À Na-adị Ndụ Mgbe A Nwụsịrị?
AJỤJỤ abụọ agbawo ihe a kpọrọ mmadụ gharịị ruo ọtụtụ narị afọ iri: Gịnị mere anyị na-aghaghị iji na-aka nká ma mesịa nwụọ? È nwere ụdị ọ bụla nke ndụ ịma ihe mgbe a nwụsịrị?
Nke mbụ agbagwojuwo ọtụtụ ndị anya n’ihi na ọbụna nkà mmụta sayensị ọgwụ nke oge a, ya na oké nchọpụta ya nile, enwebeghị ike inye azịza doro anya ma ọ bụ nke na-eju afọ.
Ajụjụ nke abụọ enwewo ọtụtụ azịza dịgasị iche iche. Otú ọ dị, n’ozuzu ya, azịza banyere ma e nwere ndụ ịma ihe mgbe a nwụsịrị agbaala ụzọ abụọ n’etiti ndị kwere na ndụ nke a abụghị nanị ndụ dịnụ na ndị gbara isi akwara n’otu aka ahụ na ndụ ịma ihe na-ejedebe n’ọnwụ. Ihe ka ukwuu ná ndị so n’ìgwè ikpeazụ a na-agwa anyị na ha enweghị obi abụọ ọ bụla na mkpirikpi ndụ mmadụ agwụla ihe ọ pụrụ ịtụ anya ya. Ọtụtụ mgbe, ịrụ ụka ọ bụla e welitere imegide ya na-enweta nzaghachi nke onye onwe ya juru afọ, “Ọ dịtụbeghị onye lọtara gwa anyị, ka ọ̀ dị?”
Dị ka ọ dị banyere ịrụ ụka ndị ọzọ, e nwere ọtụtụ ndị na-ekpebibeghị—na-ekwusi ike na ha dị njikere ikwenyere akụkụ a ma ọ bụ nke ọzọ. Ma ndị ọzọ ga-aza, ikekwe n’ụzọ dị mfe, sị, “Anyị ga-echerenụ hụ ya mgbe oge ruru!”
Ajụjụ Nọteworo Aka
Onye Ọwụwa Anyanwụ Ụwa ahụ a maara nke ọma bụ́ Job, onye a ma ama maka ndidi ya n’ihu ahụhụ, welitere ajụjụ oge gboo banyere ndụ mgbe a nwụsịrị n’ihe dị ka afọ 3,500 gara aga. Otú a ka Job si jụọ ajụjụ ya: “Mmadụ na-anwụ, e wedakwa ya n’ala; ọ na-eku ume ikpeazụ ya ma ghara ịdịkwa. Dị ka mmiri na-esi atakọ n’osimiri ma ọ bụ dị ka okpo mmiri si atasị ma kpọọ nkụ, otú a ka mmadụ na-edinara ma ghara ibili . . . Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ̀ ga-adị ndụ ọzọ?”—Job 14:10-14, New International Version.
Ma ọ bụghị nanị Job na-ajụ ajụjụ ahụ banyere ndụ mgbe a nwụsịrị. Akwụkwọ bụ́ Encyclopædia of Religion and Ethics na-enye ihe ọmụma a na-enye nghọta n’okpuru isiokwu bụ́ “Ọnọdụ Ndị Nwụrụ Anwụ”: “Ọ dịghị isiokwu e jikọtara ya na ndụ mmụọ ya nke riworo uche mmadụ ka nke ọnọdụ ya mgbe a nwụsịrị. [Ndị a mụrụ n’ala] n’ógbè nile nke ụwa nwere n’ozuzu ha echiche ndị doro anya banyere ụwa ndị bụ mmụọ—ndụ ya, njimara ya, ọdịdị ala ya—nke a na-atụkwa aro oké ntinye uche n’isiokwu ahụ. Egwu gbasara ebe nile banyere ndị nwụrụ anwụ na-ezo aka n’echiche oge ochie na ọnọdụ ha abụghị nke ebe ndụ na-adịkwaghị. Ọnwụ egbubiwo ume; nke ahụ doro nnọọ anya; ma ọ̀ bụ na e nweghị ume ndị ọzọ na-arụ ọrụ, ka ọ̀ bụ na ume ndị ahụ enweghị ike ịpụta ìhè n’ụzọ ndị zoro ezo, dị omimi? Ma ndị mmadụ ha kwetara na mbụ ná mmụọ, mkpụrụ obi, ma ọ bụ ndị mmụọ, nke dị iche n’ahụ, ma ọ bụ na ha ekwetaghị, o yiri ka e nwere ihe nile mere a ga-eji kwere na ha weere ndị nwụrụ anwụ dị ka ndị ka dị adị n’ụzọ ụfọdụ.”
Ị pụrụ ịdaba n’otu n’ime nkebi atọ ahụ e hotara n’elu: ejighị n’aka ihe na-eme mgbe a nwụsịrị; kweta na e nwere ka e si adịtụ ndụ mgbe a nwụsịrị; ma ọ bụ kweta na ndụ nke a agwụla ndụ dịnụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, anyị na-akpọ gị òkù iji nlezianya tụlee isiokwu na-esonụ. Lee ma ị ga-achọta n’ime ya ihe àmà Bible na-eju afọ na e nwere olileanya dị ebube nke ndụ obi ụtọ mgbe a nwụsịrị, otú ọ ga-esi mee, ebe, na mgbe.