Ihe Mere Okpukpe Ụwa Ga-eji Abịa ná Njedebe
“Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile.”—MKPUGHE 18:4.
1. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Babilọn Ukwu ahụ daworo? (b) Olee otú ihe omume a siworo metụta Ndịàmà Jehova?
“ỌDAWO, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ!” Ee, n’otú Jehova si ele ihe anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha adawo. Nke a abụwo eziokwu eri 1919, mgbe ihe fọdụrụ n’ụmụnna Kraịst pụtara ná mmetụta Krisendọm, akụkụ bụ isi nke Babilọn na-eme ihe omimi. N’ihi ya, ha enwerewo onwe ha ịkatọ okpukpe ụgha na ikwupụta ọchịchị ezi omume nke Chineke site n’Alaeze Mesaịa ahụ. N’ime narị afọ a nile Ndịàmà Jehova na-eguzosi ike n’ihe ekpughewo ìgwè okpukpe nọ n’okpuru Setan, bụ́ ndị o jiworo mee ihe iji duhie “ụwa nile mmadụ bi.”—Mkpughe 12:9; 14:8; 18:2.
N’ụzọ Dị Aṅaa Ka Babilọn Ukwu ahụ Daworo?
2. Gịnị bụ ọnọdụ okpukpe nile nke ụwa nọ na ya ugbu a?
2 Otú ọ dị, mmadụ pụrụ ịjụ, sị, ‘Olee otú ị pụrụ isi kwuo na Babilọn adawo, mgbe okpukpe yiri ihe na-aba ụba n’ọtụtụ ala?’ Okpukpe Katọlik na Alakụba na-azọrọ inwe ihe karịrị otu ijeri ndị na-ekpe ha n’otu n’otu. Okpukpe Protestant ka na-eme nke ọma na kọntinent ndị dị n’America, bụ́ ebe a nọgideworo na-arụ chọọchị na ụlọ ụka ndị ọhụrụ. Ọtụtụ narị nde na-agbaso ememe okpukpe nile nke okpukpe Buddha na okpukpe Hindu. Ma, ruo n’ókè ha aṅaa ka okpukpe a nile na-enwe mmetụta ziri ezi n’àgwà ọtụtụ ijeri ndị a? Ò gbochiwo ndị Katọlik na ndị Protestant igburịta onwe ha na Northern Ireland? Ò wetawo ezi udo nye ndị Juu na ndị Alakụba n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa? Ò dujewo n’ịdị n’otu n’etiti ndị Hindu na ndị Alakụba n’India? Ná nso nso a kwa, ò gbochiwo ndị Orthodox Serbia, ndị Katọlik Croatia, na ndị Alakụba Bosnia ịchụso “nhichapụ agbụrụ,” ịkwakọrọ ihe, ndina n’ike, na igburịta ibe ha? Mgbe mgbe okpukpe na-abụ nanị aha, mkpokoro àkwá nke na-etiwa ma ntakịrị ihe ọ bụla dakwasị ya.—Ndị Galetia 5:19-21; tụlee Jemes 2:10, 11.
3. N’ihi gịnị ka okpukpe ji nọrọ n’ikpe n’ihu Chineke?
3 Site n’otú Chineke si ele ihe anya, nkwado nke ọha mmadụ na-enye okpukpe adịghị agbanwe otu eziokwu a na-apụghị ịgbanarị—okpukpe nile nọ n’ikpe n’ihu Chineke. Babilọn Ukwu ahụ, dị ka akụkọ ihe mere eme ya na-enye ihe àmà ya, kwesịrị ka a maa ya ikpe n’ihi na “mmehie ya nile rapakọọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.” (Mkpughe 18:5) N’okwu amụma, Hosea dere, sị: “N’ihi na ifufe ka ha na-agha dị ka mkpụrụ ọghịgha, ọ bụkwa oké ifufe ka ha ga-ewe dị ka ihe ubi.” A ga-ebibi okpukpe ụgha nile nke Setan gburugburu ụwa n’ihi ọjụjụ ha jụrụ Chineke, ịhụnanya ya, aha ya, na Ọkpara ya.—Hosea 8:7; Ndị Galetia 6:7; 1 Jọn 2:22, 23.
Ị Ghaghị Ime Nhọrọ
4, 5. (a) N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka anyị na-ebi na ha taa? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịza?
4 Anyị na-ebi n’akụkụ ikpeazụ nke “mgbe ikpeazụ,” dịkwa ka ezi ndị Kraịst anyị na-agbasi mgba ike ịlanarị ‘oge ndị a dị oké egwu.’ (2 Timoti 3:1-5) Ezi ndị Kraịst na-ebi nwa mgbe nta n’ụwa Setan, bụ́ nke na-egosipụta n’ezie ọdịdị ya rụrụ arụ dị ka onye ogbu mmadụ, onye ụgha, na onye nkwutọ. (Jọn 8:44; 1 Pita 2:11, 12; Mkpughe 12:10) Ime ihe ike, aghụghọ, igwu wayo, ịkpa àgwà na-ezighị ezi, na omume rụrụ arụ dị oké njọ gbara anyị gburugburu. E legharawo ụkpụrụ dị iche iche anya. Ibi ndụ ihe ụtọ na omume mere otú ọ masịrị gị bụ ihe a na-ahụ kwa ụbọchị. N’ọtụtụ ọnọdụ kwa ndị ụkọchukwu na-anabata omume rụrụ arụ site n’ịgwagbu nkatọ doro anya nke Bible katọrọ ndina ụdị onwe, na ịkwa iko dị iche iche. N’ihi ya ajụjụ bụ, Ị̀ na-akwado ma na-anabata ofufe ụgha, ka ị̀ na-ekeresi òkè ike n’ezi ofufe?—Levitikọs 18:22; 20:13; Ndị Rom 1:26, 27; 1 Ndị Kọrint 6:9-11.
5 Ugbu a bụ oge nke myọcha. Ya mere, e nwere ihe ka ukwuu mere a ga-eji mara ọdịiche dị n’etiti ofufe ụgha na nke bụ eziokwu. Gịnị ọzọ ka okpukpe nile nke Krisendọm meworo nke na-eme ha ndị a ga-ata ụta otú a?—Malakaị 3:18; Jọn 4:23, 24.
A Katọọ Okpukpe Ụgha
6. Olee otú Krisendọm siworo jụ Alaeze Chineke?
6 Ọ bụ ezie na ọtụtụ nde ndị nọ na Krisendọm na-eji Ekpere Onyenwe Anyị eme ihe mgbe nile, bụ́ ebe ha na-ekpe ekpere ka Alaeze Chineke bịa, ha ejiriwo ịdị uchu kwadoo ụdị ọ bụla nke ngosipụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na-agụpụ ọchịchị Chineke ahụ. Ọtụtụ narị afọ gara aga “ndị isi” nke Chọọchị Katọlik, dị ka Kadinal Richelieu, Mazarin, na Wolsey, rụkwara ọrụ dị ka ndị ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị, ndị minista nke gọọmenti.
7. Olee otú Ndịàmà Jehova si kpughee ndị ụkọchukwu nke Krisendọm ihe karịrị 50 afọ gara aga?
7 Ihe karịrị 50 afọ gara aga, n’akwụkwọ nta isiokwu ya bụ́ Religion Reaps the Whirlwind, Ndịàmà Jehova kpughere ntinye aka nke Krisendọm tinyere na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.a Ihe e kwuru mgbe ahụ bụkwa eziokwu taa: “Nnyocha eziokwu e nyochara omume nke ndị ụkọchukwu okpukpe nke òtù okpukpe nile ga-ekpughe na ndị ndú okpukpe nke ‘Krisendọm’ nile ji ezi mmasị na-ekere òkè na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ‘ajọ ụwa dị ugbu a,’ na-etinyekwa aka n’ihe omume ya nile nke ụwa.” Laa azụ n’oge ahụ Ndịàmà katọrọ Popu Pius nke Iri na Abụọ n’ụzọ siri ike maka nkwekọrịta nile nke ya na Hitler nke Nazi (1933) na Franco nke ọchịchị aka ike Fascist (1941), nakwa maka mgbanwerịta nke popu ahụ sooro mba ahụ na-ebu agha bụ́ Japan gbanwerịta ndị nnọchiteanya na March 1942, nanị ọnwa ole na ole e mesịrị mwakpo ahụ a ma ama nke Pearl Harbor. Popu ahụ aṅaghị ntị n’ịdọ aka ná ntị Jemes: “Unu ndị na-akwa iko, ùnu amataghị na ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke? Ya mere onye ọ bụla nke zubere ịbụ enyi nke ụwa na-edo onwe ya onye iro nke Chineke.”—Jemes 4:4.
8. Olee otú Chọọchị Roman Katọlik si tinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị taa?
8 Gịnị bụ ọnọdụ dị taa? Usoro ndị popu ka na-etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ma site ná ndị ụkọchukwu ya ma site ná ndị aghasa na-anọchite anya ya. Popu ndị e nwere na nso nso a egosiwo na ha kwadoro òtù Mba Ndị Dị n’Otu site n’ịgwa òtù adịgboroja ahụ mmadụ mere maka udo ụwa okwu. Mbipụta na-adịbeghị anya nke L’Osservatore Romano, bụ́ akwụkwọ akụkọ nke Vatican ji eme ihe, mara ọkwa na ndị nnọchianya asaa ọhụrụ, bụ́ “ndị nnọchianya Ọkwá Popu,” nyere ‘Nna ahụ Dị Nsọ’ akwụkwọ ndị gosiri na ha ruru eru. Ànyị pụrụ icheli n’echiche Jisọs na Pita itinye aka ná mgbanwerịta ndị nnọchianya dị otú ahụ? Jisọs jụrụ ịbụ onye ndị Juu mere eze ma kwuo na Alaeze ya esiteghị n’ụwa a.—Jọn 6:15; 18:36.
9. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na okpukpe nile nke Protestant akaghị ndị Katọlik ibe ha mma?
9 Ndị ndú Protestant hà ka ndị Katọlik ibe ha mma? Na United States, ọtụtụ okpukpe Protestant na-achọghị mgbanwe, nakwa ndị Mormon, sonyeere otu òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Òtù Njikọ Ndị Kraịst na-etinyemi aka ya na ndọrọ ndọrọ ọchịchị United States. Ndị ụkọchukwu Protestant ndị ọzọ n’ụzọ pụtara ìhè na-esonyere akụkụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche. Mgbe ụfọdụ a na-echezọ na na United States, ọnụ na-ekwuru ndị ọzọ n’ihe banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị dị ka Pat Robertson na Jesse Jackson bụkwa ma ọ bụ bụbu “ndị Reverend,” dịkwa ka otu onye so ná Ndị Ome Iwu nke Britain bụ́ Ian Paisley nke Northern Ireland bụ. Olee otú ha pụrụ nnọọ isi gosi ikwesị ekwesị nke nguzo ha?—Ọrụ 10:34, 35; Ndị Galetia 2:6.
10. Okwu doro anya dị aṅaa ka e kwuru na 1944?
10 Dị ka akwụkwọ nta bụ́ Religion Reaps the Whirlwind jụrụ na 1944, otú ahụ ka anyị na-ajụ ugbu a: “Òtù ọ bụla nke na-eso ndị ọchịchị ụwa eme nkwekọrịta ma na-etinyesi onwe ya ike n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa nke a, na-achọ uru na nchebe nke ụwa a . . . ọ̀ pụrụ ịbụ chọọchị Chineke ma ọ bụ na-anọchite anya Kraịst Jisọs n’elu ala? . . . N’ụzọ pụtara ìhè, ndị okpukpe nile nwere otu ụdị ihe mgbaru ọsọ ahụ ha na alaeze nile nke ụwa a apụghị ịnọchi anya alaeze Chineke site na Kraịst Jisọs.”
Mmụọ Ken nke Okpukpe Ụgha Nwere
11. Olee otú okpukpe ụgha siri gbasoo ihe nlereanya Ken?
11 N’ime akụkọ ihe mere eme nile, okpukpe ụgha egosiwo mmụọ Ken nke igbu nwanne ya, bụ́ onye gburu nwanne ya nwoke bụ́ Ebel. “N’ime nke a ka ụmụ Chineke bụ ndị e meworo ka ha pụta ìhè, ha na ụmụ ekwensu: onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esighị na Chineke pụta, onye nke na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya esighịkwa na Ya pụta. N’ihi na nke a bụ ozi ahụ unu nụrụ site na mbụ, ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: ọ bụghị dị ka Ken si bụrụ onye si n’ajọ onye ahụ pụta, wee gbuo nwanne ya. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka o gburu ya? N’ihi na ọrụ ya jọrọ njọ, ma ọrụ nke nwanne ya ziri ezi.” Nnabata ọ na-anabataghị ofufe dị ọcha nke Chineke na-anakwere, bụ́ nke nwanne ya nwoke na-efe, Ken họọrọ ime ihe ike—bụ́ nhọrọ ikpeazụ nke ndị na-enweghị ike ịkọwa omume ha n’ụzọ ezi izu dị na ya.—1 Jọn 3:10-12.
12. Ihe àmà dị aṅaa na-egosi òkè okpukpe keere n’agha na ọgụ dị iche iche?
12 Ihe ndị mere eme ọ̀ na-akwado nkatọ a a katọrọ okpukpe ụgha? N’akwụkwọ bụ́ Preachers Present Arms, onye dere ya kwuru, sị: “N’akụkọ ihe mere eme nke mmepeanya, . . . e jikọwo ike abụọ ọnụ n’otu njikọ nwere akụkụ abụọ. Ha bụ agha na okpukpe. N’ime okpukpe ukwu nile nke ụwa kwa, . . . ọ dịghị nke rarawooro onwe ya nye [agha] karịa [Krisendọm].” Afọ ole na ole gara aga, akwụkwọ akụkọ bụ́ The Sun nke Vancouver, Canada, kwuru, sị: “Ọ bụ adịghị ike nke ma eleghị anya okpukpe nile a ma ama na chọọchị na-esochi ọkọlọtọ n’azụ . . . Olee agha ọ bụla a lụtụworo nke a na-ekwughi na Chineke nọ n’akụkụ nke ọ bụla?” Ọ pụrụ ịbụ na ị hụwo ihe àmà nke a n’ụfọdụ chọọchị dị n’ógbè unu. Ọtụtụ mgbe, ọkọlọtọ mba na-achọ elu ọlta mma. N’akụkụ ọkọlọtọ nke ole ndị ka i chere na Jisọs ga-azọ ije? Ruo ọtụtụ narị afọ okwu ya adaghachiwo ụda: “Alaeze m esiteghị n’ụwa nke a”!—Jọn 18:36.
13. (a) Olee otú okpukpe ụgha siworo daa n’Africa? (b) Ihe àmà dị aṅaa e ji amata Iso Ụzọ Kraịst ka Jisọs nyere?
13 Okpukpe nile nke Krisendọm akụzibeghịrị atụrụ ha eziokwu nke ezi ịhụnanya ụmụnna. Kama nke ahụ, e kwewo ka ndịrịta iche nke mba, ebo, na agbụrụ kewaa ndị òtù ha. Ihe ndekọ dị iche iche na-egosi na ndị ụkọchukwu Katọlik na Anglịkan keere òkè ná nkewa kpatara mgbukpọ agbụrụ na Rwanda. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ, sị: “Mgbuchapụ ndị mmadụ nke weere ọnọdụ na Rwanda emewo ka ọtụtụ ndị Roman Katọlik nwee mmetụta nke ịbụ ndị ndị isi chọọchị ahụ mechuworo ihu. Ọtụtụ mgbe e kewawo chọọchị ahụ n’ihi agbụrụ, n’etiti Hutu na Tutsi.” Otu akwụkwọ akụkọ ahụ hotara otu onye okwuchukwu Maryknoll dị ka onye na-asị: “Chọọchị dawasịrị nnọọ afọ na Rwanda na 1994. Ọtụtụ ndị Rwanda n’otu echiche ewezụgawo chọọchị ahụ n’ụsọ. A pụghịkwa ikwere na ya.” Lee ka o si dị iche n’okwu Jisọs: “Mmadụ nile ga-eji nke a mara na unu bụ ndị na-eso ụzọ m, ọ bụrụ na unu enwerịta ịhụnanya n’ebe ibe unu nọ.”—Jọn 13:35.
14. Ihe ndekọ dị aṅaa nke omume ka okpukpe ndị bụ isi na-abụghị nke ndị Kraịst na-enye?
14 Okpukpe ndị ọzọ bụ isi nke Babilọn Ukwu ahụ esetịpụbeghị ihe nlereanya ka mma. Mgbuchapụ dị oké njọ nke 1947, mgbe e kewara India, na-egosi na okpukpe ndị bụ isi n’ebe ahụ emepụtabeghị ikwe ibe nọrọ. Ime ihe ike obodo nke a nọgideworo na-enwe n’India na-egosi na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ mmadụ agbanwebeghị. Ka a sịkwa ihe mere magazin bụ́ India Today ji kwubie, sị: “E mewo mpụ ndị kasị njọ n’aha okpukpe. . . . Ọ na-awụpụta ime ihe ike dị egwu, ọ bụkwa nnọọ ikike na-ebibi ihe.”
“Eziokwu Yiri Nnọọ Ụgha”
15. Gịnị bụ ọnọdụ okpukpe n’ebe ọdịda anyanwụ ụwa?
15 Ọbụna ndị ụwa na-akọwa ihe na-eme eme arịbawo ama ọdịda okpukpe ụgha dara ime ka e kweta, ịkụnye ezi ụkpụrụ, na iguzogide mgbebata nke ịgbakụta okpukpe azụ. N’akwụkwọ ya bụ́ Out of Control, onye bụbu onye ndụmọdụ maka nchebe mba United States bụ́ Zbigniew Brzezinski dere, sị: “Ọ bụ eziokwu yiri nnọọ ụgha na mmeri kasịnụ maka echiche bụ́ na ‘Chineke anwụọla’ ewerewo ọnọdụ ọ bụghị na mba ndị nwere echiche nke Marx . . . kama n’ọha mmadụ nke onye kwuo uche ya nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, bụ́ nke zụliteworo enweghị mmasị n’ụkpụrụ omume ọma n’ụzọ ọdịbendị. N’ọha mmadụ nke Ebe Ọdịda Anyanwụ, eziokwu dị na ya bụ na okpukpe akwụsịwo ịbụ ikike bụ́ isi nke na-achị ọha mmadụ.” Ọ gara n’ihu, sị: “Ikike okpukpe nwere n’ọdịbendị Europe adalatawo n’ụzọ dị ukwuu, taa kwa Europe—ọbụna karịa America—bụ n’ụzọ bụ isi ọha mmadụ na-agbakụta okpukpe azụ.”
16, 17. (a) Ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs nyere banyere ndị ndú okpukpe nke oge ya? (b) Ụkpụrụ ọma dị aṅaa ka Jisọs kwupụtara banyere mkpụrụ?
16 Gịnị ka Jisọs kwuru banyere ndị ndú okpukpe ndị Juu nke oge ya? “N’oche Mosis [iji kụzie Torah, Iwu ahụ] ka ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọdụrụ: ya mere, ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke ha ga-asị unu mee, meenụ ihe ndị a, debekwa ha: ma unu emela dị ka ọrụ nile ha si dị; n’ihi na ha na-ekwu, ma ha adịghị eme.” Ee, ihu abụọ nke okpukpe abụghị ihe ọhụrụ.—Matiu 23:2, 3.
17 Mkpụrụ nke okpukpe ụgha na-ama ya ikpe. Ụkpụrụ nduzi nke Jisọs nyere dị nnọọ irè: “Ezi osisi ọ bụla na-amị mkpụrụ ọma; ma osisi na-abaghị n’ihe na-amị ajọ mkpụrụ. Ezi osisi apụghị ịmị ajọ mkpụrụ, osisi na-abaghị n’ihe apụghịkwa ịmị mkpụrụ ọma. A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-amịghị mkpụrụ ọma, tụbakwa ya n’ime ọkụ. Ya mere unu ga-esite ná mkpụrụ ha mazuo ha.”—Matiu 7:17-20.
18. Olee otú Krisendọm kwesịrị isiworị debe ndị òtù ha nile ọcha?
18 Ọ bụrụ na okpukpe nile nke Krisendọm ga-eji ezi akọ na uche tinye ịdọ aka ná ntị ndị Kraịst nke nchụpụ, ma ọ bụ mwepụ, maka ajọ omume nile nke ndị na-asị na ha bụ ndị òtù ya mere, gịnị ga-eme? Gịnị ga-eme ndị ụgha nile, ndị na-akwa iko, ndị di na nwunye na-akwa iko, ndị na-edina ụdị onwe ha, ndị wayo, ndị na-eme mpụ, ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na ndị o riworo ahụ, na ndị òtù nke mpụ a haziri ahazi? N’ụzọ ajụjụ na-adịghị ya, mkpụrụ rere ure nke Krisendọm na-eme ya ka o kwesị ekwesị nanị maka mbibi Chineke ga-ebibi ya.—1 Ndị Kọrint 5:9-13; 2 Jọn 10, 11.
19. Nkweta ndị dị aṅaa ka e kwupụtaworo banyere idu ndú nke okpukpe?
19 Nzukọ ukwu maka Chọọchị Presbyterian na United States kwetara, sị: “Anyị na-eche ọgba aghara dị oké njọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ya nile na ihe ọ pụtara ihu. . . . N’agbata 10 na 23 pasent nke ndị ụkọchukwu ná mba a nile emewo omume ndị na-akpali mmekọahụ ma ọ bụ soro ndị parish, ndị ha na-ejere ozi, ndị ha were n’ọrụ, na ndị ọzọ nwee mmekọahụ.” Otu onye United States na-achụ nta ego chịkọtara isi ihe ahụ n’ụzọ dị nnọọ mma, sị: “Òtù dị iche iche nke okpukpe adawo n’ịkụnye ụkpụrụ omume ọma nke akụkọ ihe mere eme ha, n’ọtụtụ ọnọdụ kwa, ọ ghọwo akụkụ nke nsogbu ahụ.”
20, 21. (a) Olee otú Jisọs na Pọl siri katọọ ihu abụọ? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa ka a na-azabeghị?
20 Nkatọ Jisọs katọrọ ihu abụọ nke okpukpe bụkwa eziokwu taa dị ka ọ bụ n’oge ya: “Ndị ihu abụọ, Aịsaịa buru amụma nke ọma banyere unu, sị, Ndị nke a na-asọpụrụ m n’egbugbere ọnụ ha; ma obi ha dị anya n’ebe M nọ. Ma ha na-ebiri m isiala n’efu, na-ezi ihe mmadụ nyere n’iwu ka ha bụrụ ozizi ha.” (Matiu 15:7-9) Okwu Pọl gwara Taịtọs na-akọwakwa ọnọdụ anyị n’oge a: “Ha na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnarị Ya, ebe ha bụ ihe arụ, ndị na-adịghị ekwenyekwa, bụrụkwa ndị a jụrụ ajụ n’ebe ezi ọrụ nile ọ bụla dị.”—Taịtọs 1:16.
21 Jisọs sịrị na ọ bụrụ na onye ìsì eduo onye ìsì, ha abụọ ga-adaba n’olulu. (Matiu 15:14) Ị̀ chọrọ isoro Babilọn Ukwu ahụ bịa ná njedebe? Ka ị̀ chọrọ iji anya gị mepere nke ọma na-azọ ije n’okporo ụzọ ziri ezi ma nweta ngọzi Jehova? Ajụjụ ndị na-eche anyị ihu ugbu a bụ: Olee okpukpe, ma ọ bụrụ na o nwere nke dịnụ, na-amịpụta mkpụrụ Chineke? Olee otú anyị pụrụ isi mata ezi ofufe ahụ nke Chineke na-anakwere?—Abụ Ọma 119:105.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara na 1944; ugbu a a dịghịkwa ebipụta ya.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị bụ nguzo Babilọn Ukwu ahụ nwere ugbu a n’ihu Chineke?
◻ Ná ndabere dị aṅaa ka a katọrọ okpukpe ụgha?
◻ Olee otú okpukpe ụgha siworo gosipụta mmụọ Ken?
◻ Ụkpụrụ dị aṅaa ka Jisọs kwupụtara maka ikpe okpukpe ọ bụla ikpe?
[Foto dị na peeji nke 13]
N’ime akụkọ ihe mere eme nile ndị ndú okpukpe etinyewo aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Ndị ụkọchukwu a bụkwa ndị dị ike ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị
Kadinal Mazarin
Kadinal Richelieu
Kadinal Wolsey
[Ebe E Si Nweta Foto]
Kadinal Mazarin na Kadinal Richelieu: Site n’akwụkwọ bụ́ Ridpath’s History of the World (Mpịa. nke Isii na Mpịa. nke Ise n’otu n’otu). Kadinal Wolsey: Site n’akwụkwọ bụ́ The History of Protestantism (Mpịa. nke Mbụ).