ezi ihe ilereanya ha na ịnụ ọkụ n’obi ha n’ime nkwusa, atọ n’ime ụmụ ha ndị nwanyị bụ Ndịàmà ugbu a, ụmụ ha ndị ikom abụọ na-aga nzukọ, ndị ikwu ha isii ọzọ na-amụkwa ihe.
Ntakịrị oge mgbe e mesịrị ya baptism, Francisco zutere Pablo, ezi onye Katọlik bụ́ onye jere ozi dị ka onye nlekọta ihe nsọ na chọọchị ya. Pablo na-ekwubu okwuchukwu mgbe ọ bụla onye ụkọchukwu na-anọghị ya. Ọ bụrụ na onye òtù chọọchị dara ọrịa, ọ na-eje eleta ya; ọ bụrụ na mmadụ abịaghị chọọchị, Pablo ga-akpọtụrụ ya iji nye agbamume; ọ bụrụkwa na mmadụ anwụọ, ọ na-eme ihe ọ pụrụ ime iji gụgụọ ezinụlọ ya. N’ụzọ kwere nghọta, ndị parish ahụ nile hụrụ Pablo n’anya nke ukwuu.
Ebe ọ bụ na Pablo nwere nkwanye ùgwù dị ukwuu maka Bible, ọ nakweere ka Francisco mụọrọ ya ihe ozugbo. Ngwa ngwa Pablo hụrụ otú ozi Bible si bụrụ ihe ezi uche dị na ya, mgbe e nwesịkwara ọmụmụ ihe ole na ole, o kpebiri iji ụfọdụ akụkụ akwụkwọ nsọ ọ mụtaworo mee ihe n’otu n’ime “nleta ọzụzụ atụrụ” o mere na nke onye òtù chọọchị na-arịa ọrịa. Mkpirikpi oge mgbe nke ahụ gasịrị, n’otu n’ime okwuchukwu Sunday ya, Pablo kọwara mkpa nke iji aha Chineke, bụ́ Jehova, na-eme ihe, na ihe mere anyị na-ekwesịghị iji jiri ihe oyiyi eme ihe.
Ka ọ naara eziokwu ahụ ozugbo, ọ tụrụ anya na ndị chọọchị ya ndị ọzọ ga-azaghachi n’otu ụzọ ahụ. Ma mgbe o kwusịrị okwuchukwu atọ ma ọ bụ anọ ndị dabeere na Bible, Pablo chọpụtara na obi adịghị ndị ahụ mma n’ihe ọmụma ọ na-enye. Ya mere o kpebiri ịhapụ chọọchị ahụ ma na-esonyere Ndịàmà Jehova mgbe nile. N’ọnwa ole na ole, o ruru eru maka baptism, ọ bụkwa ugbu a onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma ahụ. Ọ bụ ezie na o nweghị ike ime nkwusa oge nile, ugbu a ọ na-eduzi ọmụmụ Bible iri.
Ịkwalite Uto Site n’Izukọ Ọnụ
Ndịàmà nọ n’Equatorial Guinea na-eji iwu Bible bụ́ ịghara ịhapụ izukọ ọnụ akpọrọ ihe. (Ndị Hibru 10:25) Kemgbe 1994 mgbe e nyeghachiri ọrụ ahụ nnabata nke ọchịchị site n’aka ndị gọọmenti, ọ dịworị ụmụnna ọkụ n’obi inweta Ụlọ Nzukọ Alaeze kwesịrị ekwesị. N’ezie, ihe ka n’ọtụtụ n’ọgbakọ nile arụwo ụlọ nzukọ nke onwe ha ma ọ bụ ha na-eme otú ahụ.
Na Mongomo, ebe ọnụ ọgụgụ ndị na-abịa nzukọ Sunday na-arịkarị elu gaa n’ihe dị ka okpukpu abụọ na ọkara nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa Alaeze, ọgbakọ ahụ anọwo na-arụsi ọrụ ike iji wuo ebe nzukọ buru ibu. Okpukpe ndị ọzọ dị na Mongomo na-azụkarị ndị ọrụ iji wuo chọọchị ha, ya mere ihe omume nke Ndịàmà ógbè ahụ abụghị nke a na-ahụtaghị. Otu ụbọchị pastọ nke Iglesia Nueva Apostólica (Chọọchị Ọhụrụ nke Ndị Ozi) gafetere ebe ahụ ịjụ otu n’ime ndị okenye ahụ ego ole ọ na-akwụ ndị ọrụ a na-arụsi ọrụ ike. Pastọ ahụ kwuru na ọ bụ ezie na ya ewewo ụfọdụ ndị na-edo blọkụ bụ́ ndị òtù nke chọọchị ya n’ọrụ, ọrụ ahụ na-arị ka ejula. Ọ chọrọ ịmata ma ọ pụrụ ịzụ ndị ọrụ na-ewu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Mgbe a gwara ya na Ndịàmà ahụ nile na-arụ ọrụ n’efu, o ji ijuanya pụọ.
Ịga nzukọ pụrụ ịchọ àjà dị ukwuu maka ndị bi n’ebe dị anya site n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Juan, otu nwa okorobịa e mere baptism na 1994, chere ọnọdụ a ihu. Ọ nụrụ banyere eziokwu ahụ na Gabon, bụ́ ebe ọ mụrụ akụkụ mbụ nke akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi. Mgbe ahụ ọ lọghachiri Equatorial Guinea, n’obodo nta a mụrụ ya ihe dị ka kilomita 100 site Mongomo. Nke a wetaara ya ihe ịma aka ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe ya. Ma ọ daghị mbà. Kwa ọnwa, o ji ịnyịnya ígwè mee njem na-ewe hour asatọ gaa Mongomo, bụ́ ebe Santiago, otu n’ime ndị okenye ógbè ahụ, duziiri ya ọmụmụ ihe. Ọ nọrọ na Mongomo ruo ụbọchị ole na ole ma mụọ ihe ugboro atọ ma ọ bụ anọ n’oge ọ nọ ebe ahụ. N’ụzọ dị otú a o nwere ike ịmụcha ihe ya ma ruo eru maka baptism.
Olee otú Juan si nọgide na-adị ike n’ụzọ ime mmụọ n’agbanyeghị mmekọrịta dị oké nta nke ya na ndị Kraịst ndị ọzọ? Nke kasị, site n’ịbụ onye nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi. O kwusaworo mmadụ nile nọ n’obodo nta ya ozi ọma, ka ọ na-erulekwa mgbe e mere ya baptism, ọ nọ na-eduzi ọmụmụ Bible 13. Isii n’ime ndị ọ na-amụrụ ihe so ya gaa ụbọchị mgbakọ pụrụ iche na Mongomo iji kirie baptism ya. Ugbu a ọ na-eduziri ndị nwere mmasị n’ógbè ya Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche mgbe nile, dịkwa ka ọ na-adịkarị ihe dị ka 20 na-abịa.
Iji Ndidi Na-akwọsa Mkpụrụ ahụ Mmiri
Ọ bụghị uto ime mmụọ nile na-adị ngwa. Mgbe ụfọdụ ọ na-achọ ndidi dị ukwuu iji hụ ka mkpụrụ ahụ na-emesịa mịa mkpụrụ. Nke a bụ eziokwu n’ọnọdụ Paca, bụ́ onye nụrụ ozi ọma ahụ na nke mbụ ya laa azụ na 1984 mgbe Edita, nwanna nwanyị na-asụ ụzọ, gbaara ya àmà n’ahịa. Mgbe Edita jere leta Paca n’ebe obibi ya n’izu na-esonụ, Paca kwere inwe ọmụmụ Bible. Ọ bụ ezie na ọ naghị enwe ọganihu dị ukwuu, Edita nọgidesiri ike n’ihi na ọ chọpụtara àgwà ọma ndị Paca nwere. “O yiri ka ọ bụ onye yiri atụrụ,” ka Edita na-akọwa, “ekpegakwaara m Jehova ekpere ka o meghee obi ya.”
Paca gara n’ihu n’ọmụmụ ihe ya na-eme ya mụtụ ya akwụsị ruo afọ anọ na ọkara ma ka na-enwe ọganihu dị oké nta. Ya mere mgbe ha mụchara akwụkwọ Ịdị Ndụ Ebighị Ebi, Edita sooro Paca kwurịta ihe dị ya n’obi banyere ịdị mkpa nke iji eziokwu ahụ akpọrọ ihe. Ná mgbalị ya irute n’obi Paca, ọbụna Edita bere ákwá.
“Ndụmọdụ ahụ sitere n’obi metụrụ m n’ahụ n’ezie,” ka Paca na-echeta. “Site na mgbe ahụ amalitere m ime mgbanwe ná ndụ m. Edebara m aha n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, n’otu afọ ahụkwa aghọrọ m onye nkwusa a na-emebeghị baptism. Ụbọchị e mesịrị mee m baptism bụ ụbọchị m nwere obi ụtọ ná ndụ m karịsịa!” Ịnụ ọkụ n’obi nke Paca ugbu a dị iche n’enweghị mmasị ya mbụ. Ugbu a ọ na-eduzi ọmụmụ Bible 13, n’eziekwa ọ na-enwe ndidi n’ahụ ndị na-adịghị enwe ọganihu dị ngwa.
Inyere Ndị Mmadụ Aka Imeziwanye Ndụ Ha
Site n’ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible, Ndịàmà Jehova nọ n’Equatorial Guinea emeworo onwe ha aha ọma n’ịkwụwa aka ọtọ na ịkpa àgwà ọma. Otu nwoke, bụ́ onye o doro anya na àgwà ha masịrị ya, bịakwutere otu onye okenye nke Ọgbakọ Bata ma jụọ, sị: “Ì nwere akwụkwọ Reasoning?b Ike agwụla m ịbụ onye ụwa. M ga-enwe mmasị ịghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova!”
Antonio, ohu na-eje ozi n’Ọgbakọ Malabo, bụ nnọọ ihe atụ nke onye ụwa ghọrọ Onyeàmà. Tupu ya amụọ Bible, o biri ndụ na-enweghị nchịkwa. O mefuru ihe ka ukwuu n’ego ọ kpatara site n’ịrụzi elekere ná mmanya, o bikwara ndụ omume rụrụ arụ. Gịnị nyeere ya aka ịgbanwe ụzọ ndụ ya? Ihe e kwuru n’ụzọ siri ike ná 1 Ndị Kọrint 6:9, 10 masịrị ya nke ukwuu: “Unu ekwela ka e duhie unu: ndị na-akwa iko, . . . ma ọ bụ ndị na-aṅụbiga mmanya ókè, . . . ha agaghị eketa alaeze Chineke.” Ọ ghọtara na iji nweta ihu ọma Chineke, ọ ghaghị ịgbanwe ụzọ ndụ ya. Iji mezuo nke ahụ ọ malitere iche mkpakọrịta ya nche. (Ilu 13:20) Mgbe ndị bụbu enyi ya kpọtụụrụ ya ịkpọ ya òkù ka ha gaa ṅụọ mmanya, ọ jụrụ ọkpụkpọ òkù ha ma kama nke ahụ gbaara ha àmà. N’oge na-adịghị anya ha kwụsịrị inye ya nsogbu.
Ò kwesịrị mgbalị ahụ nile? “Enwere m nnọọ obi ụtọ ịgbanwe ụzọ ndụ m,” ka Antonio na-akọwa. “Ahụ ike m ka nnọọ mma ọ bụ ezie na m nọ ugbu a n’afọ ndụ ndị 60 m, ebe ndị bụbu ndị enyi m nwụworo ma ọ bụ na-enwe ahụ esighị ike. Ugbu a enwere m ezi ndị enyi kama inwe ndị na-achọ nanị onye ibe dị njikere ịkwụ ụgwọ mmanya ọzọ ha ga-aṅụ. Nke kasị mkpa, m sooro Chineke na-enwe ezi mmekọrịta. M na-eje ozi ugbu a dị ka ọsụ ụzọ oge nile, m na-eduzikwara otu nwoke nwekwara nsogbu ịṅụ mmanya ọmụmụ Bible, ya mere apụrụ m iji ahụmahụ m nyere ya aka.”
Ịghọ Ndị Ohu Chineke
Ihe dị ka afọ 200 gara aga, e jidere ndị sitere n’ụsọ oké osimiri nke Equatorial Guinea ma jiri ụgbọ mmiri buga ha na kọntinent ndị dị n’America dị ka ndị ohu. Taa, ọtụtụ ji obi ha na-aghọ ndị ohu—ndị ohu Chineke. Ụdị ịbụ ohu a ewetaworo ha ezi nnwere onwe, na-atọhapụ ha site n’ozizi Babilọn na omume mgbaasị. Ọ kụziwokwara ha otú e si ebi ndụ na-eju afọ ma na-arụpụta ihe. Ha abịawo hụ ihe Jisọs kwere ná nkwa: “Unu ga-amarakwa eziokwu, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu pụọ n’ohu.”—Jọn 8:32.
N’inwe 1,937 ndị bịara Ememe Ncheta nke 1995—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpu isii nke ọnụ ọgụgụ ndị nkwusa nọ ná mba ahụ—e nwere atụmanya magburu onwe ya maka uto ime mmụọ. Ka Ndịàmà nọ n’Equatorial Guinea ji ịnụ ọkụ n’obi nọgide na-akụ ma na-akwọsa mkpụrụ nke eziokwu ahụ mmiri, ha ji n’aka na ‘Chineke ga-anọgide na-eme ka ọ na-aba ụba.’ (1 Ndị Kọrint 3:6) N’ụzọ ihe ịrụ ụka na-adịghị ya, e nwere ọnọdụ dị mma maka uto ime mmụọ n’Equatorial Guinea!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.